Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 3/15 p. 26
  • Ndị Ọhụrụ Sonyere n’Òtù Na-achị Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Ọhụrụ Sonyere n’Òtù Na-achị Isi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ọhụrụ So n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Nzukọ A Na-agaghị Echefu Echefu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 3/15 p. 26

Ndị Ọhụrụ Sonyere n’Òtù Na-achị Isi

N’ỤTỤTỤ Wednesday, August 24, 2005, ezinụlọ Betel ndị dị na United States na nke Canada, bụ́ ndị e ji vidio jikọta, nụrụ otu ọkwa na-enye ọṅụ. Malite na September 1, 2005, mmadụ abụọ—Geoffrey W. Jackson na Anthony Morris—ga-esonye n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

Nwanna Jackson malitere ịsụ ụzọ na February 1971 na Tasmania, bụ́ steeti Australia mmiri gbara gburugburu. Na June 1974, ọ lụrụ Jeanette (Jenny). Obere oge ka nke ahụ gasịrị, e mere ha ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Site na 1979 ruo 2003, ha jere ozi ala ọzọ na Tuvalu, Samoa, na Fiji—bụ́ mba ndị mmiri gbara gburugburu dị n’Ebe Ndịda Pacific. Mgbe Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Jackson na-eje ozi n’ebe ndị ahụ, ha nyere nnọọ aka n’ịsụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Malite n’afọ 1992, Nwanna Jackson sonyere na Kọmitii Alaka mba Samoa, malitekwa n’afọ 1996, o sonyere na Kọmitii Alaka mba Fiji. N’April 2003, ya na Jenny sonyere n’ezinụlọ Betel United States, ọ malitekwara ịrụ ná Ngalaba Ije Ozi Maka Nsụgharị. Obere oge ka nke ahụ gasịrị, e mere Nwanna Jackson onye na-enyere Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi aka.

Nwanna Morris banyere n’ozi ọsụ ụzọ n’afọ 1971 na United States. Na December afọ ahụ, ọ lụrụ Susan, ha nọgidekwara na-asụ ụzọ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ anọ ruo mgbe ha mụrụ nwa ha nwoke mbụ, bụ́ Jesse. Ka oge na-aga, ha mụrụ nwa nwoke ọzọ nke aha ya bụ Paul. Nwanna Morris banyeghachiri n’ozi oge nile n’afọ 1979 dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Nwunye ya sonyeere ya mgbe ụmụ ha malitere akwụkwọ. Ezinụlọ ahụ jere ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu n’Àgwàetiti Rhode na n’Ebe Ugwu Carolina, nke dị na United States. N’Ebe Ugwu Carolina, Nwanna Morris rụrụ ọrụ dị ka onye na-enyere onye nlekọta sekit aka, ụmụ ha nwoke malitekwara ịsụ ụzọ oge nile. A kpọrọ Jesse na Paul ịbịa n’alaka ụlọ ọrụ United States mgbe ha dị afọ 19. Ka ọ dịgodị, Nwanna Morris malitere ọrụ sekit. Ka o ruziri 2002, a kpọrọ ya na Susan na Betel, ha malitekwara ọrụ ọhụrụ ha n’August 1. Nwanna Morris rụrụ ọrụ ná Ngalaba Ije Ozi na Patterson ma mesịa ghọọ onye na-enyere Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi aka.

E wezụga mmadụ ọhụrụ abụọ a, ndị mejupụtara Òtù Na-achị Isi bụ C. W. Barber; J. E. Barr; S. F. Herd; M. S. Lett; G. Lösch; T. Jaracz; G. H. Pierce; A. D. Schroeder; D. H. Splane; na D. Sydlik. Ndị nile so n’Òtù Na-achị Isi bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya