Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 11/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 11/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

Ebe ndị mmadụ na-anabata ndị e si n’ọnwụ kpọlite na Paradaịs

N’eziokwu, Onye nyere anyị ndụ ga-emeli ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ

Jehova Chineke bụ Isi Iyi nke ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ebe ọ bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị akpọliteli ndị nwụrụ anwụ? Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15) Ma, gịnị mere ọ ga-eji kpọlite ha?

Ihe Onye kere anyị bu n’obi kee anyị bụ ka anyị dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Jenesis 1:31; 2:15-17) Ọ ka bụkwa ihe ọ chọrọ imere anyị. Ọ na-ewute ya na ndụ anyị jupụtara ná nsogbu nakwa na ọ naghị ara ahụ́ anyị anwụọ.—Gụọ Job 14:1, 14, 15.

Olee ebe ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-ebi?

Chineke ò kere ụmụ mmadụ ka ha biri n’eluigwe? Mba. Chineke kere ndị mmụọ ozi ka ha biri n’eluigwe. Ma, o kere ụmụ mmadụ ka ha biri n’ụwa. (Jenesis 1:28; Job 38:4, 7) Ngwa, chegodị gbasara ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Ọ kpọlitere ha, ha adịrịkwa ndụ n’ụwa ebe a. Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ọtụtụ n’ime ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ha ga-adịghachikwa ndụ n’ụwa.—Gụọ Jọn 5:28, 29; 11:44.

Ma, e nwere mmadụ ole na ole Chineke ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. Ha ga-enwe ahụ́ nke mmụọ. (Luk 12:32; 1 Ndị Kọrịnt 15:49, 50) Ndị ahụ ga-aga eluigwe ga-eso Kraịst chịa ụwa dị ka ndị eze.—Gụọ Mkpughe 5:9, 10.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 7 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya