Mgbanwe Ndị Magburu Onwe Ha A Ga-eme n’Ụlọ Nche!
1 Ná mmalite afọ a, e nwere ọkwa na-enye obi ụtọ a maara ọgbakọ nile. N’ọkwa ahụ, e kwuru na malite na January 2008, a ga na-ebipụtazi Ụlọ Nche n’ụdị abụọ, otu ga-abụ maka ọhaneze ebe nke ọzọ ga-abụ maka anyị! Ma, o nwere ike ịbụ na ị nọ kemgbe ahụ na-eche, sị: ‘Olee otú otu ga-esi dị iche n’ibe ya? Olee uru ọ ga-aba inwe mbipụta abụọ dịgasị iche? È nwere ihe ọhụrụ ndị anyị ga-atụ anya ịhụ na ha?’
2 Otú Otu Ga-esi Dị Iche n’Ibe Ya: Mbipụta nke mbụ ga-abụ maka ọhaneze. Isiokwu ndị a ga na-ebipụta na ya ga-abụ maka ọhaneze. Mbipụta nke abụọ ga-abụ nke a na-amụ amụ, a gaghịkwa ekesara ya ọhaneze. Ọ ga-enwe isiokwu nile a ga-amụ n’ọgbakọ maka otu ọnwa nakwa isiokwu ndị ọzọ kwesịrị Ndị Kraịst raara onwe ha nye Jehova. Ụlọ Nche nke ọhaneze agaghị abụcha maka Ndịàmà, kama ọ ga-abụ kpọmkwem maka ndị na-abụghị Ndịàmà, bụ́ ndị ga-achọ ịmụta ihe Bible na-akụzi. A bịa n’ihe banyere Teta!, a ka ga na-ede isiokwu ndị metụtara ndị mmadụ n’ozuzu, gụnyere ndị na-arụ eziokwu ụka na ndị na-asị na ha abụghị Ndị Kraịst.
3 Uru Ndị Ọ Ga-aba: Ná mbipụta nke a na-amụ amụ, ọ gaghịzi adị mkpa ịkọwawa okwu ndị dị ka “ọsụ ụzọ” ka ndị na-abụghị Ndịàmà wee nwee ike ịghọta ya. E nwekwara ike ide ihe ndị a chọrọ ka Ndịàmà Jehova na ndị a na-amụrụ Bible na-enwe ọganihu mara. Oleekwanụ maka nke ọhaneze? Ebe ọ bụ na a ga-akwadebe isiokwu ndị ga-adị na ya maka ọhaneze, ọ ga-adị onye na-abụghị Onyeàmà ụtọ ịgụchapụ magazin ahụ. Ma, Onyeàmà Jehova ọ bụla ga-eritekwa uru site n’ịgụ magazin abụọ ahụ. Ebe ọ bụ na anyị ga na-enyefe nanị otu Ụlọ Nche na otu Teta! n’ozi ubi kwa ọnwa, anyị ga-eji otu ọnwa zuru ezu chepụta ụzọ ndị ga-arụpụta ihe isi nyefee ha.
4 Ihe Ọhụrụ Ndị Ga-adị na Ya: E nwere ihe ọhụrụ ndị magburu onwe ha a ga-ewebata n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. Otu n’ime ha ga-akọwa ozizi Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ga-adị nnọọ mfe nghọta. Nke ọzọ ga-egosi otú Bible nwere ike isi nyere ezinụlọ dị iche iche aka. A ga-akwadebe isiokwu ndị na-eto eto ga-eji na-amụ Bible. Mbipụta nke ọ bụla ga-enwe isiokwu na-akọwa akụkụ Bible ndị na-akụziri anyị banyere Jehova na àgwà ya.
5 Ekpere anyị bụ ka Jehova gọzie usoro ọhụrụ a anyị ga-eji na-ebipụta Ụlọ Nche. Ka Ụlọ Nche na Teta! mee ka ozi ọma rutekwuo ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu.—Mat. 10:11.