Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?
O NWERE mgbe Jizọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Olee nna ọ bụ n’ime unu nke nwa ya ga-arịọ azụ̀, ya enye ya agwọ kama inye ya azụ̀? Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá, ya enye ya akpị?” (Luk 11:11, 12) Ịta azụ̀ na àkwá na-atọ ụmụaka Galili ụtọ; ha maara ụdị nri ha chọrọ iri.
Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịnọgide na-arịọ ka e nye anyị mmụọ nsọ otú ahụ nwata agụụ ji si arịọ ka e nye ya nri. (Luk 11:9, 13) Ịghọta ihe mmụọ nsọ bụ ga-eme ka anyị mata ọrụ dị mkpa o nwere ike ịrụ ná ndụ anyị. N’ihi ya, ka anyị buru ụzọ leba anya n’ihe Baịbụl kụziiri anyị banyere mmụọ nsọ.
“Ike nke Onye Kasị Elu”
Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na mmụọ nsọ bụ ikike nke Chineke ji emezu uche ya. Mgbe mmụọ ozi bụ́ Gebriel gwara Meri na ọ ga-amụ nwa nwoke, ọ bụ ezie na ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ, Ọkpara Chineke.” (Luk 1:35) Okwu Gebriel gosiri na e nwere ihe jikọrọ mmụọ nsọ na “ike nke Onye Kasị Elu.”
E kwukwara ihe yiri nke a n’ebe ndị ọzọ na Baịbụl. Maịka onye amụma kwuru, sị: “Mmụọ Jehova emewo ka m jupụta n’ike.” (Maịka 3:8) Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.” (Ọrụ 1:8) Pọl onyeozi kwukwara banyere ‘ike mmụọ nsọ.’—Ndị Rom 15:13, 19.
Ya mere, olee ihe anyị mụtara n’ihe ndị a anyị lebarala anya? Anyị mụtara na e nwere nnọọ ihe jikọrọ mmụọ nsọ na ike Chineke. Mmụọ nsọ bụ ihe Jehova ji egosi ike ya. E kwuo ya ná nkenke, mmụọ nsọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ. Ike a enweghị nnọọ atụ! Anyị agaghị aghọtali ụdị ike Chineke nwere nke mere o ji nwee ike ike eluigwe na ụwa. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma gwa anyị ihe a ọ chọrọ ka anyị chebara echiche: “Lelienụ anya elu hụrụ. Ònye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka ha pụta n’ìgwè ọbụna dị ka ọnụ ọgụgụ ha si dị, ọ na-akpọ ha niile ọbụna n’aha. Ọ dịghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ, n’ihi na ike ya dị ukwuu, n’ihi na o nwekwara ume dị ukwuu.”—Aịzaya 40:26.
Ya mere, Baịbụl na-egosi na ọ bụ ‘ike dị ukwuu’ nke Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile nwere mere ihe niile e kere eke n’eluigwe na ala ji aga n’usoro. O doro anya na ike Chineke nke nọ n’ọrụ dị nnọọ ukwuu, ndụ anyị dabekwaara na ya.—Gụọ igbe bụ́, “Ọrụ Ndị Mmụọ Nsọ Rụrụ.”
Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya rụọ nnukwu ọrụ, dị ka ike eluigwe na ala. Ma, o nwekwara ike iji ya rụọrọ ụmụ mmadụ o kere eke ọrụ. E nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru otú ike Chineke nke nọ n’ọrụ si nye ndị ohu Chineke nọ n’ụwa ike.
“Mmụọ Jehova Dị n’Ahụ́ M”
Ozi Jizọs jere n’ụwa na-eme ka anyị ghọtatụ otú mmụọ nsọ Chineke nwere ike isi nye ndị ohu Chineke ike. Jizọs gwara ndị Nazaret, sị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m.” (Luk 4:18) Olee ihe Jizọs rụzuru site “n’ike mmụọ nsọ”? (Luk 4:14) Ọ gwọrọ ụdị ọrịa ọ bụla, mee ka ebili mmiri dajụọ, jiri ogbe achịcha na azụ̀ ole na ole nye ọtụtụ puku mmadụ nri, ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Pita onyeozi kwuru na Jizọs bụ “nwoke nke Chineke gosiri . . . n’ihu ọha site n’ọrụ ndị dị ike na ihe ebube na ihe ịrịba ama ndị Chineke mere site n’aka ya.”—Ọrụ 2:22.
Mmụọ nsọ anakwaghị eme ka ndị mmadụ na-arụ ụdị ọrụ ebube ndị ahụ ugbu a. N’agbanyeghị nke ahụ, o nwere ike imere anyị ihe ndị dị ịtụnanya. Jehova na-enye nnọọ ndị na-efe ya mmụọ nsọ ya, dị ka Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya ná nkwa na ọ ga-enye ha. (Luk 11:13) Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji nwee ike ikwu, sị: “N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Mmụọ nsọ ò nwere ike ịrụ ụdị ọrụ ahụ ná ndụ gị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ a.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]
Ihe Mere O Ji Bụrụ na Mmụọ Nsọ Abụghị Onye
Baịbụl ji mmụọ nsọ tụnyere mmiri. Mgbe Chineke na-ekwe ndị ya nkwa ngọzi ha ga-enweta n’ọdịnihu, o kwuru, sị: “M ga-enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ka ọ ṅụọ, meekwa ka iyi nke na-asọ nwayọọ nwayọọ dịrị n’ebe kpọrọ nkụ. M ga-awụkwasị mkpụrụ gị mmụọ m, wụkwasịkwa ụmụ gị ngọzi m.”—Aịzaya 44:3.
Ọ bụrụ na Chineke awụkwasị ndị ohu ya mmụọ ya, ha ‘na-ejupụta na mmụọ nsọ.’ E kwuru na Jizọs, Jọn Onye Na-eme Baptizim, Pita, Pọl, Banabas, na ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ́ ndị zukọtara n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị, jupụtachara na mmụọ nsọ.—Luk 1:15; 4:1; Ọrụ 4:8; 9:17; 11:22, 24; 13:9.
Chebagodịrị nke a echiche: È nwere ike iji otu onye ‘wụkwasị’ ọtụtụ ndị n’otu n’otu? Ì nwere ike ịsị na otu onye ‘jupụtara’ n’ìgwè mmadụ? Mbanụ! Baịbụl kwuru banyere ndị mmadụ ijupụta n’amamihe, ná nghọta, ma ọ bụ ọbụna n’ezi ihe ọmụma, ma ọ dịtụghị mgbe o kwuru na mmadụ jupụtara n’onye ọzọ.—Ọpụpụ 28:3; 1 Ndị Eze 7:14; Luk 2:40; Ndị Kọlọsi 1:9.
Okwu Grik a sụgharịrị “mmụọ” bụ pneuʹma, bụ́ nke pụtakwara ike a na-anaghị ahụ anya. Akwụkwọ bụ́ Expository Dictionary of New Testament Words, nke Vine dere, kwuru, sị: “Isi ihe [pneuʹma] pụtara bụ ikuku . . . nakwa ume; ihe ọ pụtakwara karịsịa bụ mmụọ, bụ́ nke a na-anaghị ahụ anya, nke a na-anaghị ebitụ aka, na nke dị ike, dị ka ikuku.”
N’ihi ya, o doro anya na mmụọ nsọ abụghị onye.a
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nke a, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na Mmụọ Nsọ,” n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 201-204. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.
[Ebe E Si Nweta Foto]
Photodisc/SuperStock