Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 5/1 p. 14-15
  • Kwụsie Ike n’Ihe Ndị I Kweere!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwụsie Ike n’Ihe Ndị I Kweere!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mbibi E Bibiri Sọdọm na Gọmọra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Meriri Ọnwụnwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Jizọs Gwọrọ Ndị Mmadụ Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • E Mere Ha Ihe Ha Chọrọ Ka E Mee Daniel!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 5/1 p. 14-15

Maka Ndị Na-eto Eto

Kwụsie Ike n’Ihe Ndị I Kweere!

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị bụ́ isi n’akụkọ a: Jeremaya, Ibed-melek, Eze Zedekaya

Nchịkọta: A kpagburu Jeremaya mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ mgbe ọ na-akpọsa ozi Chineke nke bụ́ ka ndị Juda chịliere ndị Kaldia aka elu.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JEREMAYA 38:1-5.

Olee otú i chere obi dị Jeremaya mgbe ọ na-agwa ndị Juda okwu?

․․․․․

Olee otú i chere obi dị Jeremaya mgbe ọ na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Jehova?

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ihe ndị mesiri Jeremaya obi ike ikwu okwu otú ahụ?

․․․․․

2 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JEREMAYA 38:6-13.

Jiri echiche gị kọwaa olulu mmiri ahụ—obosara ya, omimi ya, na ísìsì ya.

․․․․․

Olee ihe nwere ike ịgbata Jeremaya n’obi mgbe o ‘mikpuru n’apịtị ahụ’? (Gụghachi amaokwu 6.)

․․․․․

LEBAKWUO YA ANYA.

Jiri ihe ndị e ji eme nnyocha i nwere chọpụta ihe ị na-amabughị banyere olulu mmiri ndị e nwere n’oge Baịbụl.

․․․․․

Olee ihe kara Ibed-melek obi ịchọ ịgụpụta Jeremaya? (Gụghachi amaokwu 7-9.)

․․․․․

Olee ihe mere o ji dị mfe ndị isi ime ka Zedekaya kwenyere ha, e mesịakwa ya ekwenyere Ibed-melek ngwa ngwa? (Gụghachi amaokwu 5 na 10.) Olee ihe nke a na-egosi banyere ụdị onye Zedekaya bụ, na otú o si bụrụ na ọ bụghị onye na-akwụsi ike n’ihe o kweere?

․․․․․

Olee ndị a kpọrọ aha n’akụkọ a kwụsịrị ike n’ihe ndị ha kweere, oleekwa onye nke na-akwụsighị? Olee ihe mere i ji zaa otú ahụ?

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE . . .

Obi ike.

․․․․․

Ịkwụsi ike n’ihe i kweere.

․․․․․

Otú Jehova si echebe ndị na-erubere ya isi n’atụghị egwu.

․․․․․

Mgbe ị nọ ná nsogbu, olee otú ịkwụsi ike n’ihe ndị i kweere nwere ike isi mee ka i mee ihe ziri ezi?

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ BỤRỤ NA I NWEGHỊ BAỊBỤL, GWA NDỊÀMÀ JEHOVA KA HA NYE GỊ OTU, MA Ọ BỤ GỊ AMATAKWUO BANYERE YA NA www.watchtower.org na www.jw.org

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya