Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fg ihe ọmụmụ 15 ajụjụ 1-4
  • Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-amụkwu Gbasara Jehova?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-amụkwu Gbasara Jehova?
  • Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú I Nwere Ike Isi Bịaruo Chineke Nso?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • O Nweghị Ihe Karịrị Mmadụ na Chineke Ịbụ Enyi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • “Ịbịa Chineke Nso” Dị Anyị Mma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
fg ihe ọmụmụ 15 ajụjụ 1-4

ISI NKE 15

Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-amụkwu Gbasara Jehova?

1. Olee uru ịna-amụ Baịbụl ga-abara gị?

Ụmụ nwaanyị abụọ na-amụ Baịbụl mgbe ha na-ezu ike

E nwere ọtụtụ ihe Baịbụl na-akụzi. Ma, ihe anyị kwuru n’akwụkwọ a bụ naanị ole na ole n’ime ha. Anyị ma na ha emeela ka i kpebie ịhụkwu Jehova n’anya. I kwesịrị ịgba mbọ ka ịhụnanya a na-esikwu ike. (1 Pita 2:2) Ị ga-abịaru Chineke nso ma ị na-amụ Okwu ya. Nke a ga-emekwa ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.​—Gụọ Jọn 17:3; Jud 21.

Ị matakwuo ụdị onye Chineke bụ, okwukwe gị ga-esikwu ike. Okwukwe gị sikwuo ike, ya enyere gị aka ịna-eme uche Chineke. (Ndị Hibru 11:1, 6) Nke a ga-emezi ka i chegharịa, hapụ ihe ọjọọ ndị ị na-emebu.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.

2. Ọ bụrụ na ị na-amụ Okwu Chineke, olee uru ọ ga-abara ndị ọzọ?

Nwaanyị na-ekpe ekpere

Gị na Jehova nwere ike ịdị n’ezigbo mma

Izi ndị ọzọ ozi ọma na-atọ anyị niile ụtọ. Anyị makwa na ị ga-achọ ịkọrọ ndị ọzọ ihe ị mụtara n’Okwu Chineke. Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl, ị ga-amụta otú ị ga-esi jiri Baịbụl gwa ndị ọzọ ihe ndị ị na-amụta banyere Jehova na ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị.​—Gụọ Ndị Rom 10:13-15.

Ọ na-abụ ụfọdụ ndị chọọ ịmalite ikwusawa ozi ọma, ha ebido ná ndị ikwu na ibe ha. Ma, ọ ga-adị mma ka i jiri akọ na-ekwu okwu. Kama ịgwa ha na ha nọ n’okpukpe ụgha, gwa ha ihe ọma Chineke kwere anyị ná nkwa. Ihe ọzọ ị ga-echeta bụ na ọ bụ àgwà ọma gị ga-eme ka ndị mmadụ kweta na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu, ọ bụchaghị ihe ị gwara ha.​—Gụọ 2 Timoti 2:24, 25.

3. Olee ihe ùgwù ị ga-enwe ma ị na-amụ Okwu Chineke?

Ị na-amụ Okwu Chineke, gị na Chineke ga-adịkwu ná mma. Gị na ya ga-emecha bụrụ ezigbo enyi, gị esorokwa n’ezinụlọ ya.​—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:18.

4. Gịnị ka ị ga na-eme ka gị na Chineke dịkwuo ná mma?

Ịmụ Okwu Chineke ga-eme ka ị mụtakwuo otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. (Ndị Hibru 5:13, 14) Ị hụ Onyeàmà Jehova, gwa ya na ị chọrọ ịmụ Baịbụl. Ọ ga-eji akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? mụọrọ gị ihe. Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga na-emekwu nke ọma ná ndụ.​—Gụọ Abụ Ọma 1:1-3; 73:27, 28.

Ebe Ndịàmà Jehova na-agwa di na nwunye ka ha mụwara ha Baịbụl

Ozi ọma niile anyị kwuru okwu ha n’akwụkwọ a si n’aka Chineke, onye obi ụtọ. Ị ga-abịarukwu ya nso ma gị na Ndịàmà Jehova na-akpa. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ọ bụrụ na ị gbalịa na-eme uche Jehova, ị ga-enweta ndụ ebighị ebi. O nweghị ihe karịrị mmadụ na Chineke ịdị n’ezigbo mma.​—Gụọ 1 Timoti 1:11; 6:19.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? isi nke 18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya