Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 6/1 p. 13-15
  • Chineke Ò Nwere Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya n’Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ò Nwere Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya n’Ụwa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Izrel Oge Ochie—Mba A Haziri nke Ọma
  • A Haziri Ndị Mbụ Soro Ụzọ Kraịst nke Ọma
  • Otú Chineke Si Egosi na Ya Hụrụ Ndị Ya n’Anya
  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Nọrọ ná Nchebe Dị Ka Akụkụ nke Nzukọ Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova Na-ahazi Ihe Ya Ahazi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 6/1 p. 13-15

Chineke Ò Nwere Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya n’Ụwa?

CHINEKE haziri ihe niile o kere eke ahazi nke ọma. Ọ bụghị naanị ihe ndị a na-ahụ anya ka ọ haziri ahazi, kamakwa Baịbụl gosiri na ọ haziri nnọọ otú ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe si eje ozi. Daniel onye amụma hụrụ ọtụtụ ndị mmụọ ozi n’ọhụụ ka ha guzo n’ihu ocheeze Chineke. O kwuru banyere ha, sị: “E nwere puku kwuru puku ndị nọ na-ejere ya ozi, nakwa iri puku kwuru iri puku ndị guzo n’ihu ya.” (Daniel 7:9, 10) Chegodị echiche otú e si hazie nnọọ imeriime ndị mmụọ ozi a ahazi, bụ́ ndị karịrị otu narị nde, nke na ha na-enwe ike ijere Chineke ozi ma na-eme ihe ọ chọrọ ka ha meere ndị na-efe ya n’ụwa!—Abụ Ọma 91:11.

Ọ bụ eziokwu na Jehova Chineke, bụ́ Onye kere ihe niile, haziri ihe niile o kere eke nke ọma, ọ bụghị onye aka ike ma ọ bụ onye na-anaghị echebara ndị ọzọ echiche. Kama, ọ bụ Chineke obi ụtọ, onye na-echebara ndị niile o kere eke echiche, na-achọkwa ka ihe dịrị ha mma. (1 Timoti 1:11; 1 Pita 5:7) O gosiri nke a n’otú o si mesoo mba Izrel oge ochie na ndị mbụ soro ụzọ Kraịst.

Izrel Oge Ochie—Mba A Haziri nke Ọma

Jehova Chineke si n’aka Mozis hazie ụmụ Izrel ka ha nwee ike ife ya otú ọ chọrọ. Chegodị otú ụmụ Izrel si ama ụlọikwuu ha mgbe ha nọ n’ala ịkpa Saịnaị. O doro anya na ihe gaara adị ghaa ghaa ghaa ma ọ bụrụ na e kwere ka ezinụlọ ọ bụla na-ama ụlọikwuu ha ebe ọ bụla dị ha mma. Jehova gwara mba ahụ ebe ebo nke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu. (Ọnụ Ọgụgụ 2:1-34) N’iwu Chineke nyere ụmụ Izrel, ọ gwakwara ha otú ha ga-esi na-adị ọcha na ihe ndị ha ga-eme ka ahụ́ na-adị ha mma. Dị ka ihe atụ, ọ gwara ha ihe ha ga-eme banyere ịga mposi.—Diuterọnọmi 23:12, 13.

Mgbe ụmụ Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ, e nwere ọtụtụ ụzọ e si hazie ha nke ọma. E kere mba ahụ ebo iri na abụọ, kenyekwa ebo nke ọ bụla ala nke ya. Iwu ahụ Jehova si n’aka Mozis nye mba ahụ kwuru ọtụtụ ihe banyere otú ụmụ Izrel ga-esi na-ebi ndụ. Ụfọdụ bụ banyere alụmdi na nwunye, ezinụlọ, ịmụ ihe, ịzụ ahịa, ịkọ ugbo, ịkpa anụ, ụdị nri ha ga na-eri, otú ha ga-esi na-efe Chineke, na ihe ndị ọzọ.a Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ kwuru kpọmkwem ihe Jehova chọrọ ka ndị ya mee, kwuokwa otú ha ga-esi eme ha, iwu niile ahụ mere ka ha nwee obi ụtọ, gosikwa na Jehova hụrụ ha n’anya. Jehova gọziri ụmụ Izrel maka na ha rubere isi n’iwu ndị a.—Abụ Ọma 147:19, 20.

Ọ bụ eziokwu na Mozis maara otú e si edu ndú nke ọma, ọ bụghị ya mere o ji nwee ihe ịga nke ọma n’idu ụmụ Izrel, kama ọ bụ n’ihi na o rubere isi n’otú Chineke gwara ya ka o si duo ndị ya. Dị ka ihe atụ, olee otú Mozis si mata ụzọ ha ga-eso n’ala ịkpa ahụ? Jehova ji ogidi ígwé ojii gosi ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ gosi ha ụzọ n’abalị. (Ọpụpụ 13:21, 22) Ọ bụ ezie na Chineke ji ụmụ mmadụ duo ndị ya, ọ bụ yanwa bụ́ Jehova haziri ndị ya ma duzie ha. Otu ihe ahụ mekwara n’oge Ndị Kraịst.

A Haziri Ndị Mbụ Soro Ụzọ Kraịst nke Ọma

Ndịozi na ndị na-eso ụzọ Jizọs ji obi ha niile kwusaa ozi ọma, nke a mere ka e nwee ọgbakọ Ndị Kraịst n’ọtụtụ obodo ndị dị n’Eshia nakwa na Yurop na narị afọ mbụ. Ọ bụ ezie na ọgbakọ ndị a dị n’ebe dị iche iche, nke ọ bụla anaghị eme otú ọ sọrọ ya, ha anaghịkwa eme ihe iche iche. Kama nke ahụ, a haziri ha nke ọma, ha ritekwara uru ná ntụziaka ndịozi Jizọs na-enye ha. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gwara Taịtọs ka ọ gaa Krit gaa ‘dozie ihe niile gahiere agahie.’ (Taịtọs 1:5) Pọl degakwaara ọgbakọ dị na Kọrịnt akwụkwọ ozi, gwa ha na ụfọdụ ụmụnna nwere “ikike inye nduzi” ma ọ bụ “ịchịkọta ihe niile n’usoro.” (1 Ndị Kọrịnt 12:28, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ma, ònye nyeere ha aka ịhazi ihe niile otú ahụ? Pọl kwuru na ọ bụ “Chineke jikọtara,” ma ọ bụ haziri, ọgbakọ ya.—1 Ndị Kọrịnt 12:24.

Ọ bụghị ndị a họpụtara ka ha na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst nwe Ndị Kraịst ha na-elekọta, kama, ha bụ ‘ndị ọrụ ibe ha.’ Ndị nlekọta a na-emekwa ihe mmụọ Chineke gwara ha mee, ha kwesịkwara ịbụrụ “ìgwè atụrụ ahụ ihe nlereanya.” (2 Ndị Kọrịnt 1:24; 1 Pita 5:2, 3) Ọ bụ Jizọs Kraịst, onye nọzi n’eluigwe, bụ “isi nke ọgbakọ ahụ,” ọ bụghị mmadụ nkịtị ma ọ bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè.—Ndị Efesọs 5:23.

Mgbe ọgbakọ dị na Kọrịnt bidoro ime ihe otú dị nnọọ iche n’otú ọgbakọ ndị ọzọ si eme ihe, Pọl degaara ha akwụkwọ ozi, sị ha: “Gịnị? Ọ̀ bụ n’ebe unu nọ ka okwu Chineke si pụta, ka ọ̀ bụ naanị n’ebe unu nọ ka o ruru?” (1 Ndị Kọrịnt 14:36) Pọl jụrụ ha ajụjụ a ga-eme ka ha chee echiche ma nyere ha aka ịghọta na ha ekwesịghị ime ihe otú dị iche n’otú ndị ọzọ na-eme. Mgbe ọgbakọ ahụ rubere isi ná ntụziaka ndịozi ahụ nyere ha, ha mụbara n’ọnụ ọgụgụ ma mewe nke ọma.—Ọrụ 16:4, 5.

Otú Chineke Si Egosi na Ya Hụrụ Ndị Ya n’Anya

Oleekwanụ maka taa? Ụfọdụ ndị anaghị achọ iso ndị ọzọ na-efe Chineke. Ma Baịbụl gosiri na kemgbe ụwa, Chineke na-enwe ndị ọ haziri ahazi ọ na-eji emezu nzube ya. Ọ haziri ndị fere ya ofufe n’Izrel oge ochie nke ọma, haziekwa otú Ndị Kraịst oge gboo si fee ya.

Ebe ọ dị otú ahụ, o kwesịrị ịbụ na Jehova Chineke ka na-eduzi ndị ya otú o mere n’oge gara aga. N’eziokwu, otú o si na-ahazi ndị na-efe ya ma na-eme ka ha dịrị n’otu na-egosi na ọ hụrụ ha n’anya ma na-elekọta ha. Taa, Jehova na-eji ndị ya ọ haziri ahazi emezu nzube ya maka ụmụ mmadụ. Olee otú mmadụ nwere ike isi mata ha? Ka anyị tụlee otú e si amata ha.

▪ A haziri ezigbo Ndị Kraịst otú ha ga-enwe ike ịrụzu ọrụ e nyere ha. (Matiu 24:14; 1 Timoti 2:3, 4) Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha kwusaa ozi ọma Alaeze ná mba niile. Ọrụ a agaghị enwe isi ọ gwụla ma è nwere ndị a haziri ahazi ga-arụ ya n’ụwa niile. Dị ka ihe atụ, ọ gaghị esiri gị ike inye otu onye nri. Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ inye ọtụtụ puku mmadụ, ma ọ bụkwanụ ọtụtụ nde mmadụ, nri, ọ bụghị naanị gị ga-eme ya. Ọ ga-adị mkpa ka i nwee ndị a haziri nke ọma, bụ́ ndị ga-arụkọkwa ọrụ ọnụ. Ezigbo Ndị Kraịst ‘na-ejikọta aka ọnụ,’ ma ọ bụ na-eji “otu obi,” arụ ọrụ e nyere ha. (Zefanaya 3:9; Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ozi ọma a a ga-eji asụsụ dị iche iche kwusaa ná mba dị iche iche, bụ́kwanụ nke a ga-ekwusara agbụrụ dị iche iche, ọ̀ ga-enwe isi ma ọ bụrụ na e nweghị ndị dị n’otu a haziri ahazi ga-arụ ya? Azịza ya doro anya.

▪ A haziri ezigbo Ndị Kraịst otú ha ga-enwe ike inyere ibe ha aka na ịgbarịta ibe ha ume. Ọ bụrụ na onye maara egwu mmiri nke ọma na ndị na-amaghị egwu mmiri esoro gaa igwu mmiri, ndị ahụ na-amaghị egwu mmiri agaghị ekwe ya gwuo mmiri otú ọ chọrọ n’ihi na ha ga-achọ ka ọ na-enyere ha aka. N’ihi ya, o nwere ike ikpebi ịga gwuo mmiri naanị ya. Ma, ọ bụrụ na ọ banye ná nsogbu, ọ gaghị enwe onye ga-enyere ya aka. Nke a gosiri na mmadụ ịkpa iche adịghị mma. (Ilu 18:1) Ndị Kraịst ga-enwe ike ịrụzu ọrụ ahụ Jizọs nyere ha ma ọ bụrụ na ha ana-enyere ibe ha aka ma na-agba ibe ha ume. (Matiu 28:19, 20) Ọgbakọ Ndị Kraịst na-eji Baịbụl azụ Ndị Kraịst niile ma na-agba ha ume ka ha jisie ike n’okwukwe ma ghara ịda mbà. Ebee ka mmadụ ga-aga mụta iwu Jehova ma ọ bụrụ na e nweghị ọmụmụ ihe a haziri ahazi nke Ndị Kraịst na-enwe, bụ́ ebe a na-akụzi otú e si efe Chineke?—Ndị Hibru 10:24, 25.

▪ A haziri ezigbo Ndị Kraịst ka ha nwee ike dịrị n’otu na-efe Chineke. Ọ bụrụ na ndị bụ́ atụrụ Jizọs egee ntị n’olu ya, ha na-abịa soro “otu ìgwè atụrụ” nke ọ na-edu. (Jọn 10:16) Ha anaghị anọ na chọọchị dị iche iche ma ọ bụ n’òtù dị iche iche; ihe otu onye kweere anaghị adị iche na nke ibe ya. Kama nke ahụ, ha niile “na-ekwu otu ihe.” (1 Ndị Kọrịnt 1:10) Ihe ga-eme ka anyị dịrị n’otu bụ ime ihe n’usoro, anyị agaghịkwanụ eme ihe n’usoro ma ọ bụrụ na a hazighị anyị ahazi. Ọ bụkwa naanị ndị dị n’otu ka Chineke na-agọzi.—Abụ Ọma 133:1, 3.

Ọtụtụ nde mmadụ abịala soro ndị Chineke bụ́ ndị na-eme ihe ndị a anyị tụlere na ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru. Ihe mere ha ji mee nke a bụ na ha hụrụ Chineke n’anya ma nwee mmasị n’eziokwu dị na Baịbụl. Ndịàmà Jehova n’ụwa niile, bụ́ ndị a haziri ahazi ma dịrị n’otu, na-agbalị ime uche Chineke. Obi siri ha ike na Jehova na-emezu ihe a o kwere ná nkwa, nke bụ́: “M ga-ebi n’etiti ha, na-ejegharịkwa n’etiti ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.” (2 Ndị Kọrịnt 6:16) Ngọzi a ga-erukwa gị aka ma ọ bụrụ na i soro ndị Chineke a haziri ahazi na-efe Jehova Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Gụọ akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Nke 2, peeji nke 214-220. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

[Foto dị na peeji nke 13]

A haziri otú ụmụ Izrel si ama ụlọikwuu ahazi

[Foto ndị dị na peeji nke 14, 15]

Ka e nwee ike kwusaa ozi ọma n’ụwa niile ọ dị mkpa na a ga-ahazi ya ahazi

Ikwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ

Ịgbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka

Mgbakọ dị iche iche

Iwu ebe ndị a na-anọ efe Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya