Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 6/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Anyị Na-ekwupụta Mmehie Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Na-anabata Ịdọ Aka ná Ntị Jehova Mgbe Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ebere Jehova Na-azọpụta Anyị Pụọ N’obi Nkoropụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Mgbe “Obi Tiwara Etiwa, nke Nọ ná Mwute” Na-arịọ Mgbaghara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 6/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’iburu n’uche njikere Jehova dị ịgbaghara mmehie site n’uru nke àjà mgbapụta ahụ, gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị Kraịst na-ekwupụtara ndị okenye ọgbakọ mmehie ha?

Dị ka a pụrụ ịhụ n’ihe banyere Devid na Bat-sheba, Jehova gbaghaara Devid mmehie ya, n’agbanyeghị na ọ dị oké njọ, n’ihi ezi nchegharị Devid nwere. Mgbe Netan onye amụma bịakwutere ya, Devid kwupụtara n’ezoghị ọnụ, sị: “Emehiewo m megide Jehova.”—2 Samuel 12:13.

Otú ọ dị, ọ bụghị nanị na Jehova na-anabata nkwupụta onye mmehie ji ezi obi mee ma gbaghara ya kama ọ na-emekwa ndokwa ịhụnanya iji nyere onye ahụ hiere ụzọ aka inwe ọganihu iji gbakee n’ụzọ ime mmụọ. N’ọnọdụ Devid, enyemaka ahụ si n’aka Netan onye amụma bịa. Taa, n’ọgbakọ ndị Kraịst, e nwere ndị ikom tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ, ma ọ bụ ndị okenye. Jemes onye na-eso ụzọ na-akọwa, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike [n’ụzọ ime mmụọ]? ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị: ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie; ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.”—Jemes 5:14, 15.

Ndị okenye nwere nkà pụrụ ime ihe dị ukwuu iji belata ihe mgbu nke obi nke onye mmehie ahụ kwara ụta na-enwe. Ha na-agbalị iṅomi Jehova n’ụzọ ha si emeso ya ihe. Ha adịghị achọ ịdị aka ike ma ọlị, n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịbụ ihe kwesịrị ekwesị inye ịdọ aka ná ntị siri ike. Kama nke ahụ, ha na-eji ọmịiko atụle ihe dị onye ahụ mkpa mgbe ahụ. Ha na-eji ndidi agbalị iji Okwu Chineke mee ka echiche onye ahụ hiere ụzọ guzozie. (Ndị Galetia 6:1) Ọ bụrụgodị na mmadụ ejighị aka ya kwupụta mmehie ya, ọ ka pụrụ ịbụ onye a kpaliri ichegharị mgbe ndị okenye bịakwutere ya, dị ka Devid mere mgbe Netan bịakwutere ya. Nkwado ndị okenye si otú a nye na-enyere onye ahụ hiere ụzọ aka izere ihe ize ndụ nke imeghachi mmehie ahụ nakwa ihe ọjọọ ndị na-esi n’ịghọ onye mmehie na-akpọ ekwo nkụ, apụta.—Ndị Hibru 10:26-31.

N’ezie, ọ dịghị mfe mmadụ ikwupụtara ndị ọzọ ihe o mere bụ́ nke na-eme ya ihere na ịchọ mgbaghara. Ọ na-achọ mmadụ inwe ikike nke uche. Otú ọ dị, tụgharịa uche nke nta ná nhọrọ ọzọ dịnụ. Otu nwoke nke na-ekpugheghịrị ndị okenye ọgbakọ mmehie dị oké njọ o mere kwuru, sị: “Enwere m ihe mgbu n’obi m bụ́ nke na-ekweghị akwụsị akwụsị. Etinyekwuru m mgbalị n’ọrụ nkwusa, ma mmetụta ịkwa ụta ahụ akwụsịghị.” O chere na ikwupụtara Chineke mmehie ya n’ekpere ezuwo, ma n’ụzọ doro anya o zughị, n’ihi na o nwere mmetụta yiri nke Eze Devid. (Abụ Ọma 51:8, 11) Lee ka o si dị mma karị ịnakwere enyemaka ịhụnanya Jehova na-enye site n’aka ndị okenye!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya