Jiri “Oké Ịnụ Ọkụ n’Obi” Nọgide Na-enwekwu Ezi Ihe Ọmụma
NDỊ ohu Jehova niile chọrọ ka ihe ha na-amasị Jehova. Ebe ọ bụ na anyị chọrọ nke a, anyị dị njikere ime ka okwukwe anyị sikwuo ike nakwa ijikwu ịnụ ọkụ n’obi na-ejere ya ozi dị nsọ. Ma, Pọl onyeozi chetaara anyị otu ihe nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma, bụ́kwa ihe mere ụfọdụ ndị Juu n’oge ya, mgbe o kwuru, sị: “Ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Rom 10:2) O doro anya na okwukwe anyị na ofufe anyị na-efe Jehova ekwesịghị ịdabere n’ihe obi anyị gwara anyị mee. Ọ dị mkpa ka anyị nwee ezi ihe ọmụma banyere Onye okike anyị na ihe bụ́ uche ya.
N’akwụkwọ ozi ọzọ Pọl dere, o kwuru na e nwere ihe jikọrọ ime ihe na-amasị Chineke na ịdị njikere inweta ihe ọmụma. O kpere ekpere ka ụmụazụ Kraịst “jupụta n’ezi ihe ọmụma” nke uche Chineke “ka [ha] wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu” ka ha “na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla ma na-enwekwu ezi ihe ọmụma nke Chineke.” (Kọl. 1:9, 10) Gịnị mere o ji dị oké mkpa ka anyị nwee “ezi ihe ọmụma”? Oleekwa ihe mere anyị ji kwesị ịnọgide na-enwekwu ezi ihe ọmụma?
Isi Ihe Na-enyere Anyị Aka Inwe Okwukwe
Isi ihe na-enyere anyị aka inwe okwukwe bụ ezi ihe ọmụma banyere Chineke na uche ya, bụ́ nke e kpughere na Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị enweghị ezi ihe ọmụma dị otú ahụ, okwukwe anyị nwere na Jehova ga-adị ka ụlọ ụmụaka ji ahịhịa wuo, bụ́ nke obere ikuku nwere ike ịkwatu. Pọl gbara anyị ume ka anyị “site n’ike iche echiche” anyị jeere Chineke ozi dị nsọ nakwa ka anyị ‘mee ka uche anyị dị ọhụrụ.’ (Rom 12:1, 2) Ịmụchi Baịbụl anya pụrụ inyere anyị aka ime nke a.
Ewa, onye bụ́ ọsụ ụzọ oge niile bi na Poland kwuru, sị: “Ọ bụrụ na adịghị m amụchi Okwu Chineke anya, agaghịzi m na-enweta ezi ihe ọmụma banyere Jehova. Agaghịzi m na-eme ihe ndị e ji mara na m bụ Onye Kraịst, okwukwe m nwere na Chineke ga-ajụkwa oyi—nke a pụkwara ime ka mụ na Chineke gharazie ịdị ná mma.” Ka ụdị ihe a emekwala anyị! Ka anyị tụlee ihe banyere otu nwoke nwetakwuru ezi ihe ọmụma banyere Jehova nakwa otú Jehova si gosi ya na ihe ya masịrị ya.
“Lee Ka M Si Hụ Iwu Gị n’Anya!”
Na Baịbụl, Abụ Ọma nke 119, bụ́ nke a gụrụ n’ụdị uri, na-eme ka anyị mara otú obi dị ọbụ abụ ahụ banyere iwu Jehova, ihe ncheta ya, na mkpebi ikpe ya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ụkpụrụ gị ga na-atọ m ụtọ. . . . Ihe ncheta gị na-atọkwa m ụtọ.” O dekwara, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.”—Ọma 119:16, 24, 47, 48, 77, 97.
Okwu bụ́ “na-atọ m ụtọ” nakwa “m na-atụgharị n’uche,” gosiri na anyị kwesịrị ịdị na-atụgharị uche n’Okwu Chineke, nakwa na o kwesịrị ịdị na-atọ anyị ụtọ ime otú ahụ. Okwu abụọ a mere ka o doo nnọọ anya na ọbụ abụ ahụ hụrụ iwu Chineke n’anya. Ịhụnanya ahụ abụghị naanị n’ihi ọṅụ jupụtara ọbụ abụ ahụ obi. Kama, ọ gụsiri ya agụụ ike ịdị ‘na-atụgharị iwu Chineke n’uche,’ iji ghọtakwuo okwu Jehova. Site n’ihe a o mere, anyị hụrụ na ọ chọrọ ịmata Chineke na ihe bụ́ uche ya nke ọma ruo ókè o kwere ya mee.
O doro anya na ọbụ abụ ahụ hụrụ Okwu Chineke n’anya site n’ala ala obi ya. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àhụrụ m Okwu Chineke n’anya otú ahụ? Ọ̀ na-atọ m ụtọ ịgụ na ịtụgharị uche n’otu akụkụ Baịbụl kwa ụbọchị? M̀ na-agụchi Okwu Chineke anya ma na-ekpe ekpere tupu m gụwa ya?’ Ọ bụrụ na anyị zara ee n’ajụjụ ndị a, o yiri ka anyị “na-enwekwu ezi ihe ọmụma nke Chineke.”
Ewa kwuru, sị: “Ana m agbalị mgbe niile ịhụ na ọmụmụ ihe onwe onye m na-akakwu mma. Kemgbe m nwetachara broshuọ ahụ bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ,’ ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mgbe niile m na-amụ ihe ka m na-eji ya amụ ihe. Ana m agbalịkwukwa iji akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures na akwụkwọ ndị ọzọ na-eme nchọnchọ mgbe ọ dị mkpa.”
Tụleekwa ihe nlereanya nke Wojciech na Małgorzata, bụ́ ndị nwere ọtụtụ ibu ọrụ ezinụlọ. Olee otú ha si enwe ike inwe ọmụmụ ihe onwe onye? “Onye ọ bụla n’ime anyị na-agbalị iwepụta oge ịmụ Okwu Chineke n’onwe ya otú o nwere ike. Mgbe anyị na-enwezi ọmụmụ ihe ezinụlọ nakwa mgbe anyị na-enwe mkparịta ụka nkịtị, onye ọ bụla na-akọ ihe ndị tọrọ ya ụtọ ma ọ bụ ihe ndị na-agba ume ọ gụtara.” Inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya na-eme ka ha nwee obi ụtọ dị ukwuu ma nyere ha ka ‘inwekwu ezi ihe ọmụma.’
Dịrị Njikere Ikwere Ihe Ị Na-amụ
Anyị bụ́ Ndị Kraịst kweere na ọ bụ uche Chineke “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Ihe a e kwuru na-eme ka anyị ghọta mkpa ọ dị ịgụ Baịbụl ma gbalịa “ghọta ihe ọ pụtara.” (Mat. 15:10) Otu ihe ga-enyere anyị aka ime nke a bụ ịdị njikere ikweta ihe anyị na-amụ mgbe anyị na-amụ ihe. Ọ bụ ihe a ka ndị Beria oge ochie mere mgbe Pọl kwusaara ha ozi ọma: “Ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.”—Ọrụ 17:11.
Ị̀ na-eme ihe a ndị Beria mere site n’iji oké ịnụ ọkụ n’obi na-amụ Okwu Chineke ma hụ na ọ dịghị ihe ndị na-abaghị uru na-adọpụ uche gị mgbe ị na-amụ Baịbụl? Ọ bụrụgodị na e nwere Onye Kraịst ịmụ ihe na-adịghị amasịbu, o nwere ike ịgbalị iṅomi ndị Beria. Ihe ọzọkwa bụ na ka ụfọdụ na-emekwu agadi, ha adịghịzi enwe mmasị ịgụ ihe na ịmụ ihe, ma ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ime otú a. N’agbanyeghị afọ ole mmadụ dị, ọ ga-enweli ike ịgbalị izere ihe ndị ga-adọpụ uche ya mgbe ọ na-amụ ihe. Ka ị na-agụ ihe, i nwere ike ịgbalị ịchọpụta ihe ị ga-akọrọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ì nwere ike ikpebi ịkọrọ di ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụ Onye Kraịst bụ́ enyi gị ihe ndị ị gụtara ma ọ bụ mụta mgbe ị na-amụ ihe? Ime nke a ga-eme ka ihe ndị ahụ ị gụrụ dịrị gị n’uche na n’obi ma bakwaara ndị ọzọ uru.
Mgbe ị na-amụ ihe, ṅomie ihe nlereanya ohu Chineke n’oge ochie bụ́ Ezra, bụ́ onye ‘kwadebere obi ya ịtụle iwu Jehova.’ (Ezra 7:10) Olee otú ị ga-esi mee nke a? I nwere ike ịchọpụta ebe ga-adịrị gị mma ịnọ mụọ ihe. Mgbe ahụzi, nọdụ ala ma rịọ Jehova n’ekpere ka o duzie gị ma nye gị amamihe. (Jems 1:5) Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m na-atụ anya ịmụta n’ọmụmụ ihe a m chọrọ inwe?’ Ka ị na-agụ ihe, gbalịa chọpụta isi ihe ndị e kwuru n’isiokwu ahụ. I nwere ike idetu ha ma ọ bụ kanye ihe n’okpuru ihe ndị ị chọrọ icheta. Chee echiche otú ihe ị gụtara ga-esi abara gị uru mgbe ị na-ekwusa ozi ọma, mgbe ị na-eme mkpebi, ma ọ bụ mgbe ị na-agba onye kwere ekwe ibe gị ume. Tupu ị kwụsị ọmụmụ ihe gị ahụ, tụleghachi ihe ndị ị mụrụ. Nke ahụ ga-enyere gị aka icheta ihe ndị ị mụtara.
Ewa kwuru otú o si eme ya, sị: “Mgbe m na-agụ Baịbụl, ana m eji ntụaka etiti peeji, Watch Tower Publications Index, nakwa Watchtower Library dị na CD-ROM na-amụ ihe. M na-edetu ihe ụfọdụ ga-enyere m aka n’ozi ọma m.”
Ụfọdụ ndị enweela obi ụtọ ịmụchi ihe anya kemgbe ọtụtụ afọ, nke na-eme ka ha mụtakwuo ihe banyere Jehova. (Ilu 2:1-5) Ha na-eme nke a n’agbanyeghị na ha nwere ọtụtụ ibu ọrụ, ọ na-esikwara ha ike iwepụta oge iji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị, olee otú i nwere ike isi hazigharịa ihe ndị ị na-eme n’ụbọchị?
Olee Otú M Ga-esi Enweta Oge?
Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta na ọ na-adị mfe iwepụta oge mgbe anyị na-eme ihe ndị na-amasị anyị. Ọtụtụ ndị achọpụtala na otu ihe na-enyere mmadụ aka inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya bụ onye ahụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ọ ga-eruli, dị ka ịgụ Baịbụl site n’isi ruo ná ngwụcha. N’eziokwu, o siri ike ịgụ akụkụ Baịbụl ebe ndị ahụ e dere osuso ọmụmụ, ebe ndị a kọwara otú ụlọ nsọ oge ochie ahụ dị, ma ọ bụ amụma ndị siri ike nghọta, ndị na-agbasaghị ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị. Gbalịa mee ihe ndị ga-enyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ gị. Dị ka ihe atụ, tupu ilebawa anya n’akụkụ Baịbụl yiri ka ò siri ike nghọta, i nwere ike ịgụ ihe ndị mere tupu ihe ahụ i bu n’obi ịgụ ma ọ bụ ghọta otú ihe ahụ ị chọrọ ịgụ ga-esi baara gị uru. I nwere ike ịchọta ihe ndị ga-abara gị uru n’akwụkwọ bụ́ “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial.” E nwere ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ asụsụ iri ise.
Mgbe ị na-agụ Baịbụl, ịgbalị iji uche gị na-ahụ ihe ndị ahụ ị na-agụ ga-enyere gị aka. Nke a ga-eme ka ọ dị gị ka ị na-ahụ ndị ahụ ị na-agụ banyere ha na ihe ndị merenụ. Ime ihe ole na ole a e kwuru okwu ha ga-eme ka ọmụmụ ihe gị na-atọkwu gị ụtọ, ị ga-eritekwa uru buru ibu na ya. Nke a ga-emekwa ka ọ na-agụkwu gị agụụ iwepụtakwu oge ị ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe. Mgbe ahụ, ọ ga-adị mfe ka ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị mara gị ahụ́.
Ọ bụ eziokwu na aro ndị a a tụrụ ga-enyere mmadụ aka ịnọgide na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, ma olee ihe ndị ezinụlọ nwere ọtụtụ ihe ha na-eme nwere ike ime? Ọ ga-adị mma ma ha niile nọkọọ ọnụ kwurịta uru inwe ọmụmụ ihe ezinụlọ nwere ike ịbara ha. Mkparịta ụka dị otú ahụ nwere ike ime ka ha chọpụta ihe ndị ga-enyere ha aka ime ya, dị ka ịdị na-eteta ụra n’oge kwa ụbọchị karịa ka ha na-emebu, ma ọ bụ iteta n’oge n’ụbọchị ụfọdụ iji mụọ ebe ụfọdụ na Baịbụl. Mkparịta ụka ahụ nwedịrị ike inyere unu aka ịhụ otú unu ga-esi ahazigharị ihe ndị ezinụlọ unu na-eme. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ezinụlọ achọpụtala na ọ ga-abara ha uru ime ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma ọ bụ gụọ otu akụkụ Baịbụl mgbe ha richara nri. Tupu ha ebupụ ihe ndị ha ji rie nri ma ọ bụ gawa ime ihe ndị ọzọ dịịrị ha, ha na-eji ihe dị ka minit iri ma ọ bụ iri na ise amụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ gụọ ọgụgụ Baịbụl dịịrị izu. Nke a nwere ike isi ike omume ná mbụ, ma ka oge na-aga, ọ ga-amara ndị ezinụlọ ahụ ahụ́ ma na-atọ ha ụtọ.
Wojciech na Małgorzata kwuru ihe nyeere ezinụlọ ha aka: “Ná mbụ, ihe ndị na-adịghị mkpa na-ewekọrọ oge anyị. Anyị kpebiri na anyị agaghịzi na-etinye oge dị ukwuu n’iji kọmputa na-ezipụ ozi. Anyị gbubilatara oge anyị na-etinye n’ịtụrụ ndụ ma wepụta otu ụbọchị anyị ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe nke ọma.” O doro anya na ezinụlọ a anaghị akwa ụta n’ihi mgbanwe ndị a ha mere, gị onwe gị nwekwara ike ịchọpụta na unu agaghị akwa ụta ma unu mee otu ihe ahụ.
Inwekwu Ezi Ihe Ọmụma Na-aba Uru!
Ịmụ Okwu Chineke nke ọma nwere ike ịmị “mkpụrụ n’ezi ọrụ.” (Kọl. 1:10) Ka nke a na-eme ná ndụ gị, ọganihu gị ga-apụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ. Ị ga-abụ onye ji ozi Jehova kpọrọ ihe na onye maara eziokwu nke Baịbụl nke ọma. Ị ga-enwekwu ike ime mkpebi ndị ka mma ná ndụ gị, nwekwuokwa ike inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ka mma, ị gaghị na-atụrụ ha aro ka onye na-amachaghị nke a na-akọ. Nke kacha nke bụ na gị na Jehova ga-adịkwu ná mma. Ị ga-abịa ghọtakwuo àgwà ya dị iche iche, nke a ga-apụtakwa ìhè mgbe ị na-akọrọ ndị mmadụ banyere Ya.—1 Tim. 4:15; Jems 4:8.
N’agbanyeghị afọ ole ị dị ma ọ bụ ahụmahụ ndị i nwerela ná ndụ, gbalịa ihe niile i nwere ike iji hụ na Okwu Chineke na-atọ gị ụtọ nakwa na ị na-amụ ya nke ọma, ma dịrị njikere ikwere ihe ị na-amụ. Obi sie gị ike na Jehova agaghị echefu mgbalị ndị ị na-eme. (Hib. 6:10) Ọ ga-awụsakwa gị ngọzi ya n’ụba.
[Igbe dị na peeji nke 13]
Ọ BỤRỤ NA ANYỊ “NA-ENWEKWU EZI IHE ỌMỤMA”. . .
Anyị ga-eme ka okwukwe anyị nwere na Chineke sikwuo ike ma nwee ike ije ije n’ụzọ dị Jehova mma.—Kọl. 1:9, 10
Anyị na-enwekwu nghọta, nke na-eme ka anyị chebaara ihe echiche nke ọma ma mee mkpebi ndị dị mma.—Ọma 119:99
Anyị na-enwekwu obi ụtọ inyere ndị ọzọ aka ịbịarukwu Jehova nso.—Mat. 28:19, 20
[Foto ndị dị na peeji nke 14]
O nwere ike isi ike ịchọta ebe dị mma ịnọ nwee ọmụmụ ihe, ma ime ya na-aba uru
[Foto dị na peeji nke 15]
Ezinụlọ ụfọdụ na-agụ ebe ụfọdụ na Baịbụl mgbe ha richara nri