Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 14 ajụjụ 1-4
  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Chineke Ò Nwere Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya n’Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ì Kwesịrị Inwe Okpukpe Ị Na-ekpe?
    Teta!—2012
  • Otú E Si Ahazi Ọgbakọ na Otú E Si Eduzi Ya
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 14 ajụjụ 1-4

ISI NKE 14

Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?

1. Gịnị mere Chineke ji họrọ mba Izrel ka ha bụrụ ndị ya?

1. Ndị Izrel oge ochie; 2. Ebe Ndị Kraịst oge ochie na-ezi ozi ọma

Chineke kpọkọtara ụmụ Ebreham, mee ka ha ghọọ otu mba. Ọ bụ ha ka ọ kpọrọ “Izrel.” Chineke nyere ha iwu ndị ga na-achị ha, gwakwa ha otú ọ chọrọ ka ha si na-efe ya. Ihe mere o ji mee ya bụ ka mba ndị ọzọ si n’aka ha mụta iwu ya ma fee ya otú ọ chọrọ. (Abụ Ọma 147:19, 20) Ọ bụrụ na mba niile ana-ele ha anya ma na-eme ka ha, ọ ga-abara ha uru.​—Gụọ Jenesis 22:18.

Chineke họọrọ ụmụ Izrel ka ha bụrụ ndị àmà ya. Akụkọ ụmụ Izrel mere ka anyị mata na mmadụ na-eme ihe Chineke kwuru, ọ na-abara onye ahụ uru. (Diuterọnọmi 4:6) N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị mmadụ agụọ Baịbụl gụta akụkọ gbasara ụmụ Izrel, ha ga-amatakwu onye ezi Chineke bụ.​—Gụọ Aịzaya 43:10, 12.

2. Gịnị mere Chineke ji họrọ ezigbo Ndị Kraịst ka ha fewe ya?

Mba Izrel mechara kwụsị ife Jehova otú ọ chọrọ. N’ihi ya, Jehova ji ọgbakọ Ndị Kraịst dochie ha. (Matiu 21:43; 23:37, 38) Ọ bụ mba Izrel bụbu ndị àmà Jehova. Ma ugbu a, ọ bụ ezigbo Ndị Kraịst bụ ndị àmà ya.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:14, 17.

Jizọs haziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile ma na-eme ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 10:7, 11; 24:14; 28:19, 20) Anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa ọjọọ a, a rụmiekwala ọrụ ikwusa ozi ọma a. Taa, Jehova emeela ka ọtụtụ nde mmadụ, ndị si n’ebe dị iche iche n’ụwa, jiri otu obi na-efe ya otú ọ chọrọ. E nwetụbeghị mgbe ọtụtụ ndị ji otu obi otú a na-efe Jehova. (Mkpughe 7:9, 10) Ezigbo Ndị Kraịst na-agbarịtakwa ibe ha ume ma na-enyere ibe ha aka. N’ụwa niile, ọ bụ otu ihe ka ha niile na-amụ n’ụlọ nzukọ ha. Ihe niile ha na-amụ sikwa na Baịbụl.​—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

3. Olee otú Ndịàmà Jehova nke oge a si malite?

Ebe Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma n’ihe dị ka na narị afọ gara aga nakwa ebe ha na-ezi ozi ọma n’oge anyị a; magazin ndị e biri n’asụsụ dị iche iche.

Ọ bụ n’afọ 1870 ka Ndịàmà Jehova nke oge a malitere. N’oge ahụ, e nwere mmadụ ole na ole bịakọtara ọnụ ma malite ịmụ Baịbụl. Ka ha na-amụ ya, ha chọpụtara ọtụtụ eziokwu Baịbụl na-akụzi bụ́ ndị e leghaara anya kemgbe. Ha ma na Jizọs haziri ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha na-ekwusa ozi ọma, ọ bụ ya mere ha ji malite ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Ma, ọ bụ n’afọ 1931 ka ha maliteziri ịza Ndịàmà Jehova.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 1:8; 2:1, 4; 5:42.

4. Olee otú e si hazie ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ekwusa?

N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e nwere ọgbakọ Ndị Kraịst ná mba dị iche iche. Ọ bụkwa ndịozi Jizọs na ndị okenye nọ na Jeruselem na-elekọta ma na-ahazi ha. Ha ma na ọ bụ Jizọs bụ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 16:4, 5) Taa, Ndịàmà Jehova nwekwara ndị ikom na-ahazi ọrụ ha n’ụwa niile. A na-akpọ ha Òtù Na-achị Isi. Ndị a bụ ndị okenye ma nke a na-akọ n’Okwu Chineke, ha anọteekwala aka n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ha na-ahụ maka alaka ụlọ ọrụ dị iche iche Ndịàmà Jehova nwere n’ụwa niile. N’alaka ụlọ ọrụ ndị ahụ, a na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, na-ebi ha, ma na-ekesara ha ndị mmadụ n’ihe karịrị narị asụsụ isii. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-eji Okwu Chineke agba ọgbakọ Ndịàmà Jehova niile ume ma na-agwa ha ihe a ga-eme. Ọgbakọ ndị a karịrị otu narị puku n’ụwa niile. E nwekwara ndị ikom na-elekọta ọgbakọ nke ọ bụla. A na-akpọ ha ndị okenye ma ọ bụkwanụ ndị nlekọta. Ndị ikom a na-elekọta atụrụ Chineke nke ọma n’ihi na ha hụrụ ha n’anya.​—Gụọ 1 Pita 5:2, 3.

A haziri Ndịàmà Jehova ka ha na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma nyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Anyị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ekwusara ha ozi ọma otú ahụ ndịozi Jizọs mere. (Ọrụ Ndịozi 20:20) Anyị na-akụzikwara ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụrụ na ha ji obi ha niile chọọ ịma eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke. Anyị bụ otu ezinụlọ, Chineke bụkwa Nna anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya. Anyị anaghị eji ụmụnna anyị egwu egwu n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya. (2 Ndị Tesalonaịka 1:3) O nweghị ndị nwere obi ụtọ n’ụwa otú anyị nwere n’ihi na anyị na-eme uche Chineke. Anyị na-enyekwara ndị mmadụ aka ka ha mụta ime uche Chineke.​—Gụọ Abụ Ọma 33:12; Ọrụ Ndịozi 20:35.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?, isi nke 19.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya