Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w19 Jenụwarị p. 31
  • Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ndị Ọhụrụ Sonyere n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Ọhụrụ So n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Mmadụ Abụọ A Họpụtara Ọhụrụ Ka Ha Soro n’Òtù Na-achị Isi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
w19 Jenụwarị p. 31
Kenneth and Jamie Cook

Kenneth E. Cook, Jr., na nwunye ya, Jamie

Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O soro n’Òtù Na-achị Isi

N’ỤTỤTỤ Wenezdee, abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị, afọ 2018, obi tọrọ ezinụlọ Betel dị n’Amerịka na Kanada ụtọ mgbe a maara ha ọkwa pụrụ iche. Ọkwa ahụ bụ na Nwanna Kenneth Cook, Jr., esonyerela n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

A mụrụ Nwanna Cook na Pensụlvenịa dị n’Amerịka, ya etookwa ebe ahụ. Ọ mụtara eziokwu n’aka otu nwa klas ya mgbe ọ fọrọ obere ka ọ gụchaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. E mekwara ya baptizim n’abalị asaa n’ọnwa Jun, afọ 1980. Ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba, afọ 1982. Mgbe ọ sụrụ ụzọ afọ abụọ, a kpọrọ ya ka ọ bia jewe ozi na Betel. Ọ malitere ozi Betel na Wọlkil, dị na Niu Yọk n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Ọktoba, afọ 1984.

N’ime afọ iri abụọ na ise, Nwanna Cook jere ozi n’ebe dị iche iche na Ngalaba Na-ahụ Maka Ibi Akwụkwọ nakwa n’Ọfịs Na-elekọta Ezinụlọ Betel. Ọ lụrụ nwunye ya Jamie, n’afọ 1996, ya esoro ya jewe ozi na Betel dị na Wọlkil. N’ọnwa Disemba afọ 2009, e zigara Nwanna Cook na nwunye ya n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower, dị na Patasịn, Niu Yọk, ya amalite ịrụ ọrụ na Ngalaba Na-ahụ Maka Iderịta Akwụkwọ Ozi. Obere oge ọ laghachiri Wọlkil, e zigara ya na nwunye ya na Bruklin dị na Niu Yọk n’ọnwa Eprel, afọ 2016. Mgbe ọnwa ise gachara, ha kwagara n’isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik, Niu Yọk. N’ọnwa Jenụwarị, afọ 2017, a họpụtara Nwanna Cook ka ọ na-enyere Kọmitii Ide Ihe nke Òtù Na-achị Isi aka.

Ndi so n’Òtù Na-achị Isi ugbu a bụ ụmụnna asatọ e tere mmanụ. Ha bụ:

K. E. Cook, Jr.; S. F. Herd; G. W. Jackson; M. S. Lett; G. Lösch; A. Morris III; D. M. Sanderson; D. H. Splane

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya