OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mgbakọ Ukwu Ndị Anyị Na-enwe Kwa Afọ Bụ Ohere Ọma Iji Gosi Ịhụnanya
Gịnị mere mgbakọ ukwu ndị anyị na-enwe kwa afọ ji atọgbu anyị atọgbu? Mgbakọ ndị a na-eme ka anyị nwee ohere iso ọtụtụ narị ụmụnna anyị ma ọ bụdị ọtụtụ puku ụmụnna anyị fekọọ Jehova ọnụ otú ahụ ụmụ Izrel mere n’oge ochie. Anyị na-eriju nri si n’Okwu Chineke afọ. Oge anyị na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị ji anọrị na-atọkwa anyị ụtọ. Ihe ndị a na-eme ka ọ na-agụ anyị agụụ ịgazucha abalị atọ nke mgbakọ ndị ahụ.
Anyị gaa mgbakọ ndị a, anyị ekwesịghị ịna-eche naanị banyere uru ndị anyị ga-erite, kama, anyị kwesịkwara ịna-eche banyere otú anyị ga-esi gosi ndị ọzọ ịhụnanya. (Gal. 6:10; Hib. 10:24, 25) Anyị jide ụzọ aka ka ụmụnna anyị gafere ma ọ bụkwanụ chekwaa naanị oche ndị nke anyị chọrọ, ọ ga-egosi na anyị na-eche gbasara ndị ọzọ. (Fil. 2:3, 4) Oge mgbakọ na-abụ oge dị mma iji meta ndị enyi ọhụrụ. Tupu ihe omume amalite, n’oge nri ehihie, nakwa mgbe a gbasara, anyị nwere ike ịgbalị matakwuo ụmụnna ndị anyị na-amabughị. (2 Kọr. 6:13) Anyị na ndị anyị metara enyi ná mgbakọ ndị a nwere ike ịbụ enyi ruo ebighị ebi. Nke kachanụ bụ na ọ bụrụ na ndị mmadụ achọpụta otú anyị si hụ ibe anyị n’anya n’eziokwu, ha nwere ike ịbịa soro anyị fewe Jehova.—Jọn 13:35.
LEENỤ VIDIO BỤ́ MGBAKỌ MBA NIILE “ỊHỤNANYA ADỊGHỊ ADA ADA,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú ụmụnna anyị si gosi ụmụnna ndị si esi bịa mgbakọ mba niile nke afọ 2019 na ha hụrụ ha n’anya?
Gịnị mere ịdị n’otu ndị Jehova na ịhụnanya ha nwere ji pụọ iche?
Olee ụzọ dị iche iche ndị so n’Òtù Na-achị Isi kwuru na anyị nwere ike isi gosi ịhụnanya?
Olee otú ị ga-esi soro gosi ụmụnna gị na ị hụrụ ha n’anya ná mgbakọ?
Olee otú ịhụnanya si mee ka ụmụnna anyị dị n’otu na Jamanị, nakwa na Saụt Koria?
Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?