Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w02 12/1 p. 8
  • Na Tebụl Onyeisi Ụgbọ Mmiri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na Tebụl Onyeisi Ụgbọ Mmiri
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Ndị Ezi Omume Niile Hà Ga-aga Eluigwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Olee Table nke I Na-eri Nri na Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ònye Malitere Àmà Jehova?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Alaeze Chineke Amalitela Ịchị n’Eluigwe
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
w02 12/1 p. 8

Na Tebụl Onyeisi Ụgbọ Mmiri

NDỊ nwere omume enyi, nri dị ụtọ, na mkparịta ụka na-enye obi ụtọ na-eme ka nri a na-eri na tebụl onyeisi ụgbọ mmiri nke dị n’ime ụgbọ mmiri bụrụ ihe na-enye obi ụtọ. Ma mkparịta ụka e nwere na tebụl nri nke Kaptịn Robert G. Smith, nke ụlọ ọrụ White Star Line, mere ka a mata banyere otu ihe oriri ime mmụọ.—Aịsaịa 25:6.

Na 1894, mgbe ọ dị afọ 24, Robert ghọrọ onyeisi nke ụgbọ mmiri bụ́ Kinclune of Dundee iji mee njem mbụ ya gazuo ụwa nile. Mgbe e mesịrị, ọ ghọrọ onyeisi nke ụgbọ mmiri nke ụlọ ọrụ White Star, ndị dị ka Cedric, Cevic, na Runic.a Ka Robert ji otu n’ime ụgbọ mmiri ndị a na-agafe Atlantic, ka o si New York na-aga Liverpool, England, o lere Charles Taze Russell ọbịa na tebụl nri ya dị ka onyeisi ụgbọ mmiri. Mkparịta ụka Russell na Robert nwere kpaliri mmasị ya n’ozi Bible, ijikwa nwee ike ịmụtakwu ihe, o ji obi ụtọ nara Russell akwụkwọ ndị bụ́ Studies in the Scriptures.

Russell nọgidere na-edegara ya akwụkwọ ozi, n’ihi ya kwa, mmasị Robert nwere n’ozi Bible mụbara. Robert kọọrọ nwunye ya ihe ọmụma o nwetara ọhụrụ. Ọ dịghị anya ha abụọ aghọọ Ndị Mmụta Bible na-amụchi ihe anya, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova mgbe ahụ. Robert mesịrị nwee ihe ùgwù nke ikwu okwu ndị dabeere na Bible. Dị ka ihe atụ, na Brisbane, Australia, o kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Balm nke Gilied” ma gosi otú Okwu Chineke si nwee ozi nke bụ́ “ihe ngwọta nke nsogbu nile nke ụwa.” Mgbe ha laghachiri n’England, nwunye ya na ụmụ ya ndị na-eto eto nyere aka n’igosi “Photo-Drama of Creation,” na-akpọ okwu Russell nke dị na rekọd ka ihe nkiri ahụ na-aga n’ihu.

Robert nyefere ụmụ ya ihe nketa nke eziokwu Alaeze ahụ ọ nataworo. Taa, ka ọgbọ ise gasịrị, mmadụ 18 sitere n’ezinụlọ ahụ so nnọọ ndị ọzọ na-ekerịta ozi ọma ahụ, na-enwe ekele maka nri ahụ e riri na tebụl onyeisi ụgbọ mmiri.

Site n’akwụkwọ ha na ọrụ ịkụzi Bible ha, Ndịàmà Jehova na-enyere ndị mmadụ aka n’ụwa nile ịmụta ozi Bible ahụ masịrị Kaptịn Smith. Gị onwe gị pụkwara ịchọpụta nri ahụ na-adọrọ nnọọ mmasị nke e riri na tebụl onyeisi ụgbọ mmiri.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Kaptịn E. J. Smith (ha abụghị ndị ikwu) bụ onyeisi nke ụgbọ mmiri ya na ya yiri, bụ́ Titanic, na njem mbụ o mere nke kpatara ọdachi.

[Foto dị na peeji nke 8]

Robert G. Smith

[Foto dị na peeji nke 8]

Charles T. Russell

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya