Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 3/1 p. 19
  • “A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ Ga-eme Ka E Nwee Oké Ọṅụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • “Lee! Ana M Eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Nkasi Obi Maka Ndị Nwere ‘Mmụọ E Tigburu Etigbu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Chineke Kwere Nkwa na Ọ Ga-eme Ka Isi Zuo Ndị Mmadụ Okè
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 3/1 p. 19

Bịaruo Chineke Nso

“A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”

MGBE ụfọdụ, obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị cheta ihe ndị mere n’oge gara aga. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma anyị cheta oge ndị anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nọrịrị. Ma, e nwere ihe ndị ọ na-abụ anyị cheta, obi ajọọ anyị njọ. Ò nwere ihe ndị na-agbawa gị obi ugbu a ma i cheta ha? Ọ bụrụ na e nwere, i nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ò nwekwara mgbe ihe ndị a ga-apụ m apụ n’obi?’ Aịzaya onye amụma zara ajụjụ a nke ọma. Ihe o kwuru ga-agba anyị ezigbo ume.—Gụọ Aịzaya 65:17.

Jehova bu n’obi iwepụ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu bụ́ ndị ọ na-abụ anyị cheta, obi ajọọ anyị njọ. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-ewepụ ajọ ụwa a na nsogbu niile dị na ya, ma were ụwa nke ka ya mma dochie ya. Jehova si n’ọnụ Aịzaya kwe nkwa, sị: “Lee, m na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Ọ bụrụ na anyị aghọta nkwa a Chineke kwere, obi ga-atọ anyị ụtọ, ọ ga-emekwa ka anyị nwee olileanya.

Gịnị bụ eluigwe ọhụrụ ahụ? Baịbụl kwuru ihe abụọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ọ bụ. Nke mbụ bụ na mmadụ abụọ ọzọ so dee Baịbụl kwuru banyere eluigwe ọhụrụ ahụ, ihe ha kwuru gosiri na a ga-enwe ezigbo mgbanwe n’ụwa a. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4) Nke abụọ bụ na n’Akwụkwọ Nsọ, okwu ahụ bụ́ “eluigwe” na-anọchi anya ọchịchị mgbe ụfọdụ. (Aịzaya 14:4, 12; Daniel 4:25, 26) N’ihi ya, eluigwe ọhụrụ ahụ bụ ọchịchị ọhụrụ nke ga-eme ka e nwee ezi omume n’ụwa. E nwere naanị otu ọchịchị nke nwere ike ime ihe a niile. Ọ bụ Alaeze Chineke, nke bụ́ ọchịchị eluigwe ahụ Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere ka ọ bịa. Alaeze ahụ ga-eme ka uche ezi omume Chineke mewe n’ụwa niile.—Matiu 6:9, 10.

Ma, gịnị bụ ụwa ọhụrụ ahụ? Ka anyị leba anya n’ụzọ ihe abụọ Baịbụl kwuru bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịmata ihe ọ bụ n’eziokwu. Nke mbụ bụ na n’Akwụkwọ Nsọ, mgbe ụfọdụ, okwu bụ́ “ụwa” pụtara ndị mmadụ, ọ bụghị naanị ụwa nkịtị. (Jenesis 11:1; Abụ Ọma 96:1) Nke abụọ bụ na Akwụkwọ Nsọ buru amụma na ndị na-erubere Chineke isi ga-amụta ezi omume, ezi omume ahụ ga-ezukwa ụwa niile. (Aịzaya 26:9) N’ihi ya, ụwa ọhụrụ ahụ bụ ụmụ mmadụ ndị ga-erubere ọchịchị Chineke isi ma na-ebi ndụ otú Chineke chọrọ.

Ị̀ ghọtawala otú Jehova ga-esi ewepụ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu, bụ́ ndị ọ na-abụ anyị cheta obi ajọọ anyị njọ? N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-emezu nkwa ahụ o kwere. Ọ ga-eme ka e nwee eluigwe ọhụrụ, meekwa ka e nwee ụwa ọhụrụ nke a ga-enwe ezi omume na ya.a N’ụwa ọhụrụ ahụ, Jehova ga-akwụsị ihe niile na-akpatara anyị obi mgbawa ma anyị cheta ha. Ndụ ga-atọ ndị niile na-erubere Jehova isi ụtọ, ihe ndị ha ga na-echeta kwa ụbọchị ga-abụ ihe ga na-eme ha obi ụtọ.

Oleekwanụ maka ihe ndị nwere ike ịna-agbawa anyị obi ugbu a? Jehova sikwa n’ọnụ Aịzaya kwe nkwa, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.” Anyị ga-eji nwayọọ nwayọọ chefuo ihe na-enye anyị nsogbu n’obi n’ụwa ochie a. Nke a ọ̀ na-eme gị obi ụtọ? Ya bụrụ otú ahụ, ọ́ gaghị adị mma ka ị chọpụta otú i nwere ike isi bịarukwuo Chineke nso bụ́ onye kwere nkwa na ya ga-emere anyị ihe ọma ndị ahụ n’ọdịnihu?

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na ihe Alaeze ahụ ga-eme n’oge na-adịghị anya, gụọ isi nke 3, nke 8, na nke 9 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Mach:

◼ Aịzaya 63-66–Jeremaya 1-16

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]

Jehova bu n’obi iwepụ ihe ndị na-akpatara anyị nsogbu, bụ́ ndị ọ na-abụ anyị cheta obi ajọọ anyị njọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya