Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 9/1 p. 15
  • ‘Jehova, Ị Maara M’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Jehova, Ị Maara M’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Maara Anyị Nke Ọma!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Chineke Ọ̀ Maara Gị N’ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chineke Ma Gị nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Jehova—‘Onye Na-emere Ndị Ya Ụzọ Mgbapụ’ n’Oge Baịbụl
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 9/1 p. 15

Bịaruo Chineke Nso

‘Jehova, Ị Maara M’

“O NWEGHỊ ihe na-enye nsogbu n’obi ka mmadụ ịmata na o nweghị onye hụrụ ya n’anya ma ọ bụ onye na-aghọta otú obi dị ya.”a Ì kwetara na ihe a e kwuru ebe a bụ eziokwu? Ò nwetụla mgbe ọ dị gị ka o nweghị onye hụrụ gị n’anya ma ọ bụ onye na-aghọta ihe gị na ya na-alụ, ma ya fọdụzie ịghọta otú obi dị gị? Ya bụrụ na ọ dịtụla, o nwere ihe nwere ike ịkasi gị obi. Ihe ahụ bụ na Jehova hụrụ ndị na-efe ya n’anya nke ukwuu nke na ọ na-ahụ ihe niile na-eme ná ndụ ha kwa ụbọchị. Ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma nke 139 mere ka obi sie anyị ike na nke a bụ eziokwu.

Obi siri Devid ike na Chineke nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m.” (Amaokwu nke 1) Otú a Devid si kwuo ihe a mara nnọọ mma. Okwu Hibru a sụgharịrị ‘nyochaa’ pụtakwara igwu ala iji gwute ọla (Job 28:3), ịga ledoo ala (Ndị Ikpe 18:2), ma ọ bụ ịchọpụta ihe bụ́ eziokwu mgbe a na-ekpe ikpe (Diuterọnọmi 13:14). N’ezie, Jehova ma anyị nke ọma nke na o yiri ka ò nyochaala ihe niile na-eme ná ndụ anyị. Devid na-akụziri anyị na Chineke nwere mmasị pụrụ iche n’ebe onye nke ọ bụla ná ndị na-efe ya nọ. Ọ na-enyocha ha niile, wee mata ha n’otu n’otu.

Devid mere ka anyị ghọta otú Chineke si enyocharu anyị mgbe o kwuru, sị: “Ị ma mgbe m nọdụrụ ala na mgbe m biliri ọtọ. Ị na-anọ n’ebe dị anya tụlee ihe m na-eche.” (Amaokwu nke 2) E nwere ike ikwu na Jehova nọ “n’ebe dị anya” n’ihi na o bi n’eluigwe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ma mgbe anyị nọdụrụ ala, nke nwere ike ịbụ mgbe anyị mechara ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị, marakwa mgbe anyị biliri ọtọ n’ụtụtụ ịga mee ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị. Ọ maara uche anyị, marakwa ihe ndị na-agụ anyị agụụ, na ihe ndị anyị chọrọ ime. Otú a Jehova si enyocha anyị ò mere ka ahụ́ ghara iru Devid ala? Mbanụ, kama nke ahụ, ọ gwadịrị Chineke ka o nyochaa ya. (Amaokwu nke 23, 24) Gịnị mere Devid ji mee otú ahụ?

Devid maara na Jehova bu ihe ọma n’obi na-enyocha ndị na-efe Ya. Devid gosiri nke a mgbe o dere, sị: “Ị tụwo ihe niile m na-eme atụ̀, ma mgbe m na-eme njem ma mgbe m na-edina ala, ị makwaara ọbụna ụzọ m niile.” (Amaokwu nke 3) Kwa ụbọchị, Jehova na-ahụ ‘ụzọ anyị niile,’ ya bụ, ebe ndị anyị na-emejọ na ebe ndị anyị na-eme nke ọma. Ebee ka ọ na-elekwasị anya, ọ̀ bụ n’ebe anyị na-emejọ ka ọ̀ bụ n’ebe anyị na-eme nke ọma? O nwere ike ịbụ na okwu Hibru a sụgharịrị ‘ịtụ ihe atụ̀’ pụtara “ịyọcha” ihe, ma ọ bụ “ịfụcha” ihe, dị ka otú onye ọrụ ubi si ewepụsị igbogbo ọka mgbe ọ na-afụcha ọka ma werezie ezigbo ọka. Okwu Hibru e si na ya sụgharịa okwu bụ́ “makwaara” pụtakwara “iji ihe akpọrọ ihe.” Mgbe Jehova na-enyocha ihe ndị na-efe ya na-ekwu ma na-eme kwa ụbọchị, ọ na-eji ihe ọma ndị ha na-eme akpọrọ ihe. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-atọ ya ụtọ ịhụ ka ndị na-efe ya na-agbalị ime ihe ọma.

Abụ Ọma nke 139 na-akụziri anyị na Jehova hụrụ nnọọ ndị na-efe ya n’anya. Ọ na-enyocha ha ma na-ahụ ha mgbe ha na-eme ihe niile ha na-eme n’ụbọchị. N’ihi ya, ọ ma ihe isi ike ndị na-abịara ha, ọ na-aghọtakwa obi ọjọọ ihe isi ike ndị ahụ nwere ike ịkpatara ha. Ị́ gaghị achọ ife Chineke nke hụrụ anyị n’anya otú ahụ? Ọ bụrụ na ị chọrọ, obi sie gị ike na o nweghị mgbe Jehova ‘ga-echefu ọrụ gị na ịhụnanya ị na-egosi maka aha ya.’—Ndị Hibru 6:10.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na baịbụl n’ọnwa Septemba:

◼ Abụ Ọma 119-150

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Onye dere okwu ndị a bụ onye edemede nke aha ya bụ Arthur H. Stainback.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya