Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 7/15 p. 28
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nọrọ Na Nche Megide Ikpere Arụsị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nọrọ Na Nche Megide Ụdị Ikpere Arụsị Ọ Bụla
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Okwukwe Ha Lanarịrị Ule Siri Ike
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Jiri Adịm ná Mma Gị na Jehova Kpọrọ Ihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 7/15 p. 28

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Na 1 Pita 4:3 (NW), anyị na-agụ na ụfọdụ ndị Kraịst etinyebuwo aka ‘n’ikpere arụsị mmebi iwu.’ Ọ̀ bụ na ikpere arụsị nile abụghị mmebi iwu, ihe Chineke katọrọ ma machibido iwu?

Ee, n’echiche Chineke, ikpere arụsị nile bụ mmebi iwu. Ndị na-achọ ihu ọma ya agaghị ekpere arụsị.—1 Ndị Kọrint 5:11; Mkpughe 21:8.

Otú ọ dị, o yiri ka Pita onyeozi ọ̀ na-ezo aka n’ikpere arụsị n’ụzọ ọzọ. Nke mbụ, a bịa n’ọtụtụ mba oge ochie, ikpere arụsị bụ ihe zuru ebe nile na ihe ọchịchị na-amachibidoghị iwu. Ya bụ na iwu obodo emegideghị ikpere arụsị ndị dị otú ahụ. Ikpere arụsị ụfọdụ so ọbụna n’ụkpụrụ ime ihe nke mba ma ọ bụ nke gọọmenti. N’echiche dị otú ahụ, ụfọdụ ekerewo òkè ‘n’ikpere arụsị ndị iwu na-emegịdeghị’ tupu ha aghọọ ndị Kraịst. (New World Translation, mbipụta nke 1950) Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịrịba ama na Eze Nebukadneza nke Babilọn guzobere ihe oyiyi arụsị ọlaedo, ma ndị ohu Jehova bụ́ Shedrak, Mishak, na Abed-nego jụrụ ife ya ofufe.—Daniel 3:1-12.

N’echiche ọzọ, ọtụtụ ememe ikpere arụsị a na-eme na-agụnye omume ndị megidere nnọọ iwu ebumpụta ụwa ma ọ bụ echiche omume ọma ọ bụla nke dabeere n’akọ na uche e ketara eketa. (Ndị Rom 2:14, 15) Pọl onyeozi dere banyere omume jọgburu onwe ha bụ́ ndị “na-emegide ka e si mụọ [mmadụ]” na ndị “na-adịghị mma n’anya,” a na-emekwa ihe ndị a n’ememe dị iche iche nke okpukpe. (Ndị Rom 1:26, 27) Ndị ikom na ndị inyom bụ́ ndị na-ekere òkè n’ikpere arụsị mmebi iwu adịghị edebe iwu ndị kwekọrọ ka e si mụọ ha. N’ezie, o kwesịrị ekwesị ka ndị na-aghọ ndị Kraịst hapụ omume ndị ahụ na-emerụ emerụ.

Tụkwasị n’ihe ndị a e kwuworo, Jehova Chineke katọrọ ikpere arụsị ndị dị otú ahụ bụ́ ndị a na-ahụ ebe nile n’etiti ndị na-abụghị ndị Juu. N’ihi ya, iwu megidere ha.a—Ndị Kọlọsi 3:5-7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ihe odide Grik e ji mee ihe na 1 Pita 4:3 pụtara n’ụzọ nkịtị “ikpere arụsị iwu megidere.” E jiriwo okwu ndị dị ka “ikpere arụsị jọgburu onwe ha” na “ikpere arụsị a machibiworo iwu,” sụgharịa nkebi ahịrịokwu ahụ na Bible dị iche iche.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya