Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 6/1 p. 12
  • Ezigbo Ndị Kraịst Niile hà Ga-aga Eluigwe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezigbo Ndị Kraịst Niile hà Ga-aga Eluigwe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ndị Ọma Niile Hà Ga-aga Eluigwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 6/1 p. 12

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Ezigbo Ndị Kraịst Niile hà Ga-aga Eluigwe?

▪ “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ọtụtụ ndị agụọla okwu a na-akasi obi Jizọs kwuru. Ma, ihe Jizọs na-ekwu ọ̀ bụ na ndị niile na-efe Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, ga-aga biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi, nwewe obi ụtọ ebe ahụ?

Chebagodịrị ihe a Jizọs kwuru echiche: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe ma e wezụga onye ahụ nke si n’eluigwe rịdata, bụ́ Nwa nke mmadụ.” (Jọn 3:13) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị fere Chineke n’oge ochie, dị ka Noa, Ebreham, Mozis, na Devid, agaghị eluigwe. (Ọrụ 2:34) Oleezi ebe ha gara? E kwuo ya ná nkenke, ha anwụọla, ha nọ n’ili, ha amaghịkwa ihe ọ bụla. Ha nọ ebe ahụ na-echere mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ.—Ekliziastis 9:5, 6; Ọrụ 24:15.

Ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ kwuru na e nwere ndị ga-aga eluigwe mgbe ha nwụchara. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-akwadebere ha ebe obibi n’eluigwe. (Jọn 14:2, 3) A gwatụbeghị ndị na-efe Chineke ụdị ihe a mbụ. Pọl onyeozi mechara kwuo na mgbe Jizọs nwụchara, a kpọlite ya n’ọnwụ, ya alaghachi n’eluigwe, na Jizọs ‘megheere ndị na-eso ụzọ ya ụzọ ọhụrụ nke dịkwa ndụ,’ ya bụ, ụzọ nke ọ na-enwebeghị mmadụ gatụrụla na ya.—Ndị Hibru 10:19, 20.

Nke a ọ̀ pụtara na malitezie mgbe ahụ gawa na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe? Mba. Ihe mere a ga-eji nwee ndị a ga-akpọlite ka ha gaa eluigwe bụ na e nwere ọrụ a chọrọ ka ụfọdụ ndị gaa rụọ n’eluigwe. N’abalị ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ, ọ gwara ha na ha ‘ga-anọdụ ala n’ocheeze iji kpee ikpe’ n’Alaeze ya n’eluigwe. N’ihi ya, ihe ha na-aga ịrụ bụ iso Jizọs chịa n’eluigwe.—Luk 22:28-30.

E wezụga ndịozi Jizọs, e nwere ndị ọzọ e nyere ọrụ a pụrụ iche. Jọn onyeozi hụrụ Jizọs n’ọhụụ ka ya na ndị a kpọlitere n’ọnwụ nọ n’eluigwe. A kpọrọ ha “otu alaeze na ndị nchụàjà, ha ga-achịkwa ụwa dị ka ndị eze.” (Mkpughe 3:21; 5:10) Hà dị mmadụ ole? N’obodo ọ bụla, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-abụ ndị ọchịchị. Otú ahụ ka ọ dịkwa Alaeze eluigwe a. Naanị otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị “e si n’etiti ụmụ mmadụ zụta,” ga-eso Jizọs, bụ́ Nwa Atụrụ Chineke, chịa.—Mkpughe 14:1, 4, 5.

N’eziokwu, otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ dị obere ma e were ya tụnyere ndị ezi omume niile dịrịla ndụ kemgbe ụwa. Ma, nke a ekwesịghị iju anyị anya n’ihi na ihe mere e ji akpọlite otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ahụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe bụ ka ha nwee ike ịrụ ọrụ dị nsọ n’eluigwe. Ka e were ya na ị chọrọ ịrụ ụlọ, ọ̀ bụ ndị niile na-arụ ụlọ n’obodo unu ka ị ga-akpọ ka ha bịa rụọrọ gị ụlọ ahụ? Mbanụ. Naanị mmadụ ole ga-ezu ka ị ga-akpọ. Otú ahụ ka Chineke mekwara. Ọ bụghị ndị ezi omume niile ka ọ họọrọ ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe.

Ọchịchị ahụ nke ga-esi n’eluigwe na-achị ga-emezu ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Jizọs na otu narị puku mmadụ na puku iri anọ na puku anọ ahụ ya na ha ga-eso achị ga-ahụ na e mere ka ụwa niile ghọọ paradaịs, bụ́ ebe ọtụtụ ndị ezi omume ga-ebi n’obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 45:18; Mkpughe 21:3, 4) Ụfọdụ n’ime ndị ahụ ga-ebi n’ụwa mgbe ahụ ga-abụ ndị Chineke ga-akpọlite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

Ndị niile fere Jehova n’oge ochie na ndị niile na-efe ya taa nwere ike inweta onyinye ahụ na-enweghị atụ, nke bụ́ ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 6:23) Ụfọdụ n’ime ha ga-enweta ndụ n’eluigwe n’ihi ọrụ pụrụ iche ha na-aga ịrụ n’ebe ahụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ ga-enweta ndụ n’ụwa mgbe ụwa niile ga-aghọ paradaịs.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya