Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 7/1 p. 31
  • Mgbakọ Mba Nile na 2003

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbakọ Mba Nile na 2003
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndịàmà Jehova Ga-enwe Mgbakọ Mba Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jehova Na-akpọkọta Ndị Ya, Bụ́ Ndị Obi Dị Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Mgbakọ Ukwu Ndị Anyị Na-enwe Kwa Afọ Bụ Ohere Ọma Iji Gosi Ịhụnanya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • “Asụsụ Kewara Anyị Ma Ịhụnanya Jikọtara Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 7/1 p. 31

Mgbakọ Mba Nile na 2003

NA Saturday, October 6, 2001, e nwere nzukọ kwa afọ nke ndị so na Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na Jersey City, New Jersey, U.S.A. Mgbe e nwesịrị nzukọ ahụ, ha na ndị ọbịa bịaranụ gere ntị n’usoro ihe omume pụrụ iche. N’echi ya, ná nzukọ ntụkwasị ndị e mere n’obodo anọ ndị dị na Canada na United States, ndị so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova mara ọkwa na-esonụ mgbe ha kwusịrị okwu mmechi:

“Ka anyị na-elepụ anya n’ihu, ọ dị nnọọ oké mkpa ka ndị Chineke nile ghara ịhapụ nzukọ nke onwe ha. Pọl onyeozi gbara ume ka a na-eme nke a karị, tinyere ịgbarịta ibe anyị ume, ka anyị na-ahụ oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova ka ọ na-eru nso. (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ikwekọ n’iwu a dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-atụ anya inwe mgbakọ distrikti n’akụkụ nile nke ụwa n’afọ ọzọ [2002]. E mesịa, n’afọ 2003, ọ bụrụ uche Jehova, ọ pụrụ ikwe omume inwe mgbakọ mba nile ndị pụrụ iche n’akụkụ ụfọdụ nke ụwa. Ugbu a bụ oge ịmụrụ anya ma na-eche nche, na-aghọta otú ihe si na-eme n’ụwa.”

N’agbanyeghị ọnọdụ a na-ejighị aka na ahụ́ erughị ala a nọgidere na-enwe ka usoro ihe dị ugbu a na-eru ọgwụgwụ ya, ọrụ nke ndị Chineke aghaghị ịdị na-aga n’ihu. A ghaghị ịkpọsara mba, agbụrụ, asụsụ, na ndị nile ozi ọma nke Alaeze ahụ, gụnyere ozi ịdọ aka ná ntị nke Bible, na-agwa ha ka ha ‘tụọ Chineke egwu, nyekwa ya otuto, n’ihi na oge awa nke ikpe ya na-eru nnọọ nso.’ (Mkpughe 14:6, 7) N’ihi ya, dị ka uche na ezi ọchịchọ nke Nna anyị nke eluigwe si dị, a na-eme atụmatụ inwe mgbakọ mba nile n’ebe dịgasị iche iche nke ụwa n’afọ 2003.

Iji malite, a na-emetụgodị ndokwa inwe mgbakọ ndị dị otú ahụ n’obodo ukwu ole na ole n’Ebe Ugwu America, nwa oge ka e mesịkwara, a ga-enwe ha na Europe. Mgbe oge gatụrụ na 2003, a ga-eme ndokwa ka ìgwè dị iche iche nke ndị nnọchianya gaa n’obodo ukwu ole na ole dị n’Eshia; ka ọ na-erukwa ná ngwụsị afọ ahụ, ìgwè ndị ọzọ ga-aga Africa, Ebe Ndịda America, na n’ógbè Pacific. A ga-achọ ka alaka ụlọ ọrụ ụfọdụ ziga ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị nnọchianya n’ebe ụfọdụ a ga-enwe mgbakọ, n’ihi ya, ọ gaghị ekwe omume ịkpọ mmadụ nile òkù ịbịa. Otú o sina dị, ọ ga-abụ ihe na-agba ume inwe ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị nnọchianya bụ́ ndị ga-anọchite anya mba dị iche iche n’ebe nke ọ bụla.

N’oge na-adịghị anya, ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ga-amalite inweta ihe ọmụma banyere mgbakọ ndị a. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba ndị nnọchianya a ga-akpọ bụ́ ndị ga-enwe ike ịga, ga-enye ihe ọmụma banyere kpọmkwem ụbọchị na obodo ndị ha ga-aga. N’ihi ya, a na-achọ ka ị ghara ide akwụkwọ ma ọ bụ jụọ ase banyere nke a ugbu a.

Ndị e mesịrị họrọ ịbụ ndị nnọchianya ga-abụ nanị Ndịàmà raara onwe ha nye e mere baptizim bụ́ ndị ga-abụ ezi ihe nlereanya ma gosipụta ịhụnanya ụmụnna n’ebe ụmụnna ndị nọ n’obodo ahụ ha ga-aga nọ. N’aka nke ahụ, ndị obodo ndị ahụ ga-enwe ohere ndị dị mma iji ịhụnanya nabata ndị ọbịa ahụ ma lee ha ọbịa nke ọma. (Ndị Hibru 13:1, 2) Nke a ga-eme ka ha ‘gbarịta ibe ha ume.’ (Ndị Rom 1:11, 12) Ọzọkwa, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ndị a ga-agwa ka ha ziga ndị nnọchianya n’otu mba ma ọ bụ mba ụfọdụ ga-enye nkọwa zuru ezu banyere ndokwa ndị a.

A ga-eme ndokwa maka mgbakọ distrikti maka afọ 2003 n’ọtụtụ mba dị ka a na-emekarị. Site n’ịgbakọta ọnụ, onye nke ọ bụla ga-enwe ohere ‘ige ntị, ịmụta ihe, na ịbụ onye a gbara ume.’ (Deuterọnọmi 31:12, NW; 1 Ndị Kọrint 14:31) Nke a ga-enye ndị Chineke nile ohere ‘idetụ ire hụ na Jehova dị mma.’ (Abụ Ọma 34:8) Ndị ozi ala ọzọ ga-anọ ná mgbakọ mba nile ọ bụla a ga-enwe, nakwa n’ọtụtụ mgbakọ distrikti, ụfọdụ n’ime ha ga-emekwa ihe omume.

N’afọ a, anyị ga-enwe Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi,” bụ́ nke ga-akpali anyị ịgbakwu àmà. Ọzọkwa, anyị ga na-atụsikwu anya ike maka ihe Jehova na-akwadebere anyị n’afọ na-abịanụ. Nke a ga-enyere anyị aka ‘ịnọrọ na nche, ịmụrụ anya, na igosipụta na anyị dị njikere’ n’ihi oge ndị a pụrụ iche ma dị oké mkpa.—Matiu 24:42-44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya