Kụziere Ndị Ọzọ Ịhụ Jehova n’Anya
1. Olee ihe na-adọta ụfọdụ ndị n’ebe Jehova nọ?
1 Ì chetara mgbe mbụ ị nụrụ banyere Jehova? Olee ihe mere ka i nwee mmasị n’ebe ọ nọ? Ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu ga-agwa gị na ihe dọtara ha nso n’ebe Onye Okike anyị nọ bụ mgbe ha nụrụ banyere àgwà ọma ya ndị na-enweghị atụ, karịsịa ọmịiko na ịhụnanya ya.—1 Jọn 4:8.
2, 3. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịhụkwu Jehova n’anya?
2 “Onye A Bụ Chineke Anyị”: Akwụkwọ Bible Na-akụzi mere ka anyị ghọta otú Jehova hụruru anyị n’anya na mkpa ọ dị ka anyị na ya nwee ezi mmekọrịta. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ a kụziere ndị ọzọ ịhụkwu Chineke n’anya? Mgbe anyị na-agafe n’isiokwu ọhụrụ, anyị nwere ike ịjụ ajụjụ ndị ga-eme ka onye anyị na-amụrụ ihe chee echiche, dị ka: “Olee ihe eziokwu a na-egosi banyere Jehova?” ma ọ bụ “Olee otú ihe a anyị na-amụ si egosi na Jehova bụ Nna kasị mma mmadụ ga-achọ inwe?” Isi otú a akụziri onye ị na-amụrụ ihe ihe nwere ike ime ka o mee Jehova enyi ya ná ndụ ya niile.
3 Mgbe ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ghọtara na ọ bụ ezigbo ihe ùgwù ịmụ banyere onye naanị ya bụ ezi Chineke na naanị Chineke dị ndụ, ha ga-ekwu ihe yiri ihe Aịzaya kwuru, nke bụ́, “onye a bụ Chineke anyị.” (Aịza. 25:9) Mgbe anyị na-akọwa Okwu Chineke, ọ dị mkpa ka anyị mee ka ọ pụta ìhè otú mmezu Jehova ga-emezu nzube ya site n’ọchịchị ya dị n’aka Kraịst Jizọs ga-esi wetara ụmụ mmadụ ngọzi.—Aịza. 9:6, 7.
4, 5. Olee otú mmadụ nwere ike isi gosipụta na ọ hụrụ Jehova n’anya?
4 Otú Mmadụ Ga-esi Gosi na Ọ Hụrụ Jehova n’Anya: Anyị maara na mmadụ iji obi ya, mkpụrụ obi ya, na uche ya dum hụ Jehova n’anya abụghị naanị onye ahụ inwe ezi mmasị n’ebe Chineke nọ. Anyị aghaghị ịnabata echiche ya ma na-eme uche ya ná ndụ anyị. (Ọma 97:10) Anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya site n’irube isi n’iwu ya niile na ịnọgide na-enwe “àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke,” ọbụna mgbe ihe na-esiri anyị ike na mgbe a na-emegide anyị.—2 Pita 3:11; 2 Jọn 6.
5 Chineke na-enwe obi ụtọ mgbe anyị na-eme uche ya n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. (Ọma 40:8) Onye ahụ a na-amụrụ Baịbụl aghaghị ịghọta na iwu niile Chineke nyere bụ maka ọdịmma ebighị ebi nke ndị ohu Ya. (Diut. 10:12, 13) Mmadụ na-egosi na o ji nnọọ ọrụ ndị dị ebube Jehova rụrụ kpọrọ nnọọ ihe site n’ịgbaso nduzi Ya ná ndụ ya. Nyere onye ahụ ị na-amụrụ ihe aka ịghọta na ije ije n’ụzọ ezi omume Jehova ga-eme ka mmadụ zere ọtụtụ nsogbu.
6. Olee ngọzi ndị mmadụ nwere ike inweta n’ihi ịhụ Jehova n’anya?
6 Ngọzi Maka Ndị Hụrụ Chineke n’Anya: Jehova ji nnọọ ndị dị umeala n’obi hụrụ ya anya kpọrọ ihe, ọ na-ekpughekwara ha “ihe ndị miri emi nke Chineke.” (1 Kọr. 2:9, 10) Ọ bụrụ na anyị enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịghọta nzube Jehova otú ahụ, ha ga-aghọta ọdịnihu nke ọma ma nwee olileanya e ji n’aka. (Jere. 29:11) Ndị hụrụ Jehova n’anya na-enweta ebere ya pụrụ iche. (Ọpụ. 20:6) Ha na-eji olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi ha nwere akpọrọ ihe n’ihi oké ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ha nọ.—Jọn 3:16.
7. Olee otú i si ele ịkụziri ndị ọzọ ịhụ Jehova n’anya anya?
7 Ka anyị na-amatakwu Nna anyị nke eluigwe, otú ahụ ka anyị ga na-enwekwu ihe anyị ga na-agwa ndị ọzọ banyere ya. (Mat. 13:52) Ọ bụ nnọọ ihe ùgwù na-enweghị atụ ịkụziri ndị ọzọ, karịsịa ụmụ anyị, ịhụ Jehova n’anya! (Diut. 6:5-7) Ka ọṅụ jupụta anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl obi ka anyị na-ahụ ‘ịdị mma dị ukwuu nke Jehova.’—Ọma 145:7.