Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 9/1 p. 30-31
  • E Boro Ya Ebubo Ụgha!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Boro Ya Ebubo Ụgha!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị Ga-esi Merie Ọnwụnwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Mbibi E Bibiri Sọdọm na Gọmọra
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Jizọs Gwọrọ Ndị Mmadụ Ọrịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Amamihe Jizọs Tụrụ Ndị Gere Ya Ntị n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 9/1 p. 30-31

Maka Ndị Na-eto Eto

E Boro Ya Ebubo Ụgha!

JOSEF—AGBA NKE ABỤỌ

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere, werekwa ya na ị na-ahụ ka ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

Ndị a kọrọ akụkọ ha: Josef, Pọtịfa, na nwunye ya

Ihe a kọrọ: A tụrụ Josef mkpọrọ n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ o mere. Ma, Jehova nọnyeere ya.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JENESIS 39:7, 10-23.

Olee ụdị olu i chere nwunye Pọtịfa ji na-agwa di ya okwu mgbe ahụ ọ na-aghagide Josef ụgha?

․․․․․

Kọọ otú i chere ụlọ mkpọrọ ahụ dị.

․․․․․

Olee ihe i chere e mere Josef ozugbo a tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Abụ Ọma 105:17, 18.)

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

A sị na okwukwe Josef esighị ike, olee ihe ọjọọ ọ gaara echewe n’oge ahụ ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Job 30:20, 21.)

․․․․․

Olee otú anyị si mara na Josef ataghị Jehova ụta maka ahụhụ ọ nọ na-ata? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Jenesis 40:8; 41:15, 16.)

․․․․․

Olee àgwà ọma ndị nyeere Josef aka idi mkpọrọ ahụ a tụrụ ya? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Maịka 7:7, Luk 14:11, na Jems 1:4 ma chebara ha echiche.)

․․․․․

Olee ihe mkpọrọ ahụ Josef gara kụziiri ya, oleekwa uru i chere o mechara baara ya ná ndụ? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ Jenesis 39:21-23; 41:38-43.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Uru mmadụ na-erite ma ọ tachie obi mgbe ọ nọ n’ahụhụ.

․․․․․

Ihe ndị i nwere ike ịmụta mgbe ị nọ n’ahụhụ. _______

․․․․․

Otú Jehova si enyere ndị ya aka mgbe ọnwụnwa bịaara ha.

․․․․․

ỤZỌ NDỊ ỌZỌ Ị GA-ESI MEE IHE Ị MỤTARA.

Ò nwetụla mgbe ị nọ ná nsogbu nke mere ka obi koro gị n’elu, ya adị gị ka ọ̀ bụ naanị gị nọ? N’oge ahụ, olee otú i chere Jehova si nyere gị aka? (Ihe ga-enyere gị aka: Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13 ma chebara ya echiche.)

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤKWA MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na i nweghị baịbụl, gwa ndịàmà jehova ka ha nye gị otu, ma ọ bụ gị agụọ ya n’asụsụ bekee na www.watchtower.org na www.jw.org

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya