Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 4/15 p. 27
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Maara Shefan na Ezinụlọ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Gbalịa Ịdị Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Josaịa Dị Umeala n’Obi Nwere Ihu Ọma Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 4/15 p. 27

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị̀ pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ịmụ banyere ezinụlọ Shefan?

Shefan bụ odeakwụkwọ Eze Josaịa nke Juda. N’ịbụ onye a na-akwanyere ùgwù n’alaeze ahụ, Shefan kwadoro mkpọsa eze ahụ mere banyere iweghachi ezi ofufe. Ụmụ Shefan ndị nwoke abụọ kwadoro Jeremaịa onye amụma. Otu nwa ya nwoke ọzọ nakwa ụmụ ụmụ ya ndị nwoke abụọ jikwa ikike ha mee ihe maka ezi ofufe. N’otu aka ahụ, anyị kwesịrị iji ihe onwunwe na ikike anyị na-akwado ezi ofufe.—12/15, peeji nke 19-22.

• Olee otú Irene Hochstenbach siworo nagide nkwarụ dị oké njọ ma nwee ike ijere Jehova ozi?

Mgbe ọ dị afọ asaa, ọ kwụsịrị ịnụ ihe. N’agbanyeghị na ọ bụ onye ntị chiri, ọ mụtara otú o si eso ndị ọzọ ekwurịta okwu, ọ na-esonyekwara di ya (onye nlekọta na-ejegharị ejegharị) ugbu a ka ọ na-eje eleta ọgbakọ ndị dị na Netherlands.—1/1, peeji nke 23-26.

• Olee akwụkwọ ọhụrụ abụọ e ji amụ ihe bụ́ ndị e wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi”?

Ndị Kraịst gburugburu ụwa ṅụrịrị ọṅụ n’inweta akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, bụ́ nke a kwadebere iji na-amụrụ ndị ọhụrụ ihe mgbe ha mụsịrị akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi; akwụkwọ ọhụrụ nke ọzọ bụ Bịaruo Jehova Nso, bụ́ nke na-elekwasị anya n’àgwà Jehova nakwa n’otú o si mesoo ndị ọzọ ihe. Ọ na-egosikwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya n’igosipụta àgwà ya ndị ahụ.—1/15, peeji nke 23, 24.

• Gịnị ka ihe ahụ e kwuru n’Ilu 12:5 pụtara nke bụ́: “Echiche nile nke ndị ezi omume bụ ezi ikpe”?

Echiche nke ndị bụ́ ezigbo mmadụ na-adị ọcha, ọ bụkwa ihe ndị dị mma ma zie ezie ka ha na-eche maka ha. Ebe ọ bụ na ihe na-akwali ndị ezi omume bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na n’ebe ụmụ mmadụ ibe ha nọ, ebumnobi ha bụ ebumnobi dị mma.—1/15, peeji nke 30.

• Gịnị pụrụ inyere mmadụ aka ịzụlite echiche ziri ezi banyere ọrụ?

Ọ bụ ihe bara uru ịbụ onye a zụlitere site na nwata iji ọrụ kpọrọ ihe. Bible na-agba anyị ume inwe àgwà ọma n’ihe banyere ọrụ, na-ezere ịdị umengwụ. (Ilu 20:4) Ọ na-agbakwa Ndị Kraịst ume ka ha ghara ịbụ ndị na-eji ọrụ ego n’aka mgbe nile. Anyị kwesịrị ịmata na ozi Chineke ruru eru ịbụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. (1 Ndị Kọrint 7:29-31) Ọzọkwa, ezi Ndị Kraịst nwere obi ike na Chineke agaghị ahapụ ha.—2/1, peeji nke 4-6.

• Olee ebe mbụ e kwuru banyere ebe ịchụàjà n’ime Bible?

Ọ bụ na Jenesis 8:20, nke na-ezo aka n’ebe ịchụàjà ahụ Noa wuru mgbe ọ pụtara n’ụgbọ ka Iju Mmiri ahụ gasịrị. Otú ọ dị, o yiri ka Ken na Ebel hà ji ebe ịchụàjà mee ihe mgbe ha na-enye onyinye ịnata ihu ọma ha. (Jenesis 4:3, 4)—2/15, peeji nke 28.

• Olee otú ụfọdụ Ndị Kraịst pụrụ isi jiri ọnọdụ ndị gbanwere agbanwe mee ihe n’ụzọ dị mma?

Ụfọdụ anakwerewo—ma ọ bụ jiri aka ha mee—mgbanwe n’ebe ọrụ ha bụ́ nke nyekwuru ha ohere ije ozi. Ndị ọzọ amụbawo oge na ihe ùgwù ije ozi ha n’ozi Chineke mgbe ibu ọrụ ezinụlọ ha belatara, dị ka mgbe ụmụ ha toro ma lụọ di ma ọ bụ nwunye.—3/1, peeji nke 19-22.

• Olee otú ihe atụ Jona na Pita onyeozi si enyere anyị aka ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha anya?

Ma Jona ma Pita nwere emezighị emezi a maara nke ọma n’echiche ha nakwa n’otú ha si meghachi omume n’ule nke okwukwe na nrubeisi. N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova hụrụ àgwà ọma ndị ha nwere nke ọma ma nọgide jiri ha na-eme ihe n’ozi ya. Mgbe ndị ọzọ kpasuru anyị iwe ma ọ bụ mechuo anyị ihu, anyị pụrụ ilekwasị anya n’àgwà ọma ha ndị ọ pụrụ ịbụwo na ha dọọrọ mmasị anyị n’oge gara aga nakwa n’ezi ihe ndị Chineke na-ahụ n’ime ha.—3/15, peeji nke 16-19.

• N’ihi gịnị ka nsụgharị Bible dị iche iche ji dịgasịa iche n’otú ha si nye akwụkwọ Abụ Ọma nọmba?

Otú e si nye akwụkwọ ahụ nọmba n’asụsụ Hibru mbụ dị iche n’otú e si nye ya nọmba ná nsụgharị Grik ya n’ime Septuagint. Nsụgharị ndị ka ọhụrụ pụrụ ịdịgasị iche, na-adabere ma e si n’ihe odide Hibru ma ọ bụ na nke Septuagint sụgharịta ha.—4/1, peeji nke 31.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya