Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 11/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ezigbo Ndị Kraịst Niile hà Ga-aga Eluigwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Ọma Niile Hà Ga-aga Eluigwe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 11/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ole ndị ga-aga eluigwe, gịnịkwa ka ha na-aga ime n’ebe ahụ?

Ọtụtụ ndị chọrọ ịga eluigwe. Jizọs gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi na ha ga-aga eluigwe. Tupu ya anwụọ, o kwere ha nkwa na ya na-aga idoziri ha ebe obibi n’ụlọ Nna ya nke eluigwe.—Gụọ Jọn 14:2.

Gịnị mere a ga-eji si n’ụwa kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha gaa dịrị ndụ n’eluigwe? Gịnị ka ha na-aga ime n’ebe ahụ? Jizọs gwara ndịozi ya na ha ga-abụ ndị eze. Ha ga-achị ụwa.—Gụọ Luk 22:28-30; Mkpughe 5:10.

Ọ̀ bụ ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe?

N’ọtụtụ obodo, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole na-abụ ndị ọchịchị. Ebe ọ bụ na ihe mere Jizọs ji akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe bụ ka ha soro ya chịa ụwa, ihe ọ pụtara bụ na ndị ga-aga eluigwe dị ole na ole. (Luk 12:32) Baịbụl kwuru kpọmkwem mmadụ ole ga-eso Jizọs chịa ụwa.—Gụọ Mkpughe 14:1.

Jizọs edozierela ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ebe ha ga-ebi n’eluigwe. Ị̀ ma ihe ha ga-eme n’ebe ahụ?

Ma, ọ bụghị naanị ndị ahụ ga-aga eluigwe ka Chineke ga-agọzi. Ọtụtụ ndị na-erubere Chineke isi, bụ́ ndị Alaeze Jizọs ga-achị, ga-adị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi n’oge a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. (Jọn 3:16) Ụfọdụ ndị ga-abanye na paradaịs ahụ bụ ndị dị ndụ hụ mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume nọ n’ụwa ugbu a. Ma ndị ọzọ ga-abụ ndị e si n’ọnwụ kpọlite.—Gụọ Abụ Ọma 37:29; John 5:28, 29.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 8 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwere ike ịdanlodu akwụkwọ a n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya