Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 11/1 p. 31
  • M̀ kwesịrị isonyere okpukpe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • M̀ kwesịrị isonyere okpukpe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmadụ Ò Kwesịrị Inwe Okpukpe Ọ Nọ na Ya?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • 5 Ọ̀ Bụ Eziokwu na Otú Ọ Bụla Anyị Si Efe Chineke Dị Chineke Mma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ì Kwesịrị Inwe Okpukpe Ị Na-ekpe?
    Teta!—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 11/1 p. 31

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

M̀ kwesịrị isonyere okpukpe?

▪ Ọ̀ na-esiri gị ike isonyere okpukpe ọ bụla n’ihi na ihu abụọ na adịghị n’otu nke ndị na-aga chọọchị na nke ndị ụkọchukwu na-asọ gị oyi? Ya bụrụ otú ahụ, o nwere ike ịbụ na i kweere nnọọ ilu ndị Frans a, “Ọ bụghị ibi ụlọ ụka nso bụ ịnọ Chineke nso.”

Ikekwe, ị na-akwanyere Baịbụl ùgwù ma chee na gọọmenti na ndị ọzọ kwesịrị ịhapụ mmadụ ka o kpewe okpukpe ọ bụla ọ chọrọ. Ma, i nwere ike ịnọ na-eche, sị, ‘Chineke ò kwuru n’ezie na ndị chọrọ ife ya otú ọ na-achọ aghaghị ịnọ n’otu okpukpe?’

Azịza ya dị nkenke bụ ee. Olee ihe mere anyị ga-eji jide nke ahụ n’aka? Mmadụ ò nwekwara nnọọ ike ịnọ n’okpukpe ọ bụla sọrọ ya?

Tụlee ihe nlereanya Jizọs. Ò nwere okpukpe ọ nọ na ya? Mgbe Jizọs dị obere, ọ na-eso ezinụlọ ya bụ́ ndị Juu na ndị ọzọ aga efe ofufe na Jeruselem. (Luk 2:41-43) Mgbe Jizọs toro, o so ndị Juu ibe ya fee Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’obodo ya. (Luk 4:14-16) Mgbe Jizọs na-agwa nwaanyị nọ n’okpukpe ọzọ okwu, Jizọs kwuru, sị: “Anyị na-efe ihe anyị maara.” (Jọn 4:22) Ihe Jizọs kwuru ebe a gosiri nnọọ na ọ nọ n’okpukpe ndị Juu.

Jizọs mechara kwuo na ebe ọ bụ na mba ndị Juu jụrụ ya, Chineke ga-ajụ ofufe ha rụrụ arụ. (Matiu 23:33–24:2) Ma, o kwuru ihe gosiri na ndị chọrọ ife Chineke ofufe ọ na-anabata aghaghị ịnọ n’okpukpe. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ọ ga-esiri onye na-eso ụzọ Kraịst nke ya na ndị kwere ekwe ibe ya na-anaghị akpakọrịta ike ịhụ ha n’anya. N’ezie, Jizọs kwuru hoo haa na okpukpe niile nọ n’ụzọ abụọ. Ọ kọwara na otu bụ okporo ụzọ “sara mbara ma dị obosara” nke na-eduba “ná mbibi.” Ma, o kwuru, sị: “Ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.”—Matiu 7:13, 14.

N’ihi ya, o doro anya na ọ bụghị okpukpe ọ bụla ga-eduga mmadụ ná ndụ. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara isonyere ndị “ga-eyi ndị okpukpe ma ha ajụwo ike ya.” Okwu Chineke kwukwara, sị, “zere ndị dị otú ahụ.” (2 Timoti 3:5, The NET Bible) N’aka nke ọzọ, anyị ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị achọta ndị nọ n’ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ ma sonyere ha. Ha ga na-agba anyị ume ma na-akwado anyị ugbu a, anyị ga-enwekwa ezigbo olileanya maka ọdịnihu.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Olee otú ị ga-esi mata okpukpe nke nọ n’ụzọ ahụ dị warara? Ọ́ gaghị adị mma ka ị tụlee otú Baịbụl si zaa ya n’isi nke 15 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?a Isiokwu ahụ ga-enyere gị aka ịmata okpukpe nke i kwesịrị isonyere.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya