‘Na-aba Ụba n’Ezi Ihe Ọmụma’
Ezi ihe ọmụma nke Chineke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe nile anyị pụrụ ime iji na-amụba n’ezi ihe ọmụma banyere Jehova. (Kọl 1:9, 10) Na-amalite n’April 29, anyị ga-amụ akwụkwọ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọ bụghị nanị na a ga-ewulite nghọta nke anyị nke Okwu Chineke kama anyị ga-abụkwa ndị a kwadebere n’ụzọ ka mma ịkụziri ya ndị ọzọ. A ga-agọzi gị na ezinụlọ gị ma unu buru ụzọ kwadebe, gaa ma kere òkè kwa izu, jirikwa ihe ọmụma ahụ mee ihe n’ozi. Na-amalitekwa na September 9, 1996, anyị ga-alaghachi ná ntụle nke akwụkwọ Mmezu Mkpughe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.