OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jiri Adịm ná Mma Gị na Jehova Kpọrọ Ihe
Jehova meere anyị, bụ́ Ndịàmà ya, ezigbo ihe ọma. Ebe anyị bụ Ndị Kraịst nyefere Jehova onwe anyị, e meekwa anyị baptizim, anyị na-eme ka anyị na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-adị n’ezigbo mma. O si n’aka Ọkpara ya dọta anyị n’ebe ọ nọ. (Jọn 6:44) Ọ na-azakwa ekpere anyị.—Ọma 34:15.
Olee ihe anyị nwere ike ime ka ihe ọ bụla ghara ime adịm ná mma anyị na Chineke? Anyị ekwesịghị ime ihe ọjọọ ahụ ndị Izrel mere. Obere oge ha na Chineke gbachara ndụ, ha kpụrụ nwa ehi ọlaedo ma fewe arụsị. (Ọpụ. 32:7, 8; 1 Kọr. 10:7, 11, 14) Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka m na-eme ma ọnwụnwa bịara m? Ihe ndị m na-eme ọ̀ na-egosi na m ji adịm ná mma mụ na Jehova kpọrọ ihe?’ Otú anyị si hụ Nna anyị nke eluigwe n’anya ga-eme ka anyị gbaara ihe ọ bụla ọ kpọrọ asị ọsọ.—Ọma 97:10.
LEENỤ VIDIO BỤ́ EKWELA KA IHE Ọ BỤLA KPAA ADỊM NÁ MMA GỊ NA JEHOVA AKA (KỌL 3:5), ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị bụ anyaukwu?
Gịnị mere anyị ji kwesị izere anyaukwu na ikpere arụsị?
Olee ihe jikọrọ ịkwa iko na ikpere arụsị?
Gịnị mere ndị nwere ọrụ n’ọgbakọ karịchaa ji kwesị ịna-egboro nwunye ha mkpa ha?