Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w05 12/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ònye Bụ Pọntiọs Paịlet?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Amagedọn—Oge Mgbanwe nke Ga-eweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Amagedọn—Òle Mgbe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
w05 12/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ì ritewo uru site n’ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

• N’ihi gịnị ka a pụrụ iji jiri mmehie mbụ ahụ—nnupụisi Adam—tụnyere ọrịa e ketara eketa?

Ọ dị ka ọrịa n’ihi na Adam bufere ụmụ ya mmehie. Anyị si otú a keta ịgba ọrụ nke mmehie, dị nnọọ ka ụfọdụ ụmụaka si eketa ọrịa n’aka ndị mụrụ ha.—8/15, peeji nke 5.

• Olee ihe ndị bụ́ isi mere ime ihe ike ji arị elu n’oge a?

Setan na-agbalị ime ka ndị mmadụ gbakụta Jehova azụ site n’ịkụnye mmụọ nke ime ihe ike n’ime obi ha, dị ka ihe atụ, site na fim, egwú, na egwuregwu kọmputa ndị na-eme ka ndị na-egwu ha na-eme ihe ike ma na-egbu ọchụ n’ụzọ egwuregwu. Ihe ike ndị a na-egosi n’usoro mgbasa ozi esowo kpata ọtụtụ ime ihe ike.—9/1, peeji nke 29.

• Ònye bụ Pọntiọs Paịlet?

Ọ bụ onye Rom nọ n’òtù ndị a ma ama, onye ọ pụrụ ịbụ na ọ nọbu n’òtù ndị agha. Eze Ukwu Taịbiriọs nke Rom họpụtara Paịlet dị ka gọvanọ nke ógbè Judia n’afọ 26 O.A. Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe, Paịlet nụrụ ebubo ndị ndú ndị Juu boro Jizọs. Iji mee ìgwè mmadụ ahụ obi ụtọ, ọ kwadoro ka a kpọgbuo Jizọs.—9/15, peeji nke 10-12.

• Gịnị bụ “ihe ịrịba ama ahụ” e kwuru okwu ya na Matiu 24:3?

Ihe ịrịba ama a nwere ọtụtụ akụkụ ndị gbakọrọ aka ghọọ akara nke ọtụtụ ihe mejupụtara. Ihe ịrịba ama ahụ gụnyere agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na ala ọma jijiji, ọ ga-enyekwara ndị na-eso ụzọ Jizọs aka ịmata oge “ọnụnọ” ya nakwa nke “ngwụsị nke usoro ihe a.”—10/1, peeji nke 4-5.

• Olee ebe ndị Juu bigasị na narị afọ mbụ?

Na narị afọ mbụ, ebe ndị Juu kasị biri bụ na Siria, Eshia Maịnọ, Babilọn, na Ijipt, e nwekwara obere ógbè dị iche iche nke ndị Juu n’akụkụ Europe nke dị n’okpuru Alaeze Ukwu Rom.—10/15, peeji nke 12.

• Onye Kraịst ọ̀ ka ga-enwe akọ na uche dị ọcha ma ọ bụrụ na ọ nakwere ọrụ e ji ngwá ọgụ arụ?

Ọ bụ mmadụ ga-ekpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-arụ ọrụ ego metụtara ibu égbè ma ọ bụ ngwá ọgụ ọzọ. Ma ịrụ ọrụ e bu ngwá ọgụ arụ nwere ike ime ka mmadụ daba n’ikpe ọmụma ọbara ma ọ bụrụ na o jiri ya mee ihe, ọ na-emekwa ka mmadụ nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye e merụrụ ahụ́ ma ọ bụ onye e gburu ma ọ bụrụ na a wakpo ya ma ọ bụ ndị ọ wakporo awakpogwara ya. Onye Kraịst nke na-ebu ngwá ọgụ dị otú ahụ agaghị eru eru inweta ihe ùgwù pụrụ iche n’ọgbakọ. (1 Timoti 3:3, 10)—11/1, peeji nke 31.

• Ebe ọ bụ na e si n’okwu bụ́ “Ugwu Megido” nweta okwu ahụ bụ́ “Amagedọn,” à ga-alụ agha Amagedọn n’otu ugwu dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa?

Ee e. E nweghị ugwu a na-akpọ Ugwu Megido, nanị ihe e nwere bụ mkpumkpu ebe dị n’akụkụ ndagwurugwuru dị n’Izrel. Ebe ahụ enweghị ike ịbacha “ndị eze nke ụwa na usuu ndị agha ha.” A ga-alụ agha ukwu nke Chineke gburugburu ụwa, ọ ga-akwụsịkwa agha nile. (Mkpughe 16:14, 16; 19:19; Abụ Ọma 46:8, 9)—12/1, peeji nke 4-7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya