Ùnu Na-Ekwurịta Okwu nke Ọma?
“AKWỤKWỌ Ozi E Ji Egosi Ịhụnanya nke Onye Gbara Afọ 60 Dere.” Nke ahụ bụ isiokwu otu ụlọ akụ̀ dị na Japan nyere otu asọmpi ha haziri afọ ole na ole gara aga. Ọ gbara ndị Japan nọ n’agbata afọ 50 na 69 ume ikwupụta “ihe dị ha n’obi” banyere di ha ma ọ bụ nwunye ha. Otu onye so sọọ mpi ahụ deere nwunye ya, sị: “O nwere ike ịtọ gị ọchị, ma ọ ga-ewute m ma ọ bụrụ na mụ ekwughị ya, ngwa gewe ntị, ka m kwusie ya ike: I meela maka ịlụ m.”
N’ọtụtụ ebe, gụnyere ebe ụfọdụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, a naghị achọ ka ndị mmadụ kwupụta otú ihe dị ha n’obi. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe karịrị puku mmadụ iri na ise so dee akwụkwọ ozi ndị ahụ e ji sọọ mpi. Ọ masịrị nnọọ ọtụtụ mmadụ nke na e nwere asọmpi ahụ ọzọ, e jikwa ihe ndị e dere n’akwụkwọ ozi ndị ahụ bipụta akwụkwọ dị iche iche. Nke a na-egosi na ọ na-agụsi ọtụtụ ndị agụụ ike ikwupụta otú ha hụruru di ma ọ bụ nwunye ha n’anya. Ma ndị ọzọ adịghị eme otú ahụ. N’ihi gịnị? O nwere nnọọ ike ịbụ n’ihi na ọ na-esiri ha ike ịgwa ndị ọzọ—dị ka di ma ọ bụ nwunye ha—ihe dị ha n’obi.
Hitoshi Kato, bụ́ onye dere akwụkwọ na-ekwu banyere ịla ezumike nká, kwuru na ọ bụ ndị nwunye na-amalite ọtụtụ n’ime alụkwaghịm a na-agba na Japan n’etiti ndị meworo agadi, nke ahụ bụkwa n’ihi iwe ha buwerela n’obi kemgbe ọtụtụ afọ. O kwuru, sị: “Ma, ihe ọzọ so akpata ya bụ di na nwunye ịghara ịgwa ibe ha ihe dị ha n’obi mgbe ha nwere nsogbu.”
Mgbe nwoke lara ezumike nká, o nwere ike iju ya anya mgbe nwunye ya gwara ya na ya chọrọ ịgba ya alụkwaghịm. Ọ pụrụ ịbụ na di na nwunye ahụ agwatụbeghị ibe ha ihe ha chere banyere ibe ha ruo ọtụtụ afọ. Ọ pụrụ ịbụ na di na nwunye ahụ agbalịala ikwu uche ha ma ghara inwe ike ikwu ya otú ọ na-agaghị akpasu onye nke ọzọ iwe. Kama ịbịakwu onwe ha nso, ha na-arụ ụka mgbe nile.
Olee otú di na nwunye pụrụ isi dozie nghọtahie ndị ha nwere n’udo ma na-agwa ibe ha ihe dị ha n’obi n’akpasughị ibe ha iwe? O nwere ike ịmasị gị ịnụ na ebe a ga-achọta aro ndị kasị mma na nke a abụghị n’akwụkwọ ọhụrụ onye ndụmọdụ alụmdi na nwunye dere, kama n’otu akwụkwọ ochie ndị mmadụ sọpụụrụla ruo ọtụtụ afọ—ya bụ Bible.