Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 5/1 p. 24
  • Ihe Na-ewute Anyị Na-emetụ Ya n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Na-ewute Anyị Na-emetụ Ya n’Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ọtụtụ Nde Ndị Nwụrụ Anwụ Ugbu a Ga-adị Ndụ Ọzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Olileanya E Ji n’Aka Maka Ndị Nwụrụ Anwụ
    Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Anya Mmiri Gbara Jizọs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 5/1 p. 24

Bịaruo Chineke Nso

Ihe Na-ewute Anyị Na-emetụ Ya n’Obi

Jọn 11:33-35

“ỌMỊIKO bụ mwute mmadụ na-enwe n’ihi ihe mere onye ọzọ.” Ọ bụ otú a ka otu Onyeàmà Jehova nke na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ si kọwaa àgwà a magburu onwe ya. Jehova bụ́ Chineke bụ onye kacha enwe ọmịiko. Ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụ ya n’ahụ́. Olee otú anyị ga-esi mara na nke ahụ bụ eziokwu? Okwu ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri ụdị ọmịiko Jehova nwere. (Jọn 5:19) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe e dere na Jọn 11:33-35.

Mgbe enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụchuru ọnwụ, Jizọs gara n’obodo Lazarọs. O doro anya na obi gbawara ụmụnne Lazarọs bụ́ Meri na Mata. Jizọs hụrụ ezinụlọ a n’anya nke ukwuu. (Jọn 11:5) Olee ihe ọ ga-eme? Baịbụl sịrị: “Mgbe Jizọs hụrụ [Meri] ka ọ na-akwa ákwá nakwa ka ndị Juu so ya bịa na-akwa ákwá, ọ sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu; o wee sị: ‘Olee ebe unu liri ya?’ Ha sịrị ya: ‘Onyenwe anyị, bịa lee ya.’ Anya mmiri gbara Jizọs.” (Jọn 11:33-35) Gịnị mere Jizọs ji bee ákwá? N’ezie, enyi ya ọ hụrụ n’anya anwụọla. Ma, Jizọs ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’oge na-adịghị anya. (Jọn 11:41-44) Ò nwere ihe ọzọ metụrụ Jizọs n’obi?

Leba amaokwu ndị ahụ anya ọzọ. Ị ga-ahụ na mgbe Jizọs hụrụ Meri na ndị ọzọ so ya ka ha na-akwa ákwá, “ọ sụrụ ude,” “o nyekwara ya nsogbu.” Okwu Grik e si na ya sụgharịa okwu ndị a na-egosi ihe imetụ mmadụ n’obi nke ukwuu.a Ihe Jizọs hụrụ metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Anya mmiri ahụ gbara ya gosiri na nke a bụ eziokwu. O doro anya na ihe wutere ndị ọzọ wutere Jizọs. Ọ̀ dịtụla mgbe ị malitere ịkwa ákwá maka na onye ị hụrụ n’anya na-akwa ákwá?—Ndị Rom 12:15.

Ọmịiko Jizọs na-eme ka anyị ghọta àgwà na ụzọ Nna ya bụ́ Jehova. Cheta na Jizọs kpara àgwà dị ka Nna ya n’ụzọ zuru okè nke na ọ sịrị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) N’ihi ya, mgbe anyị gụrụ na “anya mmiri gbara Jizọs,” anyị ga-enwe obi ike na ihe na-ewute ndị ohu Jehova na-emetụ Jehova n’obi. N’ezie, ndị ọzọ so dee Baịbụl gosiri na nke a bụ eziokwu. (Aịzaya 63:9; Zekaraya 2:8) Jehova bụ Chineke nke ọmịiko ya na-enweghị atụ.

Ndị mmadụ na-enwe mmasị n’onye nwere ọmịiko. Mgbe obi dara anyị mbà, ọ na-amasị anyị ịgakwuru onye nwere ike ịghọta ọnọdụ anyị ma gosi anyị ọmịiko. O kwesịrị ịmasị anyị ọbụna karị ịgakwuru Jehova, bụ́ Chineke ọmịiko, onye ihe na-ewute anyị na-emetụ n’obi, onye na-aghọtakwa ihe mere anya mmiri ji agba anyị!—Abụ Ọma 56:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Okwu Grik a sụgharịrị “anya mmiri gbara Jizọs” na-apụtakarị “ịkwa ákwá n’akwapụtaghị ya akwapụta,” ebe okwu Grik e ji kọwaa ákwá Meri na ndị ọzọ kwara nwere ike ịpụta “iti mkpu ákwá, ịkwasi ákwá ike.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya