Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w09 8/1 p. 30
  • Ego Ole Ka M Kwesịrị Inye n’Onyinye?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ego Ole Ka M Kwesịrị Inye n’Onyinye?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onyinye Chineke Gwara Ndị Ya Ka Ha Na-enye n’Oge Ochie na Ndị nke Ha Ji Aka Ha Nye
  • Ò Nwere Ego Ole A Kapịrị Ọnụ Ndị Kraịst Ga Na-enye?
  • Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?
    Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
  • Jehova Na-ahụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-enye Ihe n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Olee Ihe Anyị Nwere Ike Inye Jehova?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Jehova Hụrụ Onye Na-eji Obi Ụtọ Enye Ihe n’Anya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
w09 8/1 p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ego Ole Ka M Kwesịrị Inye n’Onyinye?

“Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Ndị Kọrịnt 9:7) Ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa dum maara ihe a e dere n’amaokwu a. Ma, ụfọdụ ndị na-aga chọọchị nwere ike iche na ha kwesịrị inye karịa akpa ha. N’eziokwu, okpukpe ụfọdụ nwere ego ole a kapịrị ọnụ ha na-agwa ndị òtù ha ka ha na-enye. A na-akpọ ya inye otu ụzọ n’ụzọ iri, ya bụ, mmadụ ike ihe ọ na-akpata ụzọ iri ma nye chọọchị otu ụzọ.

Ò nwere ego ole Baịbụl kwuru ka anyị na-enye n’onyinye? E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Ego ole ka m kwesịrị inye n’onyinye?

Onyinye Chineke Gwara Ndị Ya Ka Ha Na-enye n’Oge Ochie na Ndị nke Ha Ji Aka Ha Nye

Na Baịbụl, e nwere ntụziaka doro anya Chineke nyere ụmụ Izrel banyere otú onyinye ọ chọrọ ka ha na-enye ga-aha. (Levitikọs 27:30-32; Ọnụ Ọgụgụ 18:21, 24; Diuterọnọmi 12:4-7, 11, 17, 18; 14:22-27) Ihe ndị a Chineke chọrọ n’aka ha akarịghị ha. Jehova kwere ndị ya nkwa na ọ bụrụ na ha erube isi n’iwu ya, ọ ga-eme ka ihe mba ahụ ‘na-emepụta dị nnọọ ukwuu.’—Diuterọnọmi 28:1, 2, 11, 12.

N’oge ndị ọzọ, ụmụ Izrel nwere ike iji aka ha kpebie ihe ha ga-enye, ma ò buru ibu ma ọ̀ dị ntakịrị. Dị ka ihe atụ, mgbe Eze Devid mere atụmatụ iwuru Jehova ụlọ nsọ, ndị ọ na-achị nyere “ọlaedo ruru puku talent ise” n’onyinye.a (1 Ihe E Mere 29:7) Jiri nke a tụnyere ihe Jizọs hụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Ọ hụrụ “otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye ka ọ tụnyere obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta” n’igbe a na-atụnye ego n’ụlọ nsọ. Onyinye ahụ o nyere ọ̀ pụtara ego ole? Ọ bụ naanị otu ụzọ n’ụzọ iri isii na anọ nke ego a na-arụta n’ọrụ otu ụbọchị. N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs kwuru na Chineke nabatara obere ego ahụ.—Luk 21:1-4.

Ò Nwere Ego Ole A Kapịrị Ọnụ Ndị Kraịst Ga Na-enye?

Ndị Kraịst anọghị n’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ Chineke na Izrel gbara. N’ihi ya, o nweghị ego ole a kapịrị ọnụ ha ga na-enye Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ọgbakọ Ndị Kraịst, inye onyinye na-enye nnọọ ọṅụ. Jizọs Kraịst n’onwe ya kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

Ndịàmà Jehova na-enye onyinye afọ ofufo iji na-akwado ọrụ ikwusa ozi ọma ha na-arụ n’ụwa niile. A na-eji onyinye a ebipụta akwụkwọ, dị ka magazin a ị na-agụ, jirikwa ya na-ewu ma na-elekọta ebe ha na-efe ofufe nke a na-akpọ Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nweghị ndị a na-eji ego a a na-enweta n’onyinye akwụ ụgwọ ọnwa. A na-enye ụfọdụ ndị wepụtara onwe ha ịrụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ oge niile ego mmachi akpa iji kwụọ ụgwọ ihe ha na-emefu n’ịgba ụgbọ na n’ilekọta onwe ha. Ma, o nweghị onye ọ bụla n’ime ha na-eji aka ya ekwu ka e nyere ya ụdị aka a. N’ezie, ọ dịghị ego a na-enye ihe ka nnọọ ukwuu ná Ndịàmà Jehova iji nyere ha aka n’ọrụ ikwusa ozi ọma ha na-arụ. Kama nke ahụ, ihe ka ukwuu n’ime ha na-arụ ọrụ ego iji na-elekọta onwe ha, dị nnọọ ka Pọl mere mgbe ọ rụrụ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu.—2 Ndị Kọrịnt 11:9; 1 Ndị Tesalonaịka 2:9.

Ego ole ka mmadụ kwesịrị inye ma ọ bụrụ na ọ chọrọ inye onyinye iji nye aka n’ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ? Pọl onyeozi dere, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya, ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 Ndị Kọrịnt 8:12; 9:7.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’afọ 2008, ihe a na-ere ọlaedo nke dị ihe dị ka gram iri abụọ na asatọ bụ $871, bụ́ nke pụtara na ọnụ ahịa onyinye a bụ ihe dị ka $4,794,855,000.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya