Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w08 11/1 p. 16-17
  • Banyere Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Banyere Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Anyị Ji Arịa Ọrịa ma Na-anwụ Anwụ?
  • Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?
  • Gịnị Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?
  • Gịnị Bụ Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?
  • Gịnị Ga-eme Anyị Ma Anyị Nwụọ?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ihe Mere Jizọs Agaghị Ngwa Ngwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ajụjụ nke Abụọ: Gịnị Ga-eme M Ma M Nwụọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
w08 11/1 p. 16-17

Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs

Banyere Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ

Ọ dịkarịa ala, Jizọs kpọlitere mmadụ atọ n’ọnwụ, wee gosi na olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ. (Luk 7:11-17; 8:49-56; Jọn 11:1-45) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ, anyị ga-ebu ụzọ mata ihe kpatara mmadụ ji anwụ na otú o si malite.

Gịnị Mere Anyị Ji Arịa Ọrịa ma Na-anwụ Anwụ?

Mgbe Jizọs gbaghaara ndị mmadụ mmehie ha, ha gbakere. Dị ka ihe atụ, mgbe a kpọtaara Jizọs otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, Jizọs sịrị: “‘Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị, A gbagharawo gị mmehie gị, ka ọ̀ bụ ịsị, Bilie gawa ije? Otú ọ dị, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie—’ mgbe ahụ, ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: ‘Bilie, buru ihe ndina gị laa n’ụlọ gị.’” (Matiu 9:2-6) Ya mere, ọ bụ mmehie kpatara ọrịa na ọnwụ. Anyị si n’aka mmadụ mbụ, bụ́ Adam, keta mmehie.—Luk 3:38; Ndị Rom 5:12.

Gịnị Mere Jizọs Ji Nwụọ?

Jizọs emeghị mmehie ọ bụla. Ya mere, o kwesịghị ịnwụ. Jizọs nwụchiteere anyị ọnwụ wee kwụọ ụgwọ mmehie anyị. O kwuru na ‘a ga-awụpụ ọbara ya n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’—Matiu 26:28.

Jizọs sịkwara: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Jizọs kpọrọ ụgwọ ahụ ọ kwụrụ “ihe mgbapụta” n’ihi na ọ gbapụtara ụmụ mmadụ n’aka ọnwụ. Jizọs kwukwara, sị: “Abịara m ka ha nwee ndụ, ka ha nweekwa ya n’uju.” (Jọn 10:10) Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịghọta olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ nke ọma, ọ ga-eburịrị ụzọ mata ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ ugbu a.

Gịnị Na-eme Mmadụ Mgbe Ọ Nwụrụ?

Mgbe enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jizọs kwuru ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “‘Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ [ya bụ, Betani] ịkpọte ya.’ . . . Ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. Ya mere, n’oge ahụ, Jizọs gwara ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụwo.’” Ya mere, Jizọs mere ka o doo anya na ndị nwụrụ anwụ na-ehi ụra, ha amaghị ihe ọ bụla na-emenụ.—Jọn 11:1-14.

O ruola ụbọchị anọ Lazarọs, enyi Jizọs, nwụrụ tupu Jizọs akpọlite ya n’ọnwụ. Ma, ọ dịghị ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ihe Lazarọs kọrọ mere n’oge ahụ ọ nwụrụ. Mgbe Lazarọs nwụrụ, o nweghị ihe ọ bụla na-emenụ ọ ma.—Ekliziastis 9:5, 10; Jọn 11:17-44.

Gịnị Bụ Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?

Ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie, ha ga-enwekwa olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs sịrị: “Oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya [ya bụ, olu Jizọs] wee pụta.”—Jọn 5:28, 29.

Ọ bụ ịhụnanya Chineke mere o ji mee ka anyị nwee olileanya a. Jizọs sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16; Mkpughe 21:4, 5.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu nke a, gụọ isi nke isii nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?a

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya