ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊ NA CHINEKE NWERE IKE ỊDỊ NÁ MMA
O Nweghị Ihe Karịrị Mmadụ na Chineke Ịbụ Enyi
Olee ihe ị ga-eme ka gị na Chineke bụrụ enyi? Anyị elebala anya n’ihe ndị ị ga na-eme ka gị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. Ihe ndị ahụ bụ:
Mata na aha Chineke bụ Jehova, na-akpọkwa ya aha a.
Na-agwa ya okwu mgbe niile n’ekpere, na-amụkwa Okwu ya, bụ́ Baịbụl.
Na-eme ihe ndị ga-eme ka obi dị Jehova mma.
Gị na Chineke ga-adị ná mma ma ị na-akpọ ya aha ya, na-ekpegara ya ekpere, na-amụ Okwu ya ma na-eme ihe ga-eme ya obi ụtọ
Ị̀ ga-asị na ị na-eme ihe ndị a anyị lebarala anya ka i nwee ike ịbụ enyi Chineke? È nwere ihe ndị i chere na i kwesịrị imezikwu? Ya bụrụ otú ahụ, i kwesịrị ịgbasi mbọ ike mezie ha n’ihi na ọ ga-abara gị uru.
Otu nwaanyị bi n’Amerịka aha ya bụ Jennifer kwuru, sị: “Mbọ ọ bụla mmadụ gbara ka ya na Chineke bụrụ enyi efughị ọhịa. Onye ya na Chineke dị ná mma na-erite ọtụtụ uru: ọ ga-atụkwasịkwu Chineke obi, ọ ga-aghọtakwa ụdị onye Chineke bụ. Nke ka nke bụ na ọ ga-ahụkwu Chineke n’anya, Chineke ahụkwuo ya n’anya. O nweghị ihe karịrị mmadụ na Chineke ịbụ enyi.”
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na Chineke dịrị n’ezigbo mma, obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka. Ha nwere ike ịna-abịa na nke gị ka gị na ha mụwa Baịbụl. Ha agaghị asị gị kwụọ ụgwọ. I nwekwara ike ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ndị na-agbasi mbọ ike ka ha na Chineke dịrị ná mma, ha ga-anabatakwa gị nke ọma.a Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, obi ga-adị gị otú ọ dị otu ọbụ abụ, bụ́ onye sịrị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma.”—Abụ Ọma 73:28.
a Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Onyeàmà Jehova bịa mụwara gị Baịbụl ma ọ bụ ka ị mata ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị gị nso dị, biko, gwa Onyeàmà Jehova nyere gị magazin a ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.jw.org/ig. Ị gaa ebe ahụ, lee anya n’ala ala ebe e dere KPỌTỤRỤ ANYỊ.