Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 9/1 p. 15
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite nke Ndụ Ezinụlọ Jisọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ọ̀ Dịwo Mgbe Ọ Bụla Ị Jụrụ?
    Teta!—1996
  • Jizọs Mụtara Irube Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • A Kpọrọ Ha “Ụmụ Égbè Eluigwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 9/1 p. 15

Ị̀ Maara?

Ò nwere ndị so ná ndịozi iri na abụọ Jizọs bụ́ ndị ikwu ya?

▪ Akwụkwọ Nsọ azaghị ajụjụ a kpọmkwem. Ma, ihe àmà ụfọdụ e nwere na akụkọ ọdịnala ndị Juu na-egosi na ụfọdụ n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ bụ ndị ikwu Jizọs.

Ndị dere Oziọma ndị dị na Baịbụl kwuru aha ndị inyom nọ na-ele Jizọs anya mgbe ọ na-anwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. Jọn 19:25 kpọrọ anọ n’ime ha aha, sị: “Nne ya [Meri] na nwanne nne ya nke nwaanyị; Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin.” Iji amaokwu a tụnyere otú Matiu na Mak si kọọ otu akụkọ ahụ nwere ike ime ka anyị kwubie na nwanne nne Jizọs bụ Salomi. Salomi a yikwaranụ ka ọ̀ bụ nne ụmụ Zebedi. (Matiu 27:55, 56; Mak 15:40) Ụmụ ya nwoke, bụ́ ndị a kpọrọ Jems na Jọn n’ebe ọzọ, ga-abụ ụmụ nwanne nne Jizọs. Jizọs kpọrọ ụmụnne abụọ a, ndị bụ́ ndị ọkụ azụ̀, ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.—Matiu 4:21, 22.

Akụkọ ọdịnala ọzọ na-esiteghị na Baịbụl na-ekwu na Klopas, ma ọ bụ Alfịọs, bụ́ di nke otu n’ime ndị inyom ahụ a kpọrọ aha na Jọn 19:25, bụ nwanne Josef, bụ́ nna Jizọs n’ụwa. Ọ bụrụ na akụkọ ọdịnala a bụ eziokwu, ọ pụtara na Jems nwa Alfịọs, bụ́ onye ọzọ so ná ndịozi iri na abụọ ahụ, bụ nwa nwanne nna Jizọs.—Matiu 10:3.

Olee otú Jizọs na Jọn Onye Na-eme Baptizim si bụrụ ndị ikwu?

▪ Ụfọdụ kweere na Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ nwa nwa nwanne nne Jizọs. Nkwenkwe a si n’otú na-edoghị anya e si sụgharịa Luk 1:36. Dị ka ihe atụ, King James Version kwuru n’amaokwu ahụ na nne Jọn, bụ́ Elizabet, bụ nwa nwanne nne nne Jizọs, bụ́ Meri.

Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na na Grik e ji dee Baịbụl, amaokwu a akapịghị okwu ahụ ọnụ. O gosiri naanị na ndị inyom abụọ ahụ bụ ndị ikwu, ọ bụchaghị na Elizabet bụ nwa nwanne nne Meri. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Dictionary of the Bible si kwuo, “okwu ahụ pụtara ọtụtụ ihe nke na ọ gaghị enyere anyị aka ikwu kpọmkwem otú ha si bụrụ ndị ikwu.” Ya bụrụ otú ahụ, oleezi otú e si malite ikwu na Jọn bụ nwa nwanne nne Jizọs? Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia zara, sị: “Ihe niile anyị maara banyere . . . nne na nna Meri . . . si n’ihe odide apọkrịfa.”

N’ihi ya, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ọ dị otú Jizọs na Jọn si bụrụ ndị ikwu, ọ bụ ezie na o nwere ike ịbụ na Jọn abụghị nwa nwa nwanne nne Jizọs.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya