Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 7/15 p. 27-31
  • Iji Ntachi Obi Na-eche Ụbọchị Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ntachi Obi Na-eche Ụbọchị Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọrịa Emebeghị Ka Ha Kwụsị
  • Idi Ọnwụ nke Onye Ị Hụrụ n’Anya
  • Ịtachi Obi n’Ule Dị Iche Iche
  • I Nwere Ike Ịtachi Obi!
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Na-anọ Nzukọ Jehova Nso
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Chesie Echiche Ike Banyere Onye Ahụ nke Tachiri Obi
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 7/15 p. 27-31

Iji Ntachi Obi Na-eche Ụbọchị Jehova

‘Tụkwasịnụ ntachi obi n’okwukwe unu.’—2 PITA 1:5, 6.

1, 2. Gịnị bụ ntachi obi, oleekwa ihe mere o ji dị Ndị Kraịst mkpa?

OKÉ ụbọchị Jehova dị ezigbo nso. (Joel 1:15; Zefanaịa 1:14) Dị ka Ndị Kraịst kpebisiri ike ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke, anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe a ga-ewepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta. Ka ọ dịgodị, a na-akpọ anyị asị, na-akwa anyị emo, na-akpagbu anyị, ma na-egbu anyị maka okwukwe anyị. (Matiu 5:10-12; 10:22; Mkpughe 2:10) Nke a chọrọ anyị ntachi obi n’aka—nke bụ́ inwe ike idi ihe isi ike. Pita onyeozi gbara anyị ume, sị: ‘Tụkwasịnụ ntachi obi n’okwukwe unu.’ (2 Pita 1:5, 6) Ntachi obi dị anyị mkpa, n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.

2 Anyị na-arịakwa ọrịa, mmadụ na-anwụnahụ anyị, a na-elekwa anyị ule n’ụzọ ndị ọzọ. Lee ka Setan ga-esi nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na okwukwe anyị anyụọ ọkụ! (Luk 22:31, 32) Anyị nwere ike ịtachi obi mgbe a na-ele anyị ule dị iche iche site n’enyemaka Jehova. (1 Pita 5:6-11) Ka anyị tụlee akụkọ ụfọdụ mere eme na-egosi na anyị nwere ike iji ntachi obi na okwukwe siri ike na-eche ụbọchị Jehova.

Ọrịa Emebeghị Ka Ha Kwụsị

3, 4. Nye ihe atụ iji gosi na anyị nwere ike iji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ọrịa.

3 Chineke anaghị agwọ anyị n’ụzọ ọrụ ebube ugbu a, ma ọ na-enye anyị obi ike iji die ọrịa. (Abụ Ọma 41:1-3) Sharon kwuru, sị: “Kemgbe m maara ihe, ọ bụ n’oche nkwagharị ka m na-anọ. Kemgbe a mụrụ m, ọrịa ahụ́ mkpọnwụ enyetụbeghị m ohere ịnụ ụtọ ndụ.” Mgbe Sharon matara Jehova na nkwa o kwere ime ka anyị nwee ahụ́ ike zuru okè, ọ bịara nwee olileanya. Ọ bụ ezie na ikwu okwu na ije ije na-ara ya ahụ́, ozi Ndị Kraịst na-enye ya ọṅụ. Ihe dị ka afọ 15 gara aga, o kwuru, sị: “Ọrịa m nwere ike ịnọ na-aka njọ, ma obi m tụkwasịrị Chineke na mmekọrịta mụ na ya na-enye m olileanya. Obi dị m nnọọ ụtọ iso ná ndị Jehova na inweta nkwado ya mgbe nile!”

4 Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka ume ka ha ‘na-agụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:14) Ihe ndị dị ka ihe agaghị otú e chere ya nwere ike ịkpatara mmadụ ịda mbà n’obi. N’afọ 1993, Sharon dere, sị: “Mgbe m chere na ọ dịtụghị uru m bara, adara m . . . nnọọ mbà n’obi ruo afọ atọ. . . . Ndị okenye kasiri m obi ma nye m ndụmọdụ. . . . Jehova ji Ụlọ Nche mee ka m ghọta oké ịda mbà n’obi nke ọma. Ee, ọ na-eche banyere ndị ya ma na-aghọta otú obi dị anyị.” (1 Pita 5:6, 7) Sharon ka ji ikwesi ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi ka ọ na-eche oké ụbọchị Jehova.

5. Olee ihe na-egosi na Ndị Kraịst nwere ike idi oké nchegbu?

5 Ụfọdụ Ndị Kraịst na-echegbu nnọọ onwe ha n’ihi ihe ndị ha gabigara n’oge gara aga. Harley hụrụ nnukwu ọgụ ndị a lụrụ n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ma na-arọ nrọ ọjọọ banyere agha. Mgbe ọ na-ehi ụra, ọ na-eti mkpu, sị: “Zere isi gị! Lee anya!” Mgbe o tetara, ọsụsọ na-ezu ya ahụ́. Ma, ọ malitere ibi ndụ nke ime uche Chineke, ka oge na-agakwa, ọ nakwaghị arọkarị ụdị nrọ ndị ahụ.

6. Olee otú otu Onye Kraịst si nagide ọrịa uche?

6 O siiri nnọọ otu Onye Kraịst dọkịta gwara na o nwetụrụ ọrịa isi mgbaka ike ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ma ọ nọgidere na-aga ozi ọma, n’ihi na ọ maara na ozi ahụ ga-enye ya na ndị nabatara ya ndụ. (1 Timoti 4:16) Mgbe ụfọdụ, ọ naghị ekwe ya omume ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ụlọ ndị mmadụ, ma o kwuru, sị: “Ka oge ụfọdụ gasịrị, ana m enwezi ike ịchịkwa onwe m, gaa n’ụlọ ọzọ, nwaakwa ịkụ aka n’ọnụ ụzọ. Site n’ịnọgide na-aga ozi ọma, mmekọrịta mụ na Chineke nọgidere na-esi ike.” Ịga ọmụmụ ihe siiri nwanna a ike, ma ọ maara nnọọ uru ya na ụmụnna ya ịkpakọ baara ya. N’ihi ya, o mere ihe ọ bụla ọ chọrọ ya n’aka iji na-agachi ọmụmụ ihe anya.—Ndị Hibru 10:24, 25.

7. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ ikwu okwu n’ihu ọha ma ọ bụ ịga ọmụmụ ihe, olee otú ha si na-atachi obi?

7 Ụfọdụ Ndị Kraịst na-atụ ihe ụfọdụ oké egwu. Dị ka ihe atụ, ụjọ ikwu okwu n’ihu ọha na ọbụna ịga ọmụmụ ihe nwere ike ịdị na-atụ ha. Chetụdị echiche otú ọ ga-esi na-esiri ha ike ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ma ọ bụ ime ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke! N’agbanyeghị nke ahụ, ha na-atachi obi, ọbịbịa ha na-abịakwa ma na-ekere òkè n’ọmụmụ ihe na-eme anyị nnọọ obi ụtọ.

8. Olee ihe kasị enye aka mgbe mmadụ na-enwe nchegbu?

8 Izukwu ike na ihikwu ụra nwere ike inyere onye na-enwe nchegbu aka ịtachi obi. O nwekwara ike ịdị mkpa ka onye ahụ jee hụ dọkịta. Ma, ihe kasị enye aka bụ ịdabere na Chineke site n’ikpegara ya ekpere. Abụ Ọma 55:22 kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị: Ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” N’ihi ya, mee ihe nile i nwere ike ime iji “tụkwasị Jehova obi gị nile.”—Ilu 3:5, 6.

Idi Ọnwụ nke Onye Ị Hụrụ n’Anya

9-11. (a) Olee ihe nwere ike inyere anyị aka idi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya? (b) Olee otú ihe nlereanya Ana nwere ike isi nyere anyị aka idi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya?

9 Mgbe ọnwụ gburu mmadụ n’ezinụlọ, mfu ahụ nwere ike ịkpata oké iru uju. Ebreham bere ákwá mgbe nwunye ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Sera, nwụrụ. (Jenesis 23:2) Ọbụna “anya mmiri gbara” nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jizọs mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. (Jọn 11:35) N’ihi ya, o nweghị ihe dị njọ ma obi jọọ gị njọ mgbe ọnwụ gburu onye ị hụrụ n’anya. Ma, Ndị Kraịst maara na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ. (Ọrụ 24:15) N’ihi ya, ha anaghị ‘eru uju dị nnọọ ka ndị ọzọ si eru, bụ́ ndị na-enweghị olileanya.’—1 Ndị Tesalonaịka 4:13.

10 Olee otú anyị nwere ike isi die ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya? Ikekwe, ihe atụ a pụrụ inyere anyị aka. Anyị anakarịghị enwe oké mwute mgbe enyi anyị mere njem gaa ebe dị anya n’ihi na anyị na-atụ anya ịhụ ya ọzọ mgbe ọ lọtara. Ile ọnwụ nke Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi anya otú ahụ nwere ike ibelata uju anyị na-eru ebe anyị maara na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.—Eklisiastis 7:1.

11 Ịdabere kpamkpam na “Chineke nke nkasi obi nile” ga-enyere anyị aka idi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya. (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Ihe ọzọ ga-enyere anyị aka bụ iche echiche banyere ihe Ana bụ́ nwanyị di ya nwụrụ nke dịrị ndụ na narị afọ mbụ mere. Di ya nwụrụ mgbe ha lụsịrị ruo nanị afọ asaa. Ma mgbe ọ dị afọ 84, ọ ka na-ejere Jehova ozi dị nsọ n’ụlọ nsọ ya. (Luk 2:36-38) O doro anya na ndụ dị otú ahụ nke ijere Chineke ozi nyeere ya aka idi iru uju na owu ọmụma. Ịrụchi ọrụ Ndị Kraịst anya, nke gụnyere ikwusa banyere Alaeze ahụ, nwere ike inyere anyị aka idi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya.

Ịtachi Obi n’Ule Dị Iche Iche

12. Olee ụdị ule ndị sitere n’ezinụlọ bụ́ ndị ụfọdụ Ndị Kraịst dirila?

12 Ụfọdụ Ndị Kraịst aghaghị ịtachi obi n’ihi ule ndị na-esite n’ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye mmadụ akwaa iko, lee ka o nwere ike isi gbawaa onye ahụ obi! N’ihi ihe mgbu na mwute onye ahụ di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko na-enwe, ụra nwere ike ghara ikwe ya ohihi, o nwekwara ike ịdị na-ebe nnọọ ákwá. Ịrụ obere ọrụ nwere ike ịdị na-esiri ya ike nke na ọ ga na-emejọ ihe ma ọ bụ merụọ ahụ́. Onye ahụ di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko nwere ike nri agaghị ekwe ya oriri, o nwere ike taa ahụ́, isi nwekwara ike ịdị na-agba ya gharaghara. O nwere ike isiri ya ike ịrụ ọrụ Ndị Kraịst. Leekwa otú ihe dị otú ahụ nwere ike isi kpaa ụmụ ha aka ọjọọ!

13, 14. (a) Olee otú ekpere ahụ Solomọn kpere n’oge nraranye nke ụlọ nsọ ahụ si agba gị ume? (b) Olee ihe mere anyị ji ekpe ekpere maka mmụọ nsọ?

13 Mgbe anyị nwetara ụdị ule ndị ahụ, Jehova na-enyere anyị aka n’ebe ọ dị anyị mkpa. (Abụ Ọma 94:19) Ekpere Eze Solomọn kpere n’oge nraranye nke ụlọ nsọ Jehova gosiri na Chineke na-anụ ekpere nke ndị ya. Solomọn kpegaara Chineke ekpere, sị: “Ekpere ọ bụla, arịrịọ ọ bụla, nke ga-adịrị mmadụ ọ bụla, ma ọ bụ nke ga-adịrị ndị Gị nile, bụ́ Izrel, ndị ga-amara, nwoke ọ bụla ihe otiti nke obi ya, o wee gbasaa ọbụ aka ya abụọ n’ebe ụlọ a dị: Gị onwe gị nụrụkwa n’eluigwe, bụ́ ọnọdụ obibi Gị guzosiri ike, gbaghara, meekwa, nye nwoke ọ bụla dị ka ụzọ ya nile si dị, onye Ị maara obi ya; (n’ihi na Gị onwe gị amawo obi ụmụ mmadụ nile, nanị Gị;) ka ha wee tụọ egwu Gị n’ụbọchị nile nke ha onwe ha na-ebi n’elu ala ahụ nke I nyere nna anyị hà.”—1 Ndị Eze 8:38-40.

14 Ọ ga-enye nnọọ aka ma ọ bụrụ na ị nọgide na-ekpe ekpere maka mmụọ nsọ. (Matiu 7:7-11) Mkpụrụ nke mmụọ nsọ gụnyere àgwà ndị dị ka ọṅụ na udo. (Ndị Galeshia 5:22, 23) Obi na-eru anyị nnọọ ala mgbe Nna anyị nke eluigwe zara ekpere anyị—ọṅụ anọchie iru uju, udo anọchiekwa obi erughị ala!

15. Olee amaokwu Bible ndị pụrụ inyere anyị aka ịkwụsị ichegbu onwe anyị?

15 Anyị ga-atụ anya inwetụ obi erughị ala mgbe anyị nwere ihe ụfọdụ na-echegbu anyị. Ma anyị nwere nnọọ ike ibelata nchegbu anyị ma ọ bụrụ na anyị eburu okwu ndị a Jizọs kwuru n’obi: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi. ... Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume [Chineke], a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.” (Matiu 6:25, 33, 34) Pita onyeozi gbara anyị ume ka anyị ‘na-atụkwasị nchegbu nile anyị n’ebe Chineke nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere anyị.’ (1 Pita 5:6, 7) Ọ dị mma ịgba mbọ ime ihe banyere nsogbu anyị. Ma, mgbe anyị merela ihe nile anyị nwere ike ime, anyị ekwesịghị ichegbuwe onwe anyị karịa ikpewe ekpere. Ọbụ abụ bụrụ, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ́; tụkwasịkwa Ya obi, Ya onwe ya ga-emekwa ya.”—Abụ Ọma 37:5.

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-apụghị iji gbanahụ nchegbu nile? (b) Gịnị ka anyị ga-enweta ma anyị tinye ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:6, 7 n’ọrụ?

16 Pọl dere, sị: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị mgbe ụmụ na-ezughị okè nke Adam ga-akwụsị inwe nchegbu kpamkpam. (Ndị Rom 5:12) Ụmụ nwanyị Het Ịsọ lụrụ ghọọrọ nne na nna Ịsọ bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke, bụ́ Aịzik na Ribeka, “ihe mmụọ ilu.” (Jenesis 26:34, 35) Ọ ghaghị ịbụ na ọrịa kpataara Ndị Kraịst dị ka Timoti na Trọfimọs nchegbu. (1 Timoti 5:23; 2 Timoti 4:20) Pọl chegburu onwe ya maka ndị kwere ekwe ibe ya. (2 Ndị Kọrint 11:28) Ma “Onye na-anụ ekpere” na-adị njikere mgbe nile inyere ndị hụrụ ya n’anya aka.—Abụ Ọma 65:2.

17 Ka anyị na-eche ụbọchị Jehova, “Chineke nke udo” na-akwado anyị ma na-akasi anyị obi. (Ndị Filipaị 4:9) Jehova bụ onye “nwere obi ebere, Onye na-eme amara,” ọ dị “mma, [Ọ] bụkwa onye na-agbaghara mmehie,” ‘Ọ na-echetakwa na anyị bụ ájá.’ (Ọpụpụ 34:6; Abụ Ọma 86:5; 103:13, 14) N’ihi ya, ka anyị ‘rịọ ya arịrịọ,’ n’ihi na nke ahụ ga-eme ka anyị nweta “udo nke Chineke”—obi iru ala nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịghọta.

18. Dị ka Job 42:5 si kwuo, olee otú anyị nwere ike isi ‘hụ’ Chineke?

18 Mgbe a zara ekpere anyị, anyị na-amata na Chineke nọnyeere anyị. Mgbe Job disịrị ule ya, o kwuru, sị: “Site n’ọnụnụ ntị ka m nụrụ Gị [Jehova]; ma ugbu a anya m ahụwo Gị.” (Job 42:5) Anyị nwere ike iji anya nke nghọta, nke okwukwe, na nke ekele tụgharịa uche n’otú Chineke si mesoo anyị ihe ma ‘hụ’ ya otú anyị na-ahụtụbeghị ya mbụ. Anyị ịnọkwu Jehova nso otú ahụ pụrụ nnọọ ime ka obi ruo anyị ala!

19. Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ‘atụkwasị Jehova nchegbu anyị nile’?

19 Ọ bụrụ na anyị ‘atụkwasị Jehova nchegbu anyị nile,’ anyị pụrụ idi ule ma nwee udo nke obi nke na-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche. N’ime ime obi ihe atụ anyị, anyị agaghị enwe ihe ọ bụla dị ka ahụ́ erughị ala, ụjọ, ma ọ bụ obi mmapụ. Nchegbu agaghị na-akpaghasị anyị uche.

20, 21. (a) Olee ụdị udo akụkọ Stivin na-egosi na mmadụ nwere ike inwe mgbe a na-akpagbu ya? (b) Kọọ ihe atụ e nwere n’oge a nke onye nwere udo mgbe ọ na-edi ule.

20 Stivin onye na-eso ụzọ nwere udo mgbe ọ na-edi ule siri ike e lere okwukwe ya. Tupu ya agbaa àmà ikpeazụ ya, ndị nile nọ na Sanhedrin “hụrụ na ihu ya dị ka ihu mmụọ ozi.” (Ọrụ 6:15) Ihu ya gbasapụrụ nnọọ agbasapụ—dị ka nke mmụọ ozi, onye ozi Chineke. Mgbe Stivin gbasịrị ndị ikpe ahụ n’anwụ na aka ha dị n’ọnwụ Jizọs, “[ọ dụrụ] ha adụ n’obi ha, ha wee malite ịta ikikere ezé megide ya.” Ka Stivin “jupụtara na mmụọ nsọ,” o “legidere anya n’ime eluigwe ma hụ ebube Chineke, hụkwa Jizọs ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.” Ọhụụ ahụ nyere Stivin ike ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. (Ọrụ 7:52-60) Ọ bụ ezie na anyị anaghị ahụ ọhụụ, anyị nwere ike inweta udo nke Chineke mgbe a na-akpagbu anyị.

21 Tụlee ihe ụfọdụ Ndị Kraịst ndị Nazi gburu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ kwuru. Mgbe otu n’ime ha na-akọ banyere ikpe e kpere ya n’ụlọikpe, o kwuru, sị: “E nyewo iwu ka e gbuo m. Egere m nnọọ ntị nke ọma, mgbe ahụ, mgbe m kwusịrị okwu ahụ bụ́, ‘Nọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ’ na okwu ole na ole ndị ọzọ nke Onyenwe anyị kwuru, okwu wee gwụ. Ma unu echegbula onwe unu maka nke ahụ ugbu a. Enwere m udo dị otú a, obi iru ala dị otú a, nke unu na-apụghị iche n’echiche!” Otu nwa okorobịa bụ́ Onye Kraịst nke a mara ikpe igbupụ ya isi degaara ndị mụrụ ya akwụkwọ ozi, sị: “Ọ gafeela etiti abalị ugbu a. Aka m nwekwara ohere ịgbanwe obi m. Aa! àpụrụ m inwe obi ụtọ ọzọ n’ụwa nke a ma ọ bụrụ na m gọnarị Onyenwe anyị? Ọ dịghị ma ọlị! Ma ugbu a unu ga-enwe obi ike na ana m ahapụ ụwa nke a n’obi ụtọ na n’udo.” O doro anya na Jehova na-akwado ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi.

I Nwere Ike Ịtachi Obi!

22, 23. Olee ihe ị pụrụ ijide n’aka ka i ji ntachi obi na-eche ụbọchị Jehova?

22 O nwere ike ị gaghị enweta ụdị ihe isi ike ndị anyị tụlerela. N’agbanyeghị nke ahụ, nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Job kwuru eziokwu mgbe o kwuru, sị: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ.” (Job 14:1) Ikekwe ị bụ nne ma ọ bụ nna nke na-agba mbọ iji Bible eduzi ụmụ gị. Ha aghaghị idi ule n’ụlọ akwụkwọ, ma lee otú obi na-esi atọ gị ụtọ mgbe ha guzosiri ike n’akụkụ Jehova ma nọgide na-agbaso ụkpụrụ ezi omume! O nwere ike ịbụ na ị na-enwe ihe isi ike ma ọ bụ ọnwụnwa n’ebe ọrụ gị. Ma, i nwere ike idi ọnọdụ ndị a na ndị ọzọ n’ihi na ‘Jehova na-eburu gị ibu gị kwa ụbọchị.’—Abụ Ọma 68:19.

23 I nwere ike iche na ọ dịghị onye maara gị, ma, buru n’obi na Jehova enweghị ike ichefu ọrụ gị na ịhụnanya ị na-egosipụta maka aha nsọ ya. (Ndị Hibru 6:10) Jehova nwere ike inyere gị aka ịtachi obi mgbe a na-ele okwukwe gị ule. N’ihi ya, na-etinye ime uche Chineke n’ekpere na n’atụmatụ gị. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, ị ga-eji n’aka na Chineke ga na-agọzi gị ma na-akwado gị ka i ji ntachi obi na-eche ụbọchị Jehova.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ihe mere ntachi obi ji dị Ndị Kraịst mkpa?

• Olee ihe nwere ike inyere anyị aka ịtachi obi mgbe anyị na-arịa ọrịa na mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị?

• Olee otú ekpere si enyere anyị aka ịtachi obi mgbe a na-ele anyị ule?

• Olee ihe mere ọ ga-eji kwe omume iji ntachi obi na-eche ụbọchị Jehova?

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịdabere na Jehova na-enyere anyị aka idi ọnwụ nke onye anyị hụrụ n’anya

[Foto dị na peeji nke 31]

Isi n’ala ala obi anyị ekpe ekpere na-enyere anyị aka ịtachi obi mgbe a na-ele okwukwe anyị ule

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya