Bazilaị Nwoke Maara Ihe Ọ Na-agaghị Emeli
‘N’IHI gịnị ka m ga-eji bụụrụ gị ibu?’ Onye gwara Eze Devid nke Izrel okwu a bụ agadi nwoke dị afọ 80 aha ya bụ Bazilaị. Bible kwuru na ọ bụ “oké mmadụ nke ukwuu,” o dokwara anya na ọ bụ n’ihi akụnụba ya. (2 Samuel 19:32, 35) Bazilaị biri n’ala Gilied, bụ́ ógbè bụ́ ugwu ugwu nke dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan.—2 Samuel 17:27; 19:31.
Olee ihe mere Bazilaị ji gwa Devid okwu ahụ? Oleekwa ihe mere agadi nwoke a ji kwuo okwu otú ahụ?
Isi E Nupụụrụ Eze
Devid nọ ná nsogbu. Nwa ya nwoke bụ́ Absalọm ewegharala ọchịchị, ka o ‘zusịịrị obi ndị ikom Izrel n’ohi.’ O doro anya na Absalọm ga-egburịrị onye ọ bụla kwadoro nna ya. Ọ bụ ya mere Devid na ndị ohu ya ji gbapụ na Jeruselem. (2 Samuel 15:6, 13, 14) Mgbe Devid bịaruru Mahaneim, bụ́ nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan, Bazilaị nyeere ya aka.
Bazilaị na ndị ikom abụọ bụ́ Shobi, na Makia ji mmesapụ aka wetara Devid ọtụtụ ihe dị ya mkpa. Mmadụ atọ a kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nọ n’okpuru ọchịchị Devid gosiri na ha ghọtara ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya mgbe ha kwuru banyere ya na ndị ikom ya, sị: “Agụụ na-agụ ndị nke a, ha na-adakwa mbà, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, n’ọzara.” Bazilaị na ndị ikom ahụ mere ihe nile ha nwere ike ime iji gboo mkpa ahụ site n’ibutere Devid na ndị ikom ya ihe ndina, ọka wit, ọka bali, ntụ ọka, ọka a mịkpọrọ amịkpọ, akịdị, lentil, mmanụ aṅụ, mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, atụrụ, na ihe ndị ọzọ.—2 Samuel 17:27-29.
Inyere Devid aka bụ itinye onwe ha n’ihe ize ndụ. O yighị ka Absalọm ọ̀ ga-ahapụ onye ọ bụla kwadoro eze Jehova họpụtara n’ataghị ya ahụhụ. N’ihi ya, aka ahụ Bazilaị nyeere Devid gosiri na o nwere obi ike.
Ọnọdụ Agbanwee
N’oge na-adịghị anya ka e mesịrị, ndị agha Absalọm na-enupụ isi zutere ndị ikom Devid. Ọgụ biiri ọkụ n’ọhịa Ifrem, eleghị anya n’ógbè Mahaneim. E meriri ndị agha Absalọm, “ntigbu ukwu wee dị n’ebe ahụ n’ụbọchị ahụ.” N’agbanyeghị na Absalọm gbalịrị ịgbapụ, ọ nwụkwara.—2 Samuel 18:7-15.
Devid ghọghachiri nanị eze e nwere n’Izrel. Ọ dịghịkwa mgbe ndị ha na ya so gbara ọsọ ọzọ. Ọzọkwa, otú ha si kwado Devid mere ka ọ kwanyere ha ùgwù ma kelee ha.
Mgbe Devid chọrọ ịlaghachi Jeruselem, “Bazilaị, bụ́ onye Gilied, wee si na Rogelim rịda; o wee soro eze gabiga Jọdan, izilaga ya n’ofe Jọdan.” Mgbe ha na-aga n’ụzọ, Devid gwara Bazilaị bụ́ onye merela agadi, sị: “Gị onwe gị soro m gabiga, m ga-azụkwa gị n’ebe m nọ na Jeruselem.”—2 Samuel 19:15, 31, 33.
O doro anya na Devid nwere ekele dị ukwuu maka aka Bazilaị nyeere ya. O yighị ka eze ahụ ọ̀ chọrọ nanị ịkwụghachi ya ụgwọ ihe ọma o meere ya site n’igboro ya mkpa ihe onwunwe. Enyemaka dị otú ahụ adịghị Bazilaị bara ọgaranya mkpa. O nwere ike ịbụ na Devid chọrọ ka ọ bịa biri n’obí ya n’ihi àgwà ọma agadi nwoke a nwere. Bazilaị ibi n’obí eze gaara eme ka a na-asọpụrụ ya, mee ka o nweta ihe ùgwù nke ịbụ enyi eze.
Ịdị Umeala n’Obi na Ile Ihe Anya Otú Ọ Dị
Bazilaị zaghachiri Eze Devid, sị: “Ụbọchị afọ nke ndụ m dị ole, m ga-eji soro eze rịgoruo Jeruselem? [Afọ iri asatọ] ka m gbara taa: m̀ ga-amara ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ? Ohu gị [ọ̀] ga-amata ụtọ ihe m na-eri ma ọ bụ nke m na-aṅụ? M̀ ga-ege ntị ọzọ n’olu ndị ikom na-abụ abụ na ndị inyom na-abụ abụ?” (2 Samuel 19:34, 35) Ọ bụ otú a ka Bazilaị si jiri nkwanye ugwu jụ iso ya gaa ma jụ ihe ùgwù ahụ magburu onwe ya. N’ihi gịnịkwanụ?
Otu ihe mere Bazilaị ji mee mkpebi ahụ o mere nwere ike ịbụ agadi o merela na nsogbu ndị ya na ime agadi na-eso. Bazilaị nwere ike iche na ya agakwaghị adị ndụ ruo ogologo oge. (Abụ Ọma 90:10) O meela ihe o nwere ike ime iji kwado Devid, ma ọ maara adịghị ike ndị ime agadi mere ka o nwee. Bazilaị ekweghị ka agụụ ịghọ onye a na-akwanyere ùgwù na onye a ma ama mee ka ọ ghara ịma ihe ndị ọ na-agaghị emeli. N’adịghị ka Absalọm, Bazilaị ji amamihe gosi na ọ maara ihe ọ na-agaghị emeli.—Ilu 11:2.
Ihe ọzọ nwere ike ịbụ ihe mere Bazilaị ji mee mkpebi dị otú ahụ bụ na ọ chọghị ka adịghị ike ya gbochie ọrụ eze ahụ Chineke họpụtara nwere ịrụ. Bazilaị jụrụ, sị: “N’ihi gịnịkwa ka ohu gị ga-abụrụ onyenwe m, bụ́ eze ibu ọzọ?” (2 Samuel 19:35) N’agbanyeghị na Bazilaị ka kwadokwara Devid, o yiri ka ò chere na nwa okorobịa ga-enwe ike ịrụ ọrụ nke ọma karịa ya. Ọ ga-abụ na Bazilaị na-ekwu banyere nwa ya nwoke mgbe ọ sịrị: “Lee, ohu gị, bụ́ Kimham; ya soro onyenwe m, bụ́ eze, gabiga; gị mekwaara ya ihe dị mma n’anya gị.” Kama Devid iwe iwe, ọ nabatara ihe ọ gwara ya. Tupu Devid agafee Jọdan, o ‘sutụrụ Bazilaị ọnụ, gọzie ya.’—2 Samuel 19:37-39.
Ọ Chọrọ Ezi Uche
Akụkọ banyere Bazilaị na-egosi na anyị kwesịrị ịma ebe ike anyị ruru. N’aka nke ọzọ, anyị ekwesịghị ịjụ ihe ùgwù ije ozi ndị anyị pụrụ inweta ma ọ bụ ghara ime mgbalị iru eru maka ihe ùgwù ije ozi ndị ahụ n’ihi na anyị achọghị inye onwe anyị nsogbu ma ọ bụ chee na anyị erughị eru maka ozi ndị ahụ. Chineke pụrụ inyere anyị aka n’ebe anyị na-adịghị ike ma ọ bụrụ na anyị adabere n’ebe ọ nọ maka ike na amamihe.—Ndị Filipaị 4:13; Jems 4:17; 1 Pita 4:11.
N’aka nke ọzọ, anyị kwesịrị ịmata ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Dị ka ihe atụ, eleghị anya otu Onye Kraịst nwere ọtụtụ ihe ọ na-arụ n’ọgbakọ. Ya aghọtakwa na ịnara ihe ùgwù ndị ọzọ ga-eme ka ya leghara ọrụ ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ nyere ya, dị ka igboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, anya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ́ gaghị abụ ya ịma ihe ọ na-agaghị emeli na inwe ezi uche ịjụgodị ihe ùgwù ndị ọzọ?—Ndị Filipaị 4:5; 1 Timoti 5:8.
Bazilaị setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya, anyị kwesịkwara ichebara ya echiche. O kwesịrị ntụkwasị obi, nwee obi ike, bụrụ onye na-emesapụ aka, na onye dị umeala n’obi. N’ihe nile, Bazilaị kpebisiri ike ibute ihe nke Chineke ụzọ tupu nke ya.—Matiu 6:33.
[Map dị na peeji nke 15]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Bazilaị bụ́ onye dị afọ iri asatọ mere njem na-agwụ ike iji nyere Devid aka
GILIED
Rogelim
Sukọt
Mahaneim
Osimiri Jọdan
Gilgal
Jeriko
Jeruselem
IFREM
[Foto dị na peeji nke 13]
Gịnị mere Bazilaị ji jụ iso Devid?