Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ọ bụrụ na Onye Kraịst na-anụ olu, nke ahụ ọ̀ na-apụtacha na mmụọ ọjọọ ji ya?
Ee e. Ọ bụ ezie na a kọwo na ndị mmụọ ọjọọ na-akpa ike n’ụzọ dị otú ahụ, ọtụtụ ndị bụ́ ndị na-anụ olu ma ọ bụ na-enwe mmetụta ndị ọzọ na-enye nsogbu a na-apụghị ịkọwa isi ha, achọpụtawo mgbe ha mere nnyocha na ha nwere nsogbu ahụ́ ike.
Ọbụna na narị afọ mbụ, a ghọtara nke ọma na mwakpo ndị mmụọ ọjọọ na nsogbu ahụ́ ike na-eyi ibe ha mgbe ụfọdụ. Na Matiu 17:14-18, anyị na-agụ banyere otu nwa okoro nke Jizọs gwọrọ. Ọ bụ ezie na akwụkwụ na-adọsi nwa okoro ahụ ike, n’ezie ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ mere o ji na-ata ahụhụ. Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, mgbe a kpọtaara Jizọs ìgwè ndị na-ata ahụhụ ka ọ gwọọ ha, ụfọdụ n’ime ha bụ “ndị mmụọ ọjọọ ji na ndị akwụkwụ.” (Matiu 4:24) O doro anya na a maara na ụfọdụ ndị akwụkwụ abụghị ndị ndị mmụọ ọjọọ ji. Nsogbu ha bụ nke ahụ́ ike.
A na-akọ na ụfọdụ ndị na-arịa isi mgbaka, bụ́ ọrịa a na-ejikarị ọgwụ agwọ, na-anụ olu ma ọ bụ na-enwe ihe mgbaàmà ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ iyi ka hà si n’aka ndị mmụọ ọjọọ.a Nsogbu ahụ́ ike ndị ọzọ pụkwara ịkpata uche mgbasasị bụ́ nke ụfọdụ ndị pụrụ iche n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ kpatara ya. N’ihi ya, ọ bụ ezie na onye sịrị na ya na-anụ olu ma ọ bụ na-enwe mmetụta ndị na-enye ya nsogbu nwere ike ọ gaghị ekwu na ọ bụghị ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya nsogbu, e kwesịrị ịgba ya ume n’ezie ka ọ gaa chọpụta ma ihe na-eme ya ọ̀ bụ nsogbu ahụ́ ike.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ịkọwa Ihe Omimi Dị n’Ọrịa Uche” nke dị na Teta! (Bekee) nke September 8, 1986, bụ́ magazin a na-ebipụtakọ ya na Ụlọ Nche.