Agbamakwụkwọ Ndị Dị Ùgwù n’Anya Chineke Na Mmadụ
“Otu oriri alụmdi na nwunye weere ọnọdụ na Kena . . . A kpọkwara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya n’oriri alụmdi na nwunye ahụ.”—JỌN 2:1, 2.
1. Olee ihe akụkọ banyere ihe Jizọs mere na Kena na-agwa anyị?
JIZỌS, nne ya, na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya maara ọṅụ agbamakwụkwọ dị ùgwù nke ndị Chineke na-eweta. Kraịst medịrị ka otu agbamakwụkwọ pụọ iche site n’ịrụ ọrụ ebube mbụ ya e dekọrọ edekọ n’ebe ahụ, wee si otú a mee ka agbamakwụkwọ ahụ tọkwuo ụtọ. (Jọn 2:1-11) Ọ pụrụ ịbụ na ị gaala agbamakwụkwọ nke Ndị Kraịst chọrọ ife Jehova dị ka di na nwunye nwere obi ụtọ, o nwekwara ike ịbụ na agbamakwụkwọ ndị ahụ tọrọ gị ụtọ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ị na-atụ anya ime ụdị agbamakwụkwọ ahụ ma ọ bụ inyere enyi gị aka ime ka agbamakwụkwọ ya gaa nke ọma. Olee ihe nwere ike ime ka ọ gaa nke ọma?
2. Olee ihe Bible gwara anyị banyere agbamakwụkwọ?
2 Ndị Kraịst achọpụtala na ndụmọdụ dị n’Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ na-enyere nnọọ nwoke na nwanyị na-achọ ịlụ di na nwunye aka. (2 Timoti 3:16, 17) Ee, Bible agwaghị anyị ihe nile a ga-eme n’agbamakwụkwọ Ndị Kraịst. Ọ dịkwanụ mma otú ahụ, n’ihi na omenala na ọbụna ihe iwu chọrọ n’ebe nile na n’ọgbọ nile abụghị otu. Dị ka ihe atụ, n’Izrel oge ochie, a naghị agba akwụkwọ otú e si eme ya taa. N’ụbọchị agbamakwụkwọ, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ ga-akpọlata nwunye ya n’ụlọ nke ya ma ọ bụ n’ụlọ nna ya n’ihu mmadụ nile. (Jenesis 24:67; Aịsaịa 61:10; Matiu 1:24) Ọ bụ nke a bụ agbamakwụkwọ ha, ọ dịghịkwa ha mkpa ime ihe ndị ọzọ a na-emekarị n’agbamakwụkwọ nke oge a.
3. Olee ememe e mere na Kena nke Jizọs mere ka ọ tọkwuo ụtọ?
3 Ndị Izrel ghọtara mkpọlata ahụ nwoke ahụ kpọlatara nwunye ya dị ka ọlụlụ ma ọ bụ agbamakwụkwọ ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, ha nwere ike ime oriri, dị ka nke ahụ e kwuru banyere ya na Jọn 2:1. Ọtụtụ Bible si otú a sụgharịa amaokwu ahụ: “E nwere otu agbamakwụkwọ na Kena.” Ma ụzọ dị nnọọ mma isi sụgharịa okwu e ji mee ihe n’ebe ahụ n’asụsụ mbụ bụ “oriri alụmdi na nwunye” ma ọ bụ “oriri agbamakwụkwọ.”a (Matiu 22:2-10; 25:10; Luk 14:8) Ihe ndekọ Bible ahụ gosiri na Jizọs gara oriri agbamakwụkwọ ndị Juu ma mee ka ọ tọkwuo ụtọ. Ma, isi ihe anyị na-ekwu bụ na ihe a na-akpọ agbamakwụkwọ n’oge ahụ dị iche n’ihe a na-emekarị n’oge a.
4. Olee ụdị agbamakwụkwọ ụfọdụ Ndị Kraịst na-ahọrọ, maka gịnịkwanụ?
4 N’ọtụtụ mba taa, a na-achọ n’aka Ndị Kraịst chọrọ ịlụ di na nwunye ime ihe ụfọdụ iwu chọrọ. Ozugbo ha mechara ihe ndị ahụ, ha nwere ike ịlụ n’ụzọ ọ bụla iwu kwadoro. O nwere ike ịbụ n’obere nnọkọ nke ọkàikpe, onyeisi obodo, ma ọ bụ onye ozi okpukpe nke gọọmenti nyere ikike ga-eduzi. Ụfọdụ na-ahọrọ isi otú ahụ alụ, ikekwe kpọọ mmadụ ole na ole bụ́ ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị enyi ha n’ọgbakọ Ndị Kraịst ịbụ ndị akaebe dị ka iwu si chọọ ma ọ bụ nanị iji soro ha ṅụrịa ọṅụ n’ihe omume a dị mkpa. (Jeremaịa 33:11; Jọn 3:29) Ndị Kraịst ndị ọzọ nwekwara ike ịhọrọ ịghara ịkpọ oriri agbamakwụkwọ buru ibu nke ga-ewe oge ma ọ bụ ego dị ukwuu. Kama nke ahụ, ha nwere ike ime ndokwa ịkpọ nanị ezi ndị enyi ha ole na ole iso ha rikọọ nri. N’agbanyeghị nke onye ọ bụla n’ime anyị họọrọ n’ihe ndị a, anyị kwesịrị ịma na Ndị Kraịst ọzọ tozuru okè nwere ike ile ihe anya n’ụzọ dị iche n’otú anyị si ele ya.—Ndị Rom 14:3, 4.
5. N’ihi gịnị ka ọtụtụ Ndị Kraịst ji achọ ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ mgbe ha lụrụ, gịnịkwa ka a na-ekwu na ya?
5 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-achọ ịlụ di na nwunye na-ahọrọ ka e kwuoro ha okwu dabeere na Bible n’agbamakwụkwọ ha.b Ha maara na ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye nakwa na Okwu ya nwere ndụmọdụ ndị amamihe dị na ha banyere otú a ga-esi mee ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma ma weta obi ụtọ. (Jenesis 2:22-24; Mak 10:6-9; Ndị Efesọs 5:22-33) Ihe kakwa ọtụtụ n’ime ha na-achọ ịkpọ ndị ikwu na ibe ha ka ha bịa nọnyere ha n’oge obi ụtọ dị otú ahụ. Ma, olee otú anyị ga-esi lee ihe dịgasị nnọọ iche iwu chọrọ, ụkpụrụ dị iche iche a na-agbaso, na ọbụna omenala nke obodo dị iche iche anya? Isiokwu a ga-atụle ọnọdụ e nwere n’ógbè dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ nwere ike ịdị nnọọ iche n’ihe ị maara ma ọ bụ n’ihe a na-eme n’ógbè unu. N’agbanyeghị nke ahụ, i nwere ike ịhụ ụkpụrụ ma ọ bụ ihe ụfọdụ a na-eme n’ebe nile bụ́ ndị dị ndị ohu Chineke mkpa.
Agbamakwụkwọ Dị Ùgwù Bụ nke Iwu Kwadoro
6, 7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji lebara ihe ndị iwu chọrọ maka alụmdi na nwunye anya, oleekwa otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-eme otú ahụ?
6 Ọ bụ ezie na ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye, ndị ọchịchị bụ́ mmadụ nwere ikike ikpebi ihe ụfọdụ ndị chọrọ ịlụ di na nwunye ga-eme. Nke a kwesịrị ekwesị. Jizọs kwuru, sị: “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:17) Pọl onyeozi nyekwara ntụziaka yiri nke ahụ, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu, n’ihi na ikike ọ bụla adịghị ma ọ́ bụghị site na Chineke; Chineke debere ikike ndị dị adị n’ọkwá ha ndị ka ala.”—Ndị Rom 13:1; Taịtọs 3:1.
7 N’ọtụtụ mba, ọ bụ Siza, nke bụ́ ndị ọchịchị, na-ekpebi onye ruru eru ịlụ di ma ọ bụ nwunye. N’ihi ya, mgbe Ndị Kraịst abụọ bụ́ ndị ruru ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru maka ịlụ di na nwunye kpebiri ịlụ, ha na-eji nlezianya agbaso iwu obodo ha. Nke a pụrụ ịgụnye inweta akwụkwọ ikike, ịgakwuru onye gọọmenti nyere ikike iduzi alụmdi na nwunye, na ma eleghị anya ideba alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ gọọmenti mgbe ha lụsịrị. Mgbe Siza Ọgọstọs nyere iwu ka mmadụ nile ‘debanye aha n’akwụkwọ,’ Meri na Josef rubere isi, gaa Betlehem “ka e wee debanye aha [ha] n’akwụkwọ.”—Luk 2:1-5.
8. Olee otú alụmdi na nwunye bụruru ihe na-adịgide adịgide, oleekwa ihe Ndịàmà Jehova na-eme nke na-egosi na ha ghọtara ya otú ahụ?
8 Mgbe Ndị Kraịst abụọ lụrụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu na n’ụzọ e si alụ nwanyị n’ógbè ha, Chineke na-ele alụmdi na nwunye ha anya dị ka ihe na-adịgide adịgide. N’ihi ya, ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova agbaala akwụkwọ n’ụzọ iwu kwadoro, ha anaghị agbagharị ya, ha anaghịkwa ekwegharị nkwa agbamakwụkwọ ha n’oge ọ bụla ọzọ, dị ka mgbe ha na-eme ememe ncheta agbamakwụkwọ ha nke afọ 25 ma ọ bụ nke afọ 50. (Matiu 5:37) (Ụfọdụ chọọchị anaghị anabata alụmdi na nwunye iwu kwadoro, na-ekwu na ndị ahụ alụbeghị ma ọ bụrụ na onye ụkọchukwu emebeghị ememe okpukpe ụfọdụ n’isi ha ma ọ bụ jikọta ha dị ka di na nwunye.) N’ọtụtụ ala, gọọmenti na-enye onye ozi nke Ndịàmà Jehova ikike ijikọta di na nwunye. Ná mba ndị ahụ, onye ozi ahụ nwere ike ịchọ ikwu okwu agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ọ na-eme nke ahụ. Nke ahụ bụ ebe a na-anọ efe ezi ofufe n’ógbè ahụ na ebe kwesịrị ekwesị ịnọ kwuo okwu banyere ndokwa a, bụ́ nke Jehova Chineke hiwere.
9. (a) Ya bụrụ na Ndị Kraịst abụọ ekpebie ịlụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu gọọmenti, gịnị ka ha nwere ike ịhọrọ ime? (b) Olee otú ndokwa agbamakwụkwọ ahụ nwere ike isi gbasa ndị okenye?
9 Ná mba ndị ọzọ, iwu chọrọ ka ndị chọrọ ịlụ di na nwunye nọrọ n’ụlọ ọrụ gọọmenti lụọ, dị ka n’ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo, ma ọ bụ onye gọọmenti họpụtara ejikọta ha. Mgbe Ndị Kraịst mesịrị ihe ahụ iwu kwadoro, ha na-achọkarị ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’otu ụbọchị ahụ ma ọ bụ n’echi ya. (Ha ekwesịghị ichere ruo ọtụtụ ụbọchị ha lụsịrị dị ka iwu chọrọ tupu a na-ekwuru ha okwu ahụ dabeere na Bible, n’ihi na ma Chineke ma ụmụ mmadụ na-elezi ha anya dị ka di na nwunye, ọgbakọ Ndị Kraịst na-elekwa ha anya otú ahụ.) Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ga-alụ di na nwunye n’ụzọ kwekọrọ n’iwu gọọmenti achọọ ka a nọrọ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze kwuoro ha okwu, ha kwesịrị ibu ụzọ nata ikike n’aka ndị okenye nọ na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ nke na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. E wezụga ịchọpụta ma ndị ahụ na-achọ ịlụ di na nwunye hà nwere ezi aha, ndị nlekọta a ga-ahụ na agbamakwụkwọ ahụ emetụtaghị ọmụmụ ihe na ihe ndị ọzọ e merela atụmatụ ime n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. (1 Ndị Kọrint 14:33, 40) Ha ga-atụlekwa otú ndị ahụ chọrọ ịlụ di na nwunye kwuru ha chọrọ ka e siri dozie Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ ma kpebie ma à ga-amara ọgbakọ ndị na-eji ya eme ihe ọkwa ihe a chọrọ iji ya mee.
10. Ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ aghaghị ịlụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu gọọmenti, olee otú ọ ga-esi metụta okwu agbamakwụkwọ ahụ?
10 Okenye nke ga-ekwu okwu agbamakwụkwọ ahụ kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi kwuo ya n’ụzọ ga-eme ka ndị bịaranụ rite uru na ndụmọdụ Bible dị na ya ma kwuo ya n’ụzọ dị ùgwù. Ọ bụrụ na e burula ụzọ jikọta nwoke na nwanyị ahụ n’alụmdi na nwunye kwekọrọ n’iwu gọọmenti, okenye ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè na ha alụọla n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Siza. Ọ bụrụ na nwoke na nwanyị ahụ ekweghị onwe ha nkwa mgbe a na-ejikọta ha n’ụlọ ọrụ gọọmenti, ha nwere ike ime otú ahụ mgbe a na-ekwuru ha okwu agbamakwụkwọ ahụ.c Ọ bụrụ na di na nwunye ọhụrụ ahụ kwere onwe ha nkwa mgbe a na-ejikọta ha n’ụzọ iwu kwadoro ma ha achọọ ikwe onwe ha nkwa n’ihu Jehova na ọgbakọ, ha ga na-ekwe nkwa ahụ dị ka ihe garala aga iji gosi na e burula ụzọ ‘kekọta ha.’—Matiu 19:6; 22:21.
11. N’ebe ụfọdụ, olee otú nwoke na nwanyị na-esi alụ, oleekwa otú ọ na-esi emetụta okwu agbamakwụkwọ ha?
11 N’ebe ụfọdụ, o nwere ike iwu agaghị achọ ka e meere alụmdi na nwunye ememe ọ bụla, o nwedịrị ike ọ gaghị achọ ka onye ọrụ gọọmenti jikọta di na nwunye. Ha na-aghọ di na nwunye mgbe ha gosiri onye ọrụ gọọmenti akwụkwọ a bịanyere aka na ya ha dejupụtara iji debanye alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ. A na-edebanyezi satifiketi alụmdi na nwunye ha n’akwụkwọ. A na-elewezi ha anya dị ka di na nwunye, ụbọchị ahụ na-aghọkwa ụbọchị ha lụrụ. Dị ka e kwuru n’elu, mmadụ abụọ si otú ahụ lụọ nwere ike ịchọ ka e kwuoro ha okwu dabeere na Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ozugbo ha lụsịrị. Nwanna nwoke tozuru okè n’ọgbakọ nke a họọrọ ikwu okwu ahụ ga-agwa ndị nile bịaranụ na mmadụ abụọ ahụ alụọla n’ihi akwụkwọ ahụ ha dejupụtara n’oge na-adịbeghị anya. Nkwa ọ bụla ha ga-ekwe onwe ha mgbe a na-ekwu okwu ahụ ga-ekwekọ n’ihe e kwuru na paragraf nke 10 nakwa n’ihe odide ala ala peeji ya. Ndị bịara igere okwu ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-eso di na nwunye ahụ ṅụrịa ọṅụ ma rite uru na ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke nke a ga-enye.—Abụ nke Abụ 3:11.
Alụmdi na Nwunye Omenala na nke Iwu Gọọmenti
12. Olee ihe bụ́ alụmdi na nwunye omenala, oleekwa ihe e kwesịrị ime mgbe alụmdi na nwunye dị otú ahụ gasịrị?
12 Ná mba ụfọdụ, nwoke na nwanyị na-abanye n’ihe e nwere ike ịkpọ alụmdi na nwunye omenala. Nke a abụghị nwoke na nwanyị ibikọta ọnụ, ma ọ bụ ha ịkpọ onwe ha di na nwunye bụ́ nke ndị obodo ụfọdụ nabatara ma ọ bụghị alụmdi na nwunye zuru ezu nke kwekọrọ n’iwu.d Ihe anyị na-ekwu banyere ya bụ alụmdi na nwunye nke kwekọrọ n’omenala mmadụ nile nọ n’obodo ma ọ bụ ógbè nabatara. Nke a pụrụ ịgụnye ịkwụzu na ịnara ụgwọ isi nwanyị, bụ́ nke na-eme ka mmadụ abụọ ahụ ghọọ di na nwunye n’ụzọ kwekọrọ n’iwu mba na n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. Gọọmenti na-ele ụdị alụmdi na nwunye omenala ahụ anya dị ka nke kwesịrị ekwesị, kwekọọ n’iwu, na nke ga-adịgide adịgide. Mgbe nke ahụ gasịrị, a na-enwekarị ike idebanye alụmdi na nwunye omenala ahụ n’akwụkwọ, mgbe di na nwunye ahụ mekwara nke ahụ, e nwere ike inye ha satifiketi sitere n’aka gọọmenti. Idebanye alụmdi na nwunye ahụ n’akwụkwọ pụrụ ichebe di na nwunye ahụ ma ọ bụ nwunye ahụ ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, ọ pụkwara ichebe ụmụ ọ bụla ha mesịrị mụọ. Ọgbakọ ga-agba ndị ọ bụla banyere n’alụmdi na nwunye omenala ume ka ha debanye ya n’akwụkwọ ozugbo o kwere ha mee. Ọ dị mma ịmata na ọ dị ka Iwu Mozis ọ̀ chọrọ ka a na-edeba alụmdi na nwunye na nwa ọ bụla a mụrụ n’akwụkwọ ndị ọchịchị.—Matiu 1:1-16.
13. Mgbe alụmdi na nwunye omenala gasịrị, olee ihe e kwesịrị ime n’ihe banyere okwu agbamakwụkwọ?
13 Nwoke na nwanyị e ji omenala dị otú ahụ iwu kwadoro jikọta na-aghọ di na nwunye mgbe nke ahụ gasịrị. Dị ka anyị burula ụzọ kwuo, Ndị Kraịst si otú ahụ lụọ nwere ike ịchọ ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ, ha ekwekwa onwe ha nkwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na e mee nke ahụ, onye na-ekwu okwu ahụ ga-ekwu na ha eburula ụzọ lụọ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu Siza. Ọ bụ nanị otu okwu agbamakwụkwọ ka a ga-ekwu. Ọ bụ nanị otu alụmdi na nwunye ka mmadụ abụọ ahụ lụrụ, ya bụ, alụmdi na nwunye omenala nke iwu nabatara, na otu okwu agbamakwụkwọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ịghara ichere ogologo oge mgbe e mesịrị otu tupu e mee ibe ya, ya dị mfe, ime ha abụọ otu ụbọchị, na-eso eme ka ndị ógbè ahụ na-akwanyere alụmdi na nwunye Ndị Kraịst ùgwù.
14. Gịnị ka Onye Kraịst nwere ike ime ma ọ bụrụ na o nwere ike ịhọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye n’ụzọ omenala ma ọ bụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu gọọmenti?
14 N’ala ụfọdụ ebe e weere alụmdi na nwunye omenala dị ka ihe iwu kwadoro, e nwekwara ndokwa maka ịlụ n’ụzọ kwekọrọ n’iwu gọọmenti. Ọ na-abụkarị onye ọrụ gọọmenti na-eduzi alụmdi na nwunye kwekọrọ n’iwu gọọmenti, o nwekwara ike ịgụnye di na nwunye ikwe ibe ha nkwa na ịbịanye aka n’akwụkwọ ebe e debanyere alụmdi na nwunye ahụ. Ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-achọ ịlụ di na nwunye na-ahọrọ ụdị alụmdi na nwunye a karịa nke omenala. Iwu achọghị ka e nwee ụdị abụọ ahụ; iwu nabatara nke ọ bụla n’ime ha. Ihe e kwuru banyere okwu agbamakwụkwọ na ikwe nkwa na paragraf nke 9 na nke 10 metụtakwara alụmdi na nwunye kwekọrọ n’iwu gọọmenti. Ihe ka mkpa bụ ka nwoke na nwanyị ahụ lụọ n’ụzọ dị ùgwù n’anya Chineke na mmadụ.—Luk 20:25; 1 Pita 2:13, 14.
Ka Alụmdi na Nwunye Nọgide Na-adị Ùgwù
15, 16. Olee otú e kwesịrị isi gosi nsọpụrụ n’alụmdi na nwunye?
15 Mgbe otu eze Peshia na nwunye ya nwere nsogbu, onye ndụmọdụ ukwu ya a na-akpọ Memukan nyere ya otu ndụmọdụ pụrụ ịba uru—‘ka ndị inyom nile na-enye di ha nsọpụrụ.’ (Esta 1:20) N’alụmdi na nwunye Ndị Kraịst, e kwesịghị ichere ka eze nye ndụmọdụ ahụ n’iwu; ndị inyom kwesịrị ịdị na-asọpụrụ di ha. Ndị di bụ́ Ndị Kraịst na-asọpụrụ ndị nwunye ha ma na-eto ha. (Ilu 31:11, 30; 1 Pita 3:7) Anyị ekwesịghị ichere ruo ọtụtụ afọ anyị lụsịrị di ma ọ bụ nwunye tupu anyị asọpụwara di ma ọ bụ nwunye anyị. Anyị kwesịrị ịmalite ịsọpụrụ di ma ọ bụ nwunye anyị ná mmalite, ee, malite n’ụbọchị agbamakwụkwọ anyị gawa.
16 Ọ bụghị nanị nwoke na nwanyị ahụ—di na nwunye ahụ—kwesịrị igosi nsọpụrụ n’ụbọchị agbamakwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ okenye ọgbakọ ga-ekwu okwu agbamakwụkwọ ahụ, okwu ahụ kwesịkwara igosi nsọpụrụ. O kwesịrị ịbụ di na nwunye ahụ ka ọ na-agwa okwu. Iji kwanyere ha ùgwù, ọkà okwu ahụ agaghị ekwuwe okwu ọchị ma ọ bụ kọwa akụkọ ọdịnala. O kwesịghị ikwu ihe nzuzo bụ́ ndị nwere ike imenye di na nwunye ahụ na ndị na-ege ntị ihere. Kama nke ahụ, o kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu ahụ n’ụzọ na-agba ume, kwusie okwu ike banyere Onye malitere alụmdi na nwunye na ndụmọdụ Ya ndị pụtara ìhè. Ee, okenye ahụ ikwu okwu ahụ n’ụzọ dị ùgwù ga-eso mee ka alụmdi na nwunye ahụ wetara Jehova Chineke nsọpụrụ.
17. N’ihi gịnị ka agbamakwụkwọ Ndị Kraịst ji agbaso iwu obodo?
17 Ma eleghị anya ị hụrụ na isiokwu a kwuru ọtụtụ ihe ndị iwu chọrọ banyere alụmdi na nwunye. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ghara imetụtacha ógbè unu. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị nile kwesịrị ịma otú o si dị mkpa ka ndokwa alụmdi na nwunye dị n’etiti Ndịàmà Jehova gosi na ha na-akwanyere iwu ndị dị n’ógbè ha, nke bụ́ iwu Siza, ùgwù. (Luk 20:25) Pọl gbara anyị ume, sị: “Na-enyenụ mmadụ nile ihe ndị ruuru ha, nyenụ onye chọrọ ụtụ isi, ụtụ isi; nyenụ onye chọrọ ụtụ, ụtụ; . . . nyenụ onye chọrọ nsọpụrụ, nsọpụrụ dị otú ahụ.” (Ndị Rom 13:7) Ee, o kwesịrị ka Ndị Kraịst malite nnọọ n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha kwanyewara ndokwa ahụ Chineke mere maka oge anyị a ùgwù.
18. Olee ihe e nwere ike ime n’agbamakwụkwọ ma a chọọ bụ́ nke anyị kwesịrị ichebara echiche, oleekwa ebe anyị nwere ike isi nweta ndụmọdụ ga-enyere anyị aka n’akụkụ a?
18 Oriri na-esochikarị ọtụtụ agbamakwụkwọ Ndị Kraịst. Cheta na Jizọs gara otu oriri dị otú ahụ. Ọ bụrụ na e nwere ụdị oriri ahụ, olee otú ndụmọdụ sitere na Bible nwere ike isi nyere anyị aka ịhụ na o wetakwaara Chineke nsọpụrụ ma ghara imebi aha ndị ahụ lụrụ di na nwunye ọhụrụ ma ọ bụ aha ọgbakọ Ndị Kraịst? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nnọọ nke ahụ.e
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E nwekwara ike iji okwu ahụ mee ihe mgbe a na-ekwu banyere oriri nke na-emetụtaghị alụmdi na nwunye.—Esta 9:22, Septuagint.
b Ndịàmà Jehova na-eji ihe ndepụta nke na-ewe minit 30 nke isiokwu ya bụ “Alụmdi na Nwunye Dị Nsọpụrụ n’Anya Chineke” ekwu okwu a. Okwu a dabeere n’ezi ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ na akwụkwọ ndị ọzọ Ndịàmà Jehova bipụtara. Okwu ahụ na-abara ma mmadụ abụọ ahụ na-abanye n’alụmdi na nwunye ma ndị nile bịara agbamakwụkwọ ahụ uru.
c Ọ gwụla ma iwu obodo ọ̀ chọrọ ka ha kwuo ihe dị iche, ọ bụ nkwa ndị a na-ewetara Chineke nsọpụrụ ka ha ga-ekwe onwe ha. Di ga-asị: “Mụ [aha di] na-anara gị [aha nwunye ya] ịbụ nwunye nke m ji gbaa akwụkwọ, ịhụ gị n’anya na ilekọta gị dị ka iwu Chineke nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ nye Ndị Kraịst bụ́ di si dị, ruo ogologo oge anyị abụọ na-adị ndụ n’elu ala dị ka ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke mere si dị.” Nwunye ga-asị: “Mụ [aha nwunye] na-anara gị [aha di ya] ịbụ di nke m ji gbaa akwụkwọ, ịhụ gị n’anya na ilekọta gị na ịsọpụrụ gị n’ụzọ miri emi, dị ka iwu Chineke nke e dere n’Akwụkwọ Nsọ maka Ndị Kraịst bụ́ nwunye si dị, ruo ogologo oge anyị abụọ na-adị ndụ n’elu ụwa dị ka ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke mere si dị.”
d Ụlọ Nche (Bekee) nke May 1, 1962, peeji nke 287, kwuru okwu banyere mmadụ abụọ ibikọta ọnụ dị ka dị na nwunye n’ebughị ụzọ lụọ alụọ.
e Leekwa isiokwu bụ́ “Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù,” nke dị na peeji nke 28.
Ì Chetara?
• Olee ihe mere anyị kwesịrị iji nwee mmasị ma n’ihe metụtara iwu ma n’ihe metụtara okwu dabeere na Bible a ga-ekwu n’ụbọchị agbamakwụkwọ?
• Ọ bụrụ na Ndị Kraịst abụọ alụọ n’ụlọ ọrụ gọọmenti, gịnị ka ha nwere ike ikpebi ka e meere ha n’oge na-adịghị anya ha lụsịrị?
• N’ihi gịnị ka a na-eji ekwu okwu agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
[Foto dị na peeji nke 18]
N’agbamakwụkwọ ndị Izrel oge ochie, nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na-akpọlata nwunye ya n’ụlọ ya ma ọ bụ n’ụlọ nna ya
[Foto dị na peeji nke 21]
Mgbe Ndị Kraịst lụsịrị di na nwunye n’ụzọ omenala, ha nwere ike ịchọ ka e kwuoro ha okwu agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze