Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 9/1 p. 4-7
  • Uru Dị n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru Dị n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Alụmdi na Nwunye—Mkpa Bụ́ Isi
  • Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-eme Ka Alụmdi na Nwunye Ghara Itisa
  • Nne na Nna na Ụmụ Ndị Na-anọgidesi Ike n’Akụkụ Ibe Ha
  • Ịnọgidesi Ike n’Ihe Dị Mkpa n’Ọbụbụenyi
  • A Pụrụ Ịmụta Ịnọgidesi Ike n’Ihe Amụta
  • Imeri Ihe Ịma Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Lee Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ònye Ka I Kwesịrị Iguzosi Ike n’Ihe Nye?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 9/1 p. 4-7

Uru Dị n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe

NÁ MBA ụfọdụ, ụmụaka na-enwe mmasị ime ibe ha akaje site n’ịtapanye agbịrịgba n’uwe ha. Agbịrịgba ndị ahụ na-atapara n’uwe ahụ, ihe ọ sọkwara nwatakịrị ahụ mee—ma ọ̀ gara ije, ma ọ̀ gbara ọsọ, ma ọ̀ wụliri elu—agbịrịgba ahụ ka ga-ataparasi ike n’uwe ya. Nanị ụzọ ọ pụrụ isi wepụ ha bụ ịtụpụsị ha otu otu. Nye ụmụaka, ọ bụ ihe egwuregwu.

N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile na-achọ ka agbịrịgba tapara ha n’uwe, ma ọ na-eju mmadụ nile anya otú agbịrịgba na-esi ataparasi ike n’ihe. Onye na-anọgidesi ike n’ihe na-eme ihe n’otu ụzọ ahụ. Onye na-anọgidesi ike n’ihe na-anọgidesi ike n’akụkụ mmadụ ruo ogologo oge. Ọ na-anọgide na-eme ihe ndị a chọrọ n’aka onye ya na mmadụ na-enwe mmekọrịta ọbụna mgbe ọnọdụ mere ka o sie ike ime otú ahụ. Ihe na-agbata n’uche ma a nụ okwu ahụ bụ́ “ịnọgidesi ike n’ihe” bụ omume nke ezigbo enyi, mmadụ ịkwụsi ike n’akụkụ onye ọzọ, na mmadụ iji obi ya nile na-eme ihe. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ị pụrụ inwe obi ụtọ ma mmadụ nọgidesie ike n’akụkụ gị, ma gị onwe gị, ị̀ na-anọgidesi ike n’akụkụ ndị ọzọ? Ya bụrụ otú ahụ, ole ndị ka i kwesịrị ịnọgidesi ike n’akụkụ ha?

Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Alụmdi na Nwunye—Mkpa Bụ́ Isi

Alụmdi na nwunye bụ otu ebe ịnọgidesi ike n’ihe dị oké mkpa, ma n’ụzọ dị mwute, ọ na-adịkarị ụkọ. Di na nwunye ndị nọgidere na-emezu nkwa ọlụlụ ha—ya bụ, ndị nọgidere na-ebikọ, onye nke ọ bụla ana-achọ ọdịmma onye nke ọzọ—ewerewo nzọụkwụ dị mkpa n’ịchọta obi ụtọ na ntụkwasị obi. N’ihi gịnị? N’ihi na e kere ụmụ mmadụ inwe mkpa nke ịnọgidesi ike n’akụkụ ndị ọzọ nakwa ịbụ ndị ndị ọzọ nọgidesiri ike n’akụkụ ha. Mgbe e jikọrọ Adam na Iv n’alụmdi na nwunye n’ogige Iden, Chineke kwuru, sị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.” Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ebe onye bụ́ nwunye nọ; ọ ga-arapara n’ahụ́ di ya. A chọrọ ka di na nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe ibe ha nọ, ka ha na-emekọkwa ihe ọnụ.—Jenesis 2:24; Matiu 19:3-9.

N’ezie, ọ bụ ọtụtụ puku afọ gara aga ka e mere ndokwa a. Nke a ọ̀ pụtara na ịnọgidesi ike n’ihe n’alụmdi na nwunye taa bụ ihe mgbe ochie? Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-aza ee e. Ndị na-eme nnyocha na Germany chọpụtara na pasent iri asatọ lere ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye anya dị ka ihe dị oké mkpa. E mere nnyocha nke abụọ iji chọpụta àgwà ndị a na-achọsi ike karịsịa n’ebe ndị ikom na ndị inyom nọ. A gwara otu ìgwè ndị ikom ka ha depụta àgwà ise kasị amasị ha n’ebe ndị inyom nọ, otu ìgwè ndị inyom depụtakwara àgwà ise kasị amasị ha n’ebe ndị ikom nọ. Àgwà kasị amasị ma ndị ikom ma ndị inyom bụ ikwesị ntụkwasị obi.

Ee, ịnọgidesi ike n’ihe so n’isi ihe ndị na-eme ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma. Ma, dị ka anyị hụrụ n’isiokwu bu ụzọ, otú e si eto ịnọgidesi ike n’ihe abụghị otú e si eme ya. Dị ka ihe atụ, ọnụ ọgụgụ dị elu nke ndị na-agba alụkwaghịm n’ọtụtụ ala bụ ihe na-egosi na imerime mmadụ adịghị anọgidesi ike n’ihe. Olee otú di na nwunye pụrụ isi zere omume a ma na-anọgidesi ike n’akụkụ ibe ha?

Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-eme Ka Alụmdi na Nwunye Ghara Itisa

Di na nwunye na-egosipụta àgwà nke ịnọgidesi ike n’ihe mgbe ha na-achọ ohere ndị ha ga-eji gosikwuo na ha hụrụ ibe ha n’anya. Dị ka ihe atụ, kama ịsị “nke m,” ọ na-akakarị mma ịsị “nke anyị”—“ndị enyi anyị,” “ụmụ anyị,” “ebe obibi anyị,” “ahụmahụ anyị,” na ihe ndị ọzọ. Mgbe di na nwunye na-eme atụmatụ na mkpebi—banyere ụlọ, ọrụ, ịzụ nwa, ihe ntụrụndụ, oge ezumike, ma ọ bụ ihe omume okpukpe—ha kwesịrị ichebara mmetụta na aro nke ibe ha echiche.—Ilu 11:14; 15:22.

Mmadụ na-egosi na ya na-anọgidesi ike n’ihe mgbe ọ na-eme ka di ma ọ bụ nwunye ya ghọta na e ji ya kpọrọ ihe. Ahụ́ adịghị eru mmadụ ala ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ya ana-egosi mmasị dị ukwuu n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya nọ. Bible na-adụ ndị ikom ọdụ ịnọgidesi ike n’akụkụ “nwunye [ha] lụrụ n’okorobịa.” Di ekwesịghị ikwe ka agụụ nwanyị ọzọ na-abụghị nwunye ya gụọ ya. N’ezie, o kwesịghị iso nwanyị ọzọ nwee mmekọahụ. Bible na-adụ ọdụ, sị: “Onye na-akwa nwanyị iko, obi amamihe kọrọ ya: Onye na-emebi mkpụrụ obi nke aka ya ka onye na-eme ya bụ.” A na-atụkwa anya ụdị ikwesị ntụkwasị obi ahụ n’aka onye bụ́ nwunye.—Ilu 5:18; 6:32.

Uru a na-erite n’ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye ò ruru mgbalị a na-etinye maka ya? Eenụ, o ruru ya. Ọ na-eme ka alụmdi na nwunye kwụsie ike karị ma bụrụ nke ga-adịte aka, ma di ma nwunye na-eritecha uru. Dị ka ihe atụ, mgbe di ji obi ya nile na-achọ ọdịmma nke nwunye ya, obi ga-eru nnọọ nwunye ya ala nke ga-eme ka ọ na-egosipụta àgwà ya ndị kasị mma. Di ga-egosipụtakwa àgwà ya ndị kasị mma ma ọ bụrụ na nwanyị ejiri obi ya nile na-achọ ọdịmma nke di ya. Mkpebi o kpebisiri ike ịnọgidesi ike n’akụkụ nwunye ya na-enyere ya aka ịgbaso ụkpụrụ ezi omume n’ụzọ chiri anya n’akụkụ nile nke ndụ ya.

Ọ bụrụ na di na nwunye enwee ihe isi ike, ịnọgidesi ike n’ihe ga-eme ka ha abụọ nwee obi iru ala. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na di na nwunye adịghị anọgidesi ike n’akụkụ ibe ha, ihe ha na-emekarị oge ọ bụla ha nwere nsogbu bụ ikewa ma ọ bụ ịchọ ịgba alụkwaghịm. Kama idozi nsogbu, omume dị otú ahụ na-edugakarị ná nsogbu ndị ọzọ. Laa azụ n’afọ ndị 1980, otu onye a ma ama nke na-enye ndụmọdụ n’ihe metụtara ejiji, gbahapụrụ nwunye ya na ezinụlọ ya. Ò nwetara obi ụtọ mgbe ọ hapụsịrị ezinụlọ ya? Afọ iri abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, o kwetara na nkewara ahụ mere ka ya bụrụ “onye owu na-ama na onye na-enwe nchegbu nakwa na ya na-amụ anya n’abalị na-achọ ịgwa ụmụ [ya] ka chi foo.”

Nne na Nna na Ụmụ Ndị Na-anọgidesi Ike n’Akụkụ Ibe Ha

O yikarịrị ka ụmụaka hà ga-amụta ịnọgidesi ike n’ihe ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha na-anọgidesi ike n’akụkụ ibe ha. Mgbe ha toro, ọ ga-adịrị ụmụaka a zụlitere n’ezinụlọ na-anọgidesi ike n’ihe na nke na-ahụ n’anya mfe ime ihe ha kwesịrị ime n’ebe di ma ọ bụ nwunye ha nọ nakwa n’ebe ndị mụrụ ha nọ, n’oge ndị mụrụ ha meworo agadi.—1 Timoti 5:4, 8.

N’ezie, ọ bụghị mgbe nile ka ndị mụrụ ụmụ na-ebu ụzọ aghọ ndị na-adịkwaghị ike. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mkpa ka a nọgide na-elekọta nwatakịrị. Nke ahụ bụ ọnọdụ Herbert na Gertrud—ndị bụ́ Ndịàmà Jehova—chọtara onwe ha n’ime ya ruo ihe karịrị afọ iri anọ. Nwa ha nwoke, bụ́ Dietmar, rịara ajọ ọrịa bụ́ muscular dystrophy. N’ime afọ asaa ikpeazụ Dietmar dịrị ndụ tupu ya anwụọ na November 2002, ọ bịara dị mkpa ka a na-elekọta ya mgbe nile. Ndị mụrụ ya ji ịhụnanya gbooro ya mkpa ya. Ọbụna ha rụnyere ngwá ọrụ e ji elekọta ahụ́ ike n’ụlọ ha ma gaa nara ọzụzụ n’otú e si elekọta onye ọrịa. Nke ahụ bụ nnọọ ezi ihe nlereanya nke ịnọgidesi ike n’ihe n’ezinụlọ!

Ịnọgidesi Ike n’Ihe Dị Mkpa n’Ọbụbụenyi

“Mmadụ pụrụ inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ma ọ bụ nwunye, ma ọ ga-esiri mmadụ ike inwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na o nweghị enyi,” ka Birgit kwuru. Ikekwe i kweere ihe o kwuru. Ma ị̀ lụọla ma ọ bụ na ị lụbeghị, ị ga-enwe obi ụtọ, ndụ gị ga-akakwa mma ma ọ bụrụ na ezigbo enyi gị anọgidesie ike n’akụkụ gị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwunye, ezigbo enyi gị kwesịrị ịbụ di ma ọ bụ nwunye gị.

Na mmadụ na mmadụ maara apụtaghị na ha bụ enyi. Anyị pụrụ ịma ọtụtụ ndị—ndị agbata obi, ndị ibe, na ndị anyị na-ezute site n’oge ruo n’oge. Iji bụrụ ezigbo enyi, mmadụ aghaghị itinye oge na ume ya maka ọdịmma nke enyi ya, ọ ghaghịkwa ịdị na-echebara ya echiche mgbe nile. Ọ bụ ihe ùgwù ịbụ enyi mmadụ. Uru dị n’inwe enyi, ọrụ dịkwa na ya.

Iso ndị enyi anyị na-ekwurịta okwu mgbe nile dị oké mkpa. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ mkpa e nwere pụrụ ịkpalite nkwurịta okwu. “Ọ bụrụ na otu n’ime anyị enwee nsogbu, mụ na enyi m nwanyị na-akpọ ibe anyị na fon otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ n’izu. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịmara na ọ nọ ya nakwa na ọ dị njikere ịṅa ntị,” ka Birgit na-akọwa. Na mmadụ nọ ebe dị anya site n’ebe enyi ya nọ ekwesịghị imetụta ọbụbụenyi ha. Gerda na Helga bi ọtụtụ kilomita site n’ebe ibe ha nọ, ma ha anọwo na-abụ ezi ndị enyi kemgbe afọ iri atọ na ise. Gerda na-akọwa, sị: “Anyị na-ederịta akwụkwọ ozi mgbe nile na-akọrịta ahụmahụ ma na-akọwa mmetụta ndị kasị mie emie anyị na-enwe, ma ndị na-enye obi ụtọ ma ndị na-akpata mwute. Akwụkwọ ozi Helga na-eme m nnọọ obi ụtọ. Echiche anyị na-adabakọkarị.”

Ịnọgidesi ike n’ihe dị oké mkpa n’ọbụbụenyi. Otu omume nke anọgidesighị ike n’ihe pụrụ itisa ọbụna mmekọrịta dịteworo aka. Ndị enyi na-enyekarị ibe ha ndụmọdụ ọbụna n’ihe nzuzo. Ndị enyi ga-ekwu ihe ndị dị ha n’obi n’atụghị ụjọ na a ga-ewetu ha ala ma ọ bụ kọsaa ihe nzuzo ahụ. Bible na-ekwu, sị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.”—Ilu 17:17.

Ebe ọ bụ na ndị enyi anyị na-emetụta otú anyị si eche echiche, mmetụta ndị anyị na-enwe, nakwa omume anyị, ọ dị mkpa ka ndị anyị na-emete enyi bụrụ ndị ụzọ ndụ ha na nke anyị kwekọrọ. Dị ka ihe atụ, hụ na ndị enyi gị bụ ndị gị na ha nọ n’otu okpukpe, ndị gị na ha nwere otu ụkpụrụ omume, na ndị gị na ha nwere otu echiche banyere ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ndị enyi dị otú ahụ ga-enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ gị. A sị kwuwe, n’ihi gịnị ka gị na onye ụkpụrụ ya na omume ya na-ekwekọghị na nke gị ga-ejidị na-akpachi anya? Bible na-egosi na ọ dị mkpa ịhọrọ ndị enyi bụ́ ezigbo ya mgbe ọ sịrị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.

A Pụrụ Ịmụta Ịnọgidesi Ike n’Ihe Amụta

Mgbe nwatakịrị mụtara ịtapanye agbịrịgba n’uwe mmadụ, o yikarịrị ka ọ̀ ga-achọ ịdị na-egwu egwuregwu dị otú ahụ mgbe mgbe. Otú ahụ ka ọ pụkwara ịdị n’ebe onye na-anọgidesi ike n’ihe nọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị ana-agbalịsi ike ịnọgidesi ike n’ihe n’ụzọ ka ukwuu, ọ ga-adịkwuru anyị mfe ịdị na-egosipụta ya. Ọ bụrụ na mmadụ esi na nwata mụta ịnọgidesi ike n’akụkụ ndị ezinụlọ ya, ọ ga-adịrị ya mfe karị ịnọgidesi ike n’akụkụ ndị enyi ya mgbe o toro. Ka oge na-aga, ọbụbụenyi dị otú ahụ nke siri ike nakwa nke na-adịgide adịgide pụrụ ime ka ọ bụrụ onye na-anọgidesi ike n’ihe mgbe ọ lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Nke a ga-enyekwara ya aka ịnọgidesi ike n’akụkụ enyi kasị enyi nile.

Jizọs kwuru na iwu kasịnụ bụ iji obi anyị nile, mkpụrụ obi anyị nile, uche anyị nile, na ume anyị nile, hụ Jehova Chineke n’anya. (Mak 12:30) Nke a pụtara na anyị ji Chineke ụgwọ ịnọgidesi ike n’akụkụ ya n’ụzọ zuru ezu. Ịnọgidesi ike n’akụkụ Jehova Chineke na-eweta ụgwọ ọrụ bara ụba. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ewetu anyị ala ma ọ bụ mewaa anyị obi, n’ihi na Bible kwuru, sị: “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi.” (1 Ndị Kọrint 1:9) N’ezie, ịnọgidesi ike n’ihe, ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi, n’ebe Chineke nọ na-eweta ụgwọ ọrụ na-adịru ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ịnọgidesi ike n’ihe nke ezi enyi gị ga-eme gị obi ụtọ

[Foto dị na peeji nke 5]

Ndị òtù ezinụlọ, bụ́ ndị na-anọgidesi ike n’ihe, na-egbo mkpa ibe ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya