Na-ele Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ya
NA NEW YORK, U.S.A., September 14, 2002, bụ ụbọchị okpomọkụ anwụ chasiri ike. N’ụbọchị ahụ, ìgwè mmadụ dị 6,521 bụ́ ndị si mba dị iche iche zukọtara n’Ebe Agụmakwụkwọ nke Patterson nakwa n’ihe owuwu abụọ ndị ọzọ nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ. Ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara ịhụrụ ngụsị akwụkwọ nke klas nke 113 nke Watchtower Bible School of Gilead. Ụmụ akwụkwọ ahụ si n’ala 14 bịa, ha ejiwokwa ọnwa ise gara aga kwadebe maka ije ozi ala ọzọ n’ala 19 e kenyere ha ọrụ.
Carey Barber, bụ́ onye nọ n’afọ nke 98 ya, onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, bụ onyeisi oche nke ihe omume ahụ. Ọ kpọtụrụ uche n’ihe nketa Ụlọ Akwụkwọ Gilead nke fọrọ nke nta ka ọ dịruo afọ 60, bụ́ nke kwadebeworo ọtụtụ puku mmadụ ịga jee ozi n’ala ọzọ. Nwanna Barber kwuru, sị: “Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ikwu na ọzụzụ e nyekwuru ha arụpụtawo ihe ndị dị ukwuu. N’ụzọ nkịtị, ọtụtụ narị puku ndị dị nwayọọ n’obi n’ụwa nile ararawo ndụ ha nye Jehova ma na-efe ya ezi ofufe, na-ejekwara ya ozi dị nsọ, n’ihi aka ndị ozi ala ọzọ a zụrụ azụ nyewooro ha.”
Tupu ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ahụ agaa Gilead, ha gosipụtara mmasị ha nwere n’ịmụbawanye ozi ha. Otu di na nwunye ejiriwo ihe karịrị otu afọ mụọ asụsụ Mandarin ná mgbalị iji nwee ike ikwusara otu agbụrụ buru ibu si China bụ́ ndị bi n’ógbè ha bi na ya na Canada ozi ọma. Di na nwunye ọzọ malitere ịmụ asụsụ Albanian n’onwe ha ma mesịa kwaga Albania iji nyere ọtụtụ ndị nwere mmasị na Bible n’ebe ahụ aka. Ndị ọzọ so na klas ahụ si Hungary, Guatemala, na Dominican Republic bịa Gilead, bụ́ ala ndị ha kwagara iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị na-ezi Okwu Chineke.
Ugbu a, tupu ha agawa ebe ndị e kenyere ha ọrụ n’Africa, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, Ebe Etiti na Ebe Ndịda America, na n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, a gbara ndị nile ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ịdị na-eburu Chineke n’uche n’ihe ọ bụla ha na-eme.
Na-ele Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ya
Mgbe Nwanna Barber kwusịrị okwu mmeghe ya, ọ kpọpụtara Maxwell Lloyd, onye so na Kọmitii Alaka nke United States. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Na-ele Ihe Nile Anya Otú Chineke Si Ele Ya.” Nwanna Lloyd kpọtụrụ ihe nlereanya Devid na nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, uche. (1 Samuel 24:6; 26:11; Luk 22:42) Mgbe ọkà okwu ahụ chetasịịrị ụmụ akwụkwọ ahụ na ọmụmụ Bible ha nke were ọnwa ise enyewo ha ọzụzụ n’ile ihe anya otú Chineke si ele ya, ọ jụrụ, sị: “Mgbe unu na-eduziri ndị nọ n’ebe ọhụrụ e kenyere unu ọrụ ọmụmụ Bible, ùnu ga-enyere ha aka ile ihe anya otú Chineke si ele ya?” Banyekwara inye ndị ọzọ ndụmọdụ, ọ dụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ọdụ, sị: “Unu asịla, ‘N’echiche m, echere m . . . ’ Kama nke ahụ, nyerenụ ha aka ịhụ ihe bụ́ echiche Chineke. Ọ bụrụ na unu esi otú a na-eme ya, unu ga-abụ ezi ngọzi nye ndị unu na ha ga na-akpakọrịta n’ebe e kenyere unu ọrụ.”
Onye sochiri n’usoro ihe omume ahụ bụ Gerrit Lösch, onye so n’Òtù Na-achị Isi. N’ikwu okwu n’isiokwu bụ́ “Anọnyeere M Gị,” ọ kpọtụrụ uche n’ọtụtụ oge Jehova gwara ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị, “Anọnyeere m gị.” (Jenesis 26:23, 24, NW; 28:15; Joshua 1:5, NW; Jeremaịa 1:7, 8, NW) N’oge anyị, anyị pụrụ inwe otu ihe mmesi obi ike ahụ n’ebe Jehova nọ ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Nwanna Lösch kwuru, sị: “Ị̀ na-enwe nchegbu ma ị ga-ahụ ndị ị ga-amụrụ Bible? Cheta, Jehova kwuru, sị, ‘Anọnyeere m gị.’ Ị̀ na-enwe nchegbu banyere inwe ihe ga-ezuru gị n’ụzọ anụ ahụ́? Jehova kwuru, sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’” (Ndị Hibru 13:5) Nwanna Lösch mechiri site n’ichetara ụmụ akwụkwọ ahụ na Jizọs kwere nkwa ịnọnyere ụmụazụ ya n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ.—Matiu 28:20.
“Ùnu Ga-enweta Nchebe n’Ọkụ?” bụ isiokwu nke okwu onye nkụzi Gilead bụ́ Lawrence Bowen kwuru. O kwuru na n’ihi ihe iseokwu ndị ahụ e welitere n’Iden, ndị nile chọrọ ife Jehova ofufe a na-ekewaghị ekewa enwetawo ihe isi ike na, mgbe ụfọdụ, ọnwụnwa ndị yiri ọkụ. Ọ gbara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ ume ịgbaso ihe nlereanya Jizọs, bụ́ onye nwetara ezi nchebe site n’ịdabere n’ebe Jehova nọ n’ụzọ zuru ezu na ịnakwere ule ndị yiri ọkụ Jehova kwere ka ha bịara ya iji mee ka nrubeisi nke Ọkpara ya zuo okè. (Ndị Hibru 5:8, 9) A pụrụ iji Jehova tụnyere onye na-anụcha ọlaedo bụ́ onye na-ere ya ọkụ kpọmkwem otú kwesịrị iji wepụ ihe ndị na-adịghị mma na ya. N’ezie, okwukwe nke e ji ọkụ nwalee na-enye nnọọ nchebe karịa ọlaedo a nụchara anụcha. N’ihi gịnị? “Ọ bụ n’ihi na okwukwe a nụchara anụcha pụrụ iguzogide nrụgide ọ bụla,” ka Nwanna Bowen kwuru, “ọ na-akwadebekwa anyị ịtachi obi ruo ‘ọgwụgwụ.’”—Matiu 24:13.
Onye nkụzi ọzọ nke Gilead, bụ́ Mark Noumair, jụrụ, sị: “Ị̀ Ga-abụ Onye E Nwere Mmasị n’Ebe Ọ Nọ?” Isiokwu ya hiwere isi n’okwu ndị dị na 1 Samuel 2:26 (NW), bụ́ nke kọwara Samuel dị ka onye ‘e nwere mmasị n’ebe ọ nọ ma n’anya Jehova ma n’anya ụmụ mmadụ.’ Mgbe ọ tụlesịrị ihe nlereanya Samuel, Nwanna Noumair, bụ́ onye jere ozi ala ọzọ n’Africa ruo ihe karịrị afọ iri, kwuru, sị: “Gị onwe gị pụkwara ịbụ onye Chineke nwere nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ site n’iji iguzosi ike n’ihe na-anọgidesi ike n’ọrụ Chineke nyeworo gị ịrụ. O nyewo gị ọrụ ije ozi ala ọzọ bụ́ nke dị oké ọnụ ahịa.” Nwanna Noumair gbaziri klas ahụ na-agụsi akwụkwọ ume ile ọrụ e kenyere ha anya dị ka ihe dị nsọ Chineke nyefere ha na iji echiche Chineke na-arụ ọrụ e kenyere ha.
N’oge ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụ akwụkwọ, ha nwere ọtụtụ ohere ná ngwụsị izu iso ndị nọ n’ógbè ahụ kerịta “ihe ndị dị ebube nke Chineke” bụ́ ndị dị na Bible. (Ọrụ 2:11) N’ezie, ha kwuru banyere ihe ndị a n’asụsụ iri. Wallace Liverance, onye nkụzi ọzọ nke Gilead, gbara otu ìgwè ụmụ akwụkwọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị kọrọ ahụmahụ ha n’isiokwu bụ́ “‘Ihe Ndị Dị Ebube nke Chineke’ Na-akpali Ndị Mmadụ Ime Ihe.” O kwuru, sị: “Mmụọ nsọ kpaliri ndị nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’ụlọ elu na Pentikọst ikwu banyere ‘ihe ndị dị ebube nke Chineke.’ Otu mmụọ nsọ ahụ na-arụ ọrụ taa n’ahụ́ ndị ohu Chineke nile na-ekwesị ntụkwasị obi.” Ọbụna a kpaliwo ụfọdụ ndị ịmụ asụsụ ọhụrụ, na-eburu n’uche ịgbakwuru ọtụtụ mmadụ àmà.
Ndụmọdụ Dị Irè Banyere Ile Ihe Anya Otú Chineke Si Ele Ya
Mgbe okwu ndị ahụ e kwuru ná mmalite gasịrị, Gary Breaux na William Young, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ United States, gbara ndị so na kọmitii alaka dị iche iche n’ala ebe ndị ozi ala ọzọ na-eje ozi ugbu a, tinyere otu di na nwunye jere ozi ala ọzọ ruo afọ 41, ajụjụ ọnụ. Otu ihe a chọpụtara bụ: “Ndị na-adịghị achọ oké ihe na-anọte aka karị. Ha na-elekwasị anya n’ihe mere ha ji bịa. Ha maara na ha bịara ikwusa ozi ọma ahụ na inyere ndị mmadụ aka ịbịa mara Jehova.”
David Splane, onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, ji okwu isiokwu ya bụ “Unu Anaghị Aga Ebe Dị Anya!” mechie usoro ihe omume ahụ. Gịnị ka o bu n’uche, ebe ọ bụ na a na-agazi iziga mmadụ 46 ahụ gụsịrị akwụkwọ n’ala ndị dị gburugburu ụwa? Ọ kọwara, sị: “Ebe ọ sọkwara unu nọrọnụ n’ụwa, unu ga-anọgide na-anọ n’ụlọ Chineke ma ọ bụrụhaala na unu na-ekwesị ntụkwasị obi.” Ee, Ndị Kraịst nile na-ekwesị ntụkwasị obi, n’agbanyeghị ebe ha pụrụ ịnọ n’ụzọ anụ ahụ́, na-eje ozi n’otu akụkụ nke nnukwu ụlọ nsọ, ma ọ bụ ụlọ ime mmụọ nke Chineke, bụ́ nke e guzobere mgbe e mere Jizọs baptizim na narị afọ mbụ. (Ndị Hibru 9:9) Lee ihe nkasi obi ọ bụụrụ ndị bịaranụ ịmara na Jehova nọ ndị ohu ya nile na-ekwesị ntụkwasị obi n’ụwa nso! Dị nnọọ ka Jehova nwere mmasị n’ebe Jizọs nọ mgbe ọ nọ n’ụwa, n’otu aka ahụ, Ọ na-enwe mmasị n’ebe anyị nile nọ na n’ozi anyị na-ejere Ya, n’agbanyeghị ebe anyị pụrụ ịnọ. Ya mere, a bịa n’ihe ndị metụtara ofufe, ọ dịghị mgbe anyị na-anọ ibe anyị nakwa Jehova na Jizọs n’ebe dị anya.
Mgbe a gụsịrị ozi ekele ndị a natara site na gburugburu ụwa, masịa ọkwa ebe ndị e kenyere ha ọrụ, gụsịakwa akwụkwọ ozi klas ahụ dere iji gosipụta ekele ha nwere maka ọzụzụ ha natara na Gilead, onyeisi oche wetara usoro ihe omume ahụ ná njedebe n’ụzọ gara nke ọma. Ọ gbara ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ume ịnọgidesi ike n’ọrụ ọma ha na ịṅụrị ọṅụ n’ozi Jehova.—Ndị Filipaị 3:1.
[Foto dị na peeji nke 23]
IHE BANYERE KLAS AHỤ
Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 14
Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 19
Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 46
Nkezi afọ ndụ ha: 35.0
Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 17.2
Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 13.7
[Foto dị na peeji nke 24]
Klas nke 113 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead
Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.
(1) Ligthart, M.; Hosoi, S.; Berktold, A.; Liem, C.; Aoki, J. (2) Baglyas, J.; Bouqué, S.; Bossi, A.; Alton, J.; Escobar, I.; Escobar, F. (3) Stoica, A.; Stoica, D.; Freimuth, S.; Karlsson, M.; LeBlanc, R. (4) Bianchi, R.; Bianchi, S.; Kaminski, L.; Joseph, L.; Paris, S.; LeBlanc, L. (5) Paris, M.; Skidmore, B.; Horton, J.; Horton, L.; Skidmore, G. (6) Liem, B.; Alton, G.; Quirici, E.; Langlois, M.; Steininger, S.; Aoki, H. (7) Langlois, J.; Steininger, M.; Bossi, F.; Kaminski, J.; Bouqué, J.; Ligthart, E.; Hosoi, K. (8) Baglyas, J.; Quirici, M.; Karlsson, L.; Freimuth, C.; Berktold, W.; Joseph, R.