Bịaruo Chineke Nso
Onye Ọzụzụ Atụrụ nke Hụrụ Gị n’Anya
‘CHINEKE ọ̀ hụrụ m n’anya?’ Ọ bụrụ na ị jụtụla onwe gị ajụjụ a, mara na ọ bụghị naanị gị jụtụrụla ya. Ọtụtụ n’ime anyị atawo ahụhụ, nweekwa ihe isi ike dị iche iche. Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike ichewe ma Onye kere eluigwe na ụwa ọ̀ na-ahụkwa ihe na-emenụ. Anyị kwesịrị ịmara azịza nke ajụjụ bụ́, Jehova bụ́ Chineke ọ̀ hụrụ anyị n’anya n’otu n’otu? Mgbe Jizọs, bụ́ onye kacha onye ọ bụla mara onye Jehova bụ, nọ n’ụwa, o mere ihe atụ nke zara ajụjụ ahụ n’ụzọ na-enye obi ụtọ.
Jizọs ji otú onye ọzụzụ atụrụ si elekọta ìgwè atụrụ ya mee ihe atụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị atụrụ ma otu n’ime ha akpafuo, ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu ahụ n’elu ugwu wee gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu? Ọ bụrụ na ọ chọta ya, n’ezie, ana m asị unu, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu. N’otu aka ahụ, ọ dịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.” (Matiu 18:12-14) Ka anyị hụ otú Jizọs si kọwaa otú Jehova si hụ onye ọ bụla n’ime ndị na-efe Ya n’anya.
Onye ọzụzụ atụrụ ahụ weere ya na ọ bụ ọrụ dịịrị ya ilekọta atụrụ ya nke ọ bụla. Ọ bụrụ na e nwere atụrụ ya kpafuru akpafu, ọ ga-ama nke ọ bụ. Ọ ma atụrụ nke ọ bụla, marakwa aha ọ gụrụ nke ọ bụla n’ime ha. (Jọn 10:3) Onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke hụrụ atụrụ ya n’anya ezughị ike ruo mgbe ọ chọtara nke ahụ kpafuru akpafu. O tinyeghị ndụ atụrụ iri itoolu na itoolu ahụ n’ihe ize ndụ mgbe ọ hapụrụ ha gawa ịchọ otu ahụ kpafuru akpafu. Ọtụtụ mgbe, ndị na-azụ atụrụ na-anọkọ ọnụ, nke a na-eme ka ìgwè atụrụ ha na nke ndị ibe ha nọkọta ọnụ.a Ya mere, ọ ga-abụ na onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke gawara ịchọ atụrụ ya kpafuru akpafu hapụụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ibe ya ìgwè atụrụ ya ruo mgbe ọ lọtara. Mgbe onye ọzụzụ atụrụ ahụ chọtara atụrụ ahụ furu efu wee hụ na o nweghị ihe mere ya, obi tọrọ ya ụtọ. O buuru atụrụ ahụ ụjọ ji n’ubu bulata n’ebe ahụ ìgwè atụrụ ya nọ, bụ́ ebe ọ na-enweghị ihe ga-eme ya.—Luk 15:5, 6.
Mgbe Jizọs na-akọwa ilu a, ọ sịrị na Chineke achọghị ka “otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.” Jizọs bu ụzọ dọọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ka ha ghara ime ka ‘otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ sụọ ngọngọ.’ (Matiu 18:6) Olee ihe ilu a Jizọs tụrụ na-akụziri anyị banyere Jehova? Ọ na-akụziri anyị na Jehova bụ Onye ọzụzụ atụrụ nke hụrụ atụrụ ya n’anya nke ukwuu, tinyere ‘ndị nke dị nta,’ ya bụ, ndị yiri ndị na-abaghị uru n’anya ụmụ mmadụ. N’ezie, Chineke maara onye nke ọ bụla n’ime ndị na-efe ya, ha bakwara uru n’anya ya.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka o doo gị anya na Chineke hụrụ gị n’anya, ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo banyere Nnukwu Onye Ọzụzụ Atụrụ, bụ́ Jehova Chineke, nakwa otú i nwere ike isi bịaruo ya nso? Ọ bụrụ na i mee otú a, obi ga-esi gị ike dị ka o siri Pita onyeozi, bụ́ onye o yiri ka ò ji ntị ya nụ mgbe Jizọs tụrụ ilu atụrụ ahụ furu efu. Pita mechara dee, sị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:7.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ gaghị esiri onye ọzụzụ atụrụ nke ọ bụla ike iduru ìgwè atụrụ nke ya, n’ihi na atụrụ nke ọ bụla maara olu onye na-azụ ya.—Jọn 10:4.