Ọchịchị Setan Ga-akụrịrị Afọ n’Ala
“Ọ gaghị adịrị onye ajọ omume mma ma ọlị.”—EKLI. 8:13.
1. Olee ihe mere ikpe a ga-ekpe ndị ajọ omume ji bụrụ ihe na-akasi obi?
AGA-EKPERỊRỊ ndị ajọ omume ikpe n’oge na-adịghị anya. Ha aghaghị ịza ajụjụ ihe niile ha na-eme. (Ilu 5:22; Ekli. 8:12, 13) Nke a na-akasi anyị obi. Ọ kacha akasi ndị hụrụ ezi omume n’anya obi, bụ́ ndị ndị ajọ omume na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma na-akpagbu. Onye a ga-akacha kpee ikpe n’ime ndị ajọ omume niile a ga-ekpe ikpe bụ nna ajọ omume, ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu.—Jọn 8:44.
2. Gịnị mere na Chineke egbughị ndị nnupụisi ahụ ozugbo iji dozie esemokwu ahụ bilitere n’Iden?
2 N’Iden, Setan, bụ́ onye onwe ya na-ebu isi, mere ka ụmụ mmadụ jụ ọchịchị Jehova. Nke a mere ka nne na nna ochie anyị, bụ́ Adam na Iv, soro Setan jụ ọchịchị ọma Jehova, ha ewee ghọọ ndị mmehie n’anya ya. (Rom 5:12-14) Jehova ma ihe isi ha nupụụrụ ya ga-arụpụtara ha. Ma, ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ ndị ọzọ jiri anya ha hụ ihe na-aghaghị isi na ya pụta. Ya mere, ọ chọrọ ka ihe ndị ga na-eme mgbe oge na-aga gosi onye ọ bụla na ihe ndị nnupụisi ahụ mere jọgburu onwe ya.
3. Olee otú anyị si ele ọchịchị ụmụ mmadụ anya?
3 Ebe ụmụ mmadụ jụrụ ọchịchị Jehova, ha malitere ọchịchị nke ha. Mgbe Pọl onyeozi degaara ụmụnna ya nọ na Rom akwụkwọ ozi, o kwuru banyere “ndị ọchịchị” nke oge ahụ. N’oge ahụ, ọchịchị e nwere bụ ọchịchị ndị Rom, nke Eze Ukwu Niro nọ n’isi ya, bụ́ onye chịrị malite n’afọ 54 O.A. ruo n’afọ 68 O.A. Pọl kwuru na “ọ bụ Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya.” (Gụọ Ndị Rom 13:1, 2.) Nke a ọ̀ pụtara na ihe Pọl bu n’uche bụ na ọchịchị ụmụ mmadụ ka ọchịchị Chineke mma? Mbanụ. Kama nke ahụ, ihe o bu n’uche bụ na ebe ọ bụ na Jehova hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị, Ndị Kraịst kwesịrị irubere ndị nọ n’ọchịchị isi, nke bụ́ ịkwado “ndokwa Chineke” mere.
Ụzọ Na-eduga na Nsogbu
4. Kwuo ihe mere ọchịchị ụmụ mmadụ ga-eji akụ afọ n’ala.
4 N’agbanyeghị nke ahụ, ọchịchị ụmụ mmadụ, bụ́ nke Setan nọ n’isi ya, ga-akụrịrị afọ n’ala. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Otu n’ime ihe ndị mere ọ ga-eji akụ afọ n’ala bụ na ha ejighị amamihe Chineke achị. Ọ bụ naanị Jehova nwere amamihe zuru okè. N’ihi ya, ọ bụ naanị ya ma ihe ga-eme ka ọchịchị gaa nke ọma. (Jere. 8:9; Rom 16:27) Jehova ma ụzọ kacha mma ọ ga-esi eme ihe ya agaa nke ọma, ọ dịghị ka ụmụ mmadụ, bụ́ ndị na-eme ihe na-edoghị ha anya. Ọchịchị ọ bụla nke na-anaghị agbaso ntụziaka Jehova agaghị enwe isi. Naanị nke a, ma e wezụgakwarị arụ ndị ọchịchị na-akpa, ezuola ime ka ọchịchị na-abụghị nke Chineke, bụ́ ndị Setan ji ụmụ mmadụ na-achị, kụọ afọ n’ala.
5, 6. Gịnị bụ ihe o doro anya na ọ bụ ya mere Setan ji malite ịma Jehova aka?
5 Onye ma ihe anaghị etinye aka n’ihe ọ ma ga-emecha kụọ afọ n’ala. Ọ bụrụ na o sie ọnwụ mewe ya, ọ ga-emecha hụ na ihe ọ na-eme enweghị isi. Ihe ndị na-eme eme egosila ọtụtụ mgbe na ọ bụ ihe na-enweghị isi mmadụ ịma Onye kere anyị aka, bụ́ onye pụrụ ime ihe niile. (Gụọ Ilu 21:30.) Ma, Setan gbakụtara Jehova azụ n’ihi na onwe ya na-ebu ya isi. Ekwensu si otú a tinye isi n’ụzọ na-eduga nnọọ ná nsogbu.
6 Ka oge na-aga, otu n’ime eze ndị chịrị Babịlọn gosiri na ya dị mpako ka Setan. Eze ahụ turu ọnụ, sị: “M ga-agbago n’eluigwe. M ga-ebuli ocheeze m ka ọ dị elu karịa kpakpando Chineke. M ga-anọdụ ala n’ugwu nzukọ, n’ime ime ebe ugwu. M ga-agbago gafee ebe ndị dị elu n’ígwé ojii. M ga-eme onwe m ka m yie Onye Kasị Elu.” (Aịza. 14:13-15) Ihe nzuzu ahụ eze ahụ chọrọ ime kụrụ afọ n’ala, otú ọchịchị Babịlọn sikwa laa n’iyi na-eme ihere. Ihe yiri nke ahụ ga-eme Setan na ụwa ya mgbe a ga-emeri ha.
Gịnị Mere Jehova Ji Hapụ Ka Ihe Dịrị Otú Ha Dị?
7, 8. Olee ụfọdụ uru dị ná nhapụ Jehova hapụrụ ahụhụ ka ọ dịrị ruo nwa oge?
7 O nwere ike ịna-agbagwoju ndị ụfọdụ anya ihe mere na Jehova egbochighị ụmụ mmadụ ịdụnyere Setan úkwù ma ọ bụkwanụ gbochie ha ịchị onwe ha, bụ́ ọchịchị nke ga-akụrịrị afọ n’ala. A sị na ọ chọrọ, ọ gaara eme otú ahụ n’ihi na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. (Ọpụ. 6:3) Ma, o meghị otú ahụ. Ọ ma na ọ bụrụ na ya ahapụtụ ụmụ mmadụ ka ha chịwa onwe ha, nke a ga-emecha rụpụta ezigbo ihe. Ka oge na-aga, ihe ndị na-eme ga-egosi na Jehova bụ ezigbo Eze nke hụrụ ndị ọ na-achị n’anya, nhapụ ahụ ọ hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha ga-abakwara ụmụ mmadụ ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ uru.
8 A sị na ụmụ mmadụ egeghị Setan ntị, wee malite ịchị onwe ha kama Chineke ịchị ha, ha agaraghị anọ ná nsogbu ha nọ na ya ugbu a. Ma, ezigbo ihe esila na nhapụ Jehova hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha chịtụwa onwe ha pụta. O meela ka ndị nwere ezi obi mara na ha kwesịrị ige Chineke ntị na ịtụkwasị ya obi. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ụmụ mmadụ etinyela aka n’ụdị ọchịchị dị iche iche, ma, ọ dịghị nke nwere isi. Nke a emeela ka obi sikwuo ndị na-efe Chineke ike na ọchịchị Jehova kacha mma. Ọ bụ eziokwu na nhapụ Jehova hapụrụ ọchịchị arụrụala Setan na-ewetara ụmụ mmadụ, tinyere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Chineke, ahụhụ, ma, ndị na-efe Jehova eritela uru na nhapụ ahụ ọ hapụrụ ka arụrụala dịrị.
Nnupụisi nke Na-ewetara Jehova Otuto
9, 10. Kwuo otú ọchịchị Setan si ewetara Jehova otuto.
9 Nhapụ Jehova hapụrụ Setan ka ọ na-eduhie ụmụ mmadụ nakwa nhapụ ọ hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha anaghị egosi na ọchịchị Jehova adịghị mma. Kama nke ahụ, ihe ndị merela n’ụwa na-egosi na ihe Jeremaya ji ike mmụọ nsọ kwuo mgbe o kwuru na ụmụ mmadụ enweghị ike ịchị onwe ha bụ eziokwu. (Gụọ Jeremaya 10:23.) Ihe ọzọkwa bụ na isi ahụ Setan nupụụrụ Jehova emeela ka Jehova gosi àgwà ọma dị iche iche o nwere n’ụzọ pụtakwuru ìhè. Olee otú o si mee nke a?
10 Ebe ọ bụ na anyị na-ahụ ahụhụ ọchịchị Setan na-akpata, àgwà dị iche iche zuru okè Jehova nwere na-apụta ìhè karịa ka ha gaara apụta ma a si na Setan anaghị achị. Nke a emeela ka ndị hụrụ Chineke n’anya na-enye ya otuto. N’agbanyeghị na ọchịchị Setan na-emegide nzube Chineke, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-ewetara Chineke otuto. O meela ka onye ukwu na onye nta mata otú magburu onwe ya Jehova si egosi na ebubo ahụ Setan boro ya banyere otú o si achị bụ ụgha. Iji gosi otú o si eme nke a, ka anyị tụlee na nkenke ụfọdụ n’ime àgwà Jehova nwere ma hụ otú ọchịchị arụrụala Setan sirila mee ka àgwà dị iche iche Jehova nwere pụtakwuo ìhè.
11. Olee otú Jehova sirila gosi na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya?
11 Ịhụnanya. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ịhụnanya Chineke nwere mere o ji kee ụmụ mmadụ. Ụzọ dị egwu ma dị ebube Chineke si kee anyị bụ ihe ọzọ na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụkwa ịhụnanya mere Jehova ji nye ụmụ mmadụ ebe obibi mara mma, bụ́ nke nwere ihe ọ bụla ga na-eme ha obi ụtọ. (Jen. 1:29-31; 2:8, 9; Ọma 139:14-16) Ma, mgbe ụmụ mmadụ malitere ime mmehie, Jehova gosikwara na ya ka hụrụ ha n’anya. Olee ihe o mere? Jọn onyeozi dere na Jizọs kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ò nwere otú ọzọ ka mma Chineke gaara esi gosi na ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya karịa izite Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka ọ bịa gbapụta ndị mmehie? (Jọn 15:13) Ndị mmadụ kwesịrị iṅomi otú a magburu onwe ya Chineke si gosi na ya hụrụ ha n’anya. Nke a pụtara na ha ga na-eme ihe ndị na-egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ Chineke si hụ ha n’anya, ọ bụrụgodị na ha ga-anwụ n’ihi ha dị ka Jizọs nwụrụ.—Jọn 17:25, 26.
12. Olee otú Jehova si egosi na ya nwere ike?
12 Ike. Ọ bụ naanị “Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” nwere ike ime ka mmadụ malite ịdị ndụ. (Mkpu. 11:17; Ọma 36:9) Mgbe a mụrụ mmadụ, ọ yiri akwụkwọ a na-edeghị ihe ọ bụla. Tupu onye ahụ anwụọ, ọ na-eji mkpebi dị iche iche, ihe ndị o mere, na ihe ndị ọ hụrụla ná ndụ, bụ́ ndị mere ya ụdị onye ọ bụ, dejuo akwụkwọ ihe atụ ahụ. Jehova ma banyere ihe ndị a niile. Mgbe oge ruru, Jehova ga-akpọlite onye ahụ n’ọnwụ, uche ya ezuo ezu otú ọ dị na mbụ. (Jọn 5:28, 29) Ọ bụ ezie na ọ bụghị nzube Chineke ka ndị mmadụ na-anwụ anwụ, ma, ọnwụ emeela ka a mara na ike Chineke ruru n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. N’ezie, Jehova bụ “Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.”
13. Olee otú àjà e ji Jizọs chụọ si gosi na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi?
13 Ikpe Ziri Ezi. Jehova anaghị agha ụgha; ọ naghịkwa ekpe ikpe na-ezighị ezi. (Diut. 32:4; Taị. 1:2) Ọ na-ekwu eziokwu mgbe niile, na-ekpekwa ikpe ziri, ya sọkwa ya ya bụrụ mgbe o yiri ka ọ ga-efu ya ihe. (Rom 8:32) O wutere Jehova nke ukwuu mgbe a kpọgburu Ọkpara ya n’osisi ịta ahụhụ otú e si akpọgbu onye kwuluru Chineke. Ma, n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ, o kwere ka e gbuo Ọkpara ya, n’agbanyeghị na o wutere ya, ka o wee mee ihe kwekọrọ n’ikpe ziri ezi ọ na-ekpe. (Gụọ Ndị Rom 5:18-21.) Ụwa nke jupụtara n’ikpe na-ezighị ezi mere ka Jehova gosi na ya bụ a gachaa ọ gwụ n’ikpe ikpe ziri ezi.
14, 15. Olee ụzọ dị iche iche Jehova sirila gosi na ya nwere amamihe na-enweghị atụ, nweekwa ndidi?
14 Amamihe. Ozugbo Adam na Iv mehiere, Jehova mere ka a mara otú ọ ga-esi dozie ihe niile nnupụisi ahụ kpatara. (Jen. 3:15) Ihe ahụ Jehova mere ozugbo nakwa otú o si jiri nwayọọ nwayọọ mee ka ndị ohu ya mata ihe niile banyere amụma a mere ka a mara na amamihe o nwere enweghị atụ. (Rom 11:33) O nweghị ihe ga-eme ka ihe Chineke chọrọ ime ghara ịga nke ọma. N’ụwa a nke omume rụrụ arụ, agha, enweghị ezi uche, nnupụisi, obi ịta mmiri, ile mmadụ anya n’ihu, na ihu abụọ jupụtara, Jehova egosila ndị o kere eke ihe inwe ezigbo amamihe bụ. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “Amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị akpa ókè n’ihi ile mmadụ anya n’ihu, ọ dịghị ihu abụọ.”—Jems 3:17.
15 Ndidi na Ogologo Ntachi Obi. A garaghị amatacha otú Jehova si edi ihe nakwa otú o nweruru ogologo ntachi obi ma a si na ụmụ mmadụ bụ ndị zuru okè na ndị na-anaghị eme mmehie ma ọ bụkwanụ ndị na-emehie ihe. Odidi Jehova na-edi ihe ndị a kemgbe ọtụtụ puku afọ na-egosi na o nwere nnọọ àgwà ndị a magburu onwe ha, anyị kwesịkwara ịna-ekele ya maka nke a. Pita onyeozi kwutere ya mgbe ọ sịrị na anyị kwesịrị ịgụ “ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta.”—2 Pita 3:9, 15.
16. Olee ihe mere otú Jehova si agbaghara anyị mmehie ji bụrụ ihe kwesịrị ịna-eme anyị nnukwu obi ụtọ?
16 Ọ Dị Njikere Ịgbaghara Anyị Mmehie. Anyị niile bụ ndị mmehie, anyị na-asụkwa ngọngọ ọtụtụ ugboro. (Jems 3:2; 1 Jọn 1:8, 9) Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova nke ukwuu n’ihi na ọ dị njikere ịgbara anyị “n’ụzọ dị ukwuu”! (Aịza. 55:7) Chebagodịrị okwu a echiche: Ebe ọ bụ na a mụrụ anyị anyị abụrụ ndị mmehie na-ezughị okè, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-enwe nnukwu ọṅụ ma Chineke gbaghara anyị mmehie. (Ọma 51:5, 9, 17) Ọ bụrụ na Jehova akpaso anyị àgwà a nke na-eme obi ụtọ, ya bụ, ịgbaghara anyị mmehie, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, meekwa ka anyị gbaghara ndị mehiere anyị.—Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.
Ihe Mere Nsogbu Ji Dịrị n’Ụwa
17, 18. Olee ihe ndị na-egosi na ọchịchị Setan akụọla afọ n’ala?
17 Ụwa Setan, bụ́ nke ọ na-achị, akụọla afọ n’ala kemgbe ọtụtụ narị afọ, otú ahụ ka ọ ga-anọgidekwa na-adị. N’afọ 1991, otu akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta na Yurop kwuru, sị: “Nsogbu ọ̀ dị n’ụwa? Ee, kama . . . ọ bụghị Chineke kpatara ya. Ọ bụ ndị bi n’ime ya kpatara ya.” Nke a enweghị nnọọ mgbagha. Setan mere ka Adam na Iv họrọ ịchị onwe ha kama Jehova ịchị ha. Ha si otú a malite ọchịchị nke ga-akụrịrị afọ n’ala. Anya ndị mmadụ na-ahụsi na ahụhụ ha na-ata n’ụwa dum bụ ihe ndị na-egosi na ọchịchị ụmụ mmadụ nọ na nnukwu nsogbu.
18 Ọchịchị Setan na-eme ka ndị mmadụ na-achọ otú ihe ga-esi dịrị naanị onwe ha mma. Ma, mmadụ ịchọ otú ihe ga-esi dịrị naanị onwe ya mma akaghị ịhụnanya mma, bụ́ ihe e ji mara ọchịchị Jehova. Ọchịchị Setan enweghị ike ime ka e nwee udo na obi ụtọ, o nweghịkwa ike ime ka obi ruo ndị mmadụ ala. Ihe a niile na-egosi na ọchịchị Jehova ka mma! È nwere ihe ndị na-eme n’oge a, bụ́ ndị na-egosi na nke a bụ eziokwu? Ee, ihe ndị anyị ga-amụ n’isiokwu nke na-eso nke a ga-eme ka anyị mara nke a.
Olee Ihe Anyị Mụtara Banyere Ọchịchị Site n’Ịgụ . . .
• Ilu 21:30?
[Foto dị na peeji nke 25]
O nweghị uru ọchịchị Setan na-abara ụmụ mmadụ
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto Ndị Agha U.S. sere
Foto òtù WHO nke P. Almasy sere
[Foto dị na peeji nke 26]
Ike Jehova ruru n’ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ
[Foto dị na peeji nke 27]
Ọ bụ ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ nakwa ikpe ziri ezi ọ na-ekpe mere o ji kwe ka a chụọ Ọkpara ya n’àjà