Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 1/1 p. 3
  • Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbanwe Ndị Magburu Onwe Ha A Ga-eme n’Ụlọ Nche!
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ị̀ Na-eji Ya Eme Ihe n’Ụzọ Zuru Ezu?
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Ụlọ Nche Ọhụrụ A Na-amụ Amụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
    Teta!—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 1/1 p. 3

Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

OBI dị anyị ụtọ ịgwa gị na anyị ga-agbanwetụ otú Ụlọ Nche na-adị malite na nke a i ji n’aka. Tupu anyị ekwuo ihe ndị a ga-agbanwe, ka anyị kwuo ihe ndị a na-agaghị agbanwe.

Magazin a ka bụ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. N’ihi ya, Ụlọ Nche ka ga na-enye Jehova, bụ́ ezi Chineke, otuto, jirikwa ozi ọma nke Alaeze Chineke na-akasị ndị na-agụ ya obi. Isiokwu ndị dị na peeji nke ise ruo na nke itoolu na magazin a i ji n’aka kwuru ihe Alaeze ahụ bụ na mgbe ọ ga-abịa. Ụlọ Nche ka ga na-eme ka ndị na-agụ ya nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, na-akwado eziokwu dị na Baịbụl, jirikwa amụma Baịbụl na-akọwa ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara, dị ka ọ na-eme kemgbe ọtụtụ iri afọ.

Gịnịzi ka a ga-agbanwe na ya? Ka anyị kwuo ihe ụfọdụ na-akpali mmasị ndị ga na-apụta n’Ụlọ Nche nke abalị mbụ n’ọnwa ọ bụla.a

Kwa ọnwa, a ga-ebipụta ọtụtụ isiokwu ndị ga-akpali ndị mmadụ iche echiche. A ga na-akọ akụkọ dị ụtọ n’isiokwu bụ́ “Ị̀ Maara?” Akụkọ ndị a ga-eme ka a ghọtakwuo akụkọ Baịbụl ndị a ga-ebipụta na ya. Isiokwu bụ́ “Bịaruo Chineke Nso” ga na-atụle ihe a kapịrị ọnụ ndị anyị nwere ike ịmụta banyere Jehova n’ebe dị iche iche na Baịbụl. Isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Jụrụ” ga na-aza ajụjụ dị iche iche metụtara ihe ndị dị na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-ajụ, sị, “Alaeze Chineke ọ̀ dị n’ime obi gị?” Ị ga-ahụ azịza ya na peeji nke iri na atọ.

A ga-enwe isiokwu ndị a ga na-ebipụta mgbe mgbe bụ́ ndị ga-abara ezinụlọ dị iche iche uru. A ga na-ebipụta isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ” ugboro anọ n’afọ. Isiokwu a ga na-ekwu nsogbu ndị a na-enwekarị n’ezinụlọ, gosikwa otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka dozie nsogbu ndị ahụ. Isiokwu bụ́ “Kụziere Ụmụ Gị Ihe,” nke ndị mụrụ ụmụ ga na-agụrụ ụmụ ha, ga na-apụta otu ugboro n’ọnwa abụọ. Isiokwu ọzọ a ga-ebipụta n’ọnwa ọ bụla a na-ebipụtaghị “Kụziere Ụmụ Gị Ihe” ga-abụ isiokwu bụ́ “Maka Ndị Na-eto Eto.” Ọ ga na-edepụtara ndị na-eto eto ihe ndị ha ga-eji na-amụ Baịbụl.

E nwekwara isiokwu ole na ole ndị ọzọ a ga na-ebipụta ugboro anọ n’afọ. Isiokwu bụ́ “Ṅomie Okwukwe Ha” ga na-agba anyị ume iso ihe nlereanya nke ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl setịpụrụ. Dị ka ihe atụ, na peeji nke iri na asatọ ruo na peeji nke iri abụọ na otu n’Ụlọ Nche a, ị ga-agụ akụkọ na-akpali mmasị a kọrọ banyere Ịlaịja, hụkwa otú anyị nwere ike isi ṅomie okwukwe ya. Isiokwu bụ́ “Akwụkwọ Ozi Si n’Aka . . . ” ga na-akọ akụkọ ndị ozi ala ọzọ kọrọ nakwa nke ndị ọzọ nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa. Isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs” ga na-eleba anya n’ihe ndị dị oké mkpa a kụziri na Baịbụl. Nke a ga na-apụta n’ụzọ dị mfe nghọta.

Anyị nwere obi ike na Ụlọ Nche ga-anọgide na-amasị ndị na-agụ ya bụ́ ndị na-ege ntị n’ihe Baịbụl kwuru ma chọọ ịma ihe ọ na-akụzi n’ezie. Anyị nwere olileanya na magazin a ga-enyere gị aka ka ị mụta eziokwu na-agụ gị agụụ nke dị na Baịbụl.

NDỊ BIPỤTARA YA

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A ga na-ebipụta Ụlọ Nche abụọ n’ọnwa ọ bụla. A ga na-ebipụta nke abalị mbụ n’ọnwa maka ọhaneze. Ụlọ Nche nke abalị iri na ise n’ọnwa ọ bụla ga-abụ nke Ndịàmà Jehova ga-eji na-amụ ihe n’ọgbakọ ha. Ọhaneze nwekwara ike ịbịa ọmụmụ ihe ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya