Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 25-29
  • Nkasi Obi Maka Ndị Nwere ‘Mmụọ E Tigburu Etigbu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkasi Obi Maka Ndị Nwere ‘Mmụọ E Tigburu Etigbu’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Ncheta Ndị A Bịanyụrụ Abịanyụ”
  • Ò Mere Eme n’Ezie?
  • Inye Ebe Mgbaba
  • Nọgide Na-abụ Onye Siri Ike n’Ime Mmụọ
  • Olee Banyere Onye ahụ E Boro Ebubo Mmetọ?
  • Gịnị Ka Ndị Okenye Pụrụ Ime?
  • Iguzogide Ekwensu
  • “A Gaghị Echeta Ihe Mbụ Niile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Otú Jehova Si Egosi na Ya Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi ma Mmadụ Mee Ihe Jọgburu Onwe Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ịkasi Ndị E Metọrọ Mgbe Ha Bụ Ụmụaka Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 2: Otú Ị Ga-esi Enweta Onwe Gị
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 25-29

Nkasi Obi Maka Ndị Nwere ‘Mmụọ E Tigburu Etigbu’

TAA, mmehie nke ụwa Setan ‘adịkwaghị ewute ya.’ (Ndị Efesọs 4:19; 1 Jọn 5:19) Ịkwa iko jupụtara ebe nile. N’ọtụtụ ala, 50 pasent ma ọ bụ karịa nke alụmdi na nwunye na-ejedebe n’ịgba alụkwaghịm. A na-anabata idina ụdị onwe onye ebe nile. Ime ihe ike mmekọahụ—ndina n’ike—na-apụta ọtụtụ mgbe n’akụkọ. Mmepụta ihe na-akpali agụụ ịkwa iko bụ ọrụ na-eweta ọtụtụ ijeri dollar.—Ndị Rom 1:26, 27.

Ihe so ná mmekpu ndị kasị njọ bụ mmetọ nke ụmụaka aka ha dị ọcha n’ụzọ mmekọahụ. Dịkwa ka amamihe nke ụwa Setan, mmetọ nwatakịrị n’ụzọ mmekọahụ bụ “nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị, . . . ihe ndị mmụọ ọjọọ.” (Jemes 3:15) Na United States nanị, magazin bụ́ Time na-asị, “kwa afọ ndị nkụzi na ndị dọkịta na-ewetara ndị ọchịchị mkpesa nke ihe karịrị 400,000 mwakpo mmekọahụ ndị a pụrụ ịnwapụta ịbụ eziokwu ha.” Mgbe ndị a e metọrọ ghọrọ ndị dimkpa, ọtụtụ ka na-enwe ọnyá ndị na-egbu mgbu, ọnyá ndị ahụ bụkwa ezie! Bible na-asị: “Mmụọ [echiche uche, mmetụta na echiche nile nke ime obi] mmadụ ga-anagide ọrịa ya; ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu [e merụrụ ahụ, kpagbuo], ònye ga-eburu ya?”—Ilu 18:14.

Ozi ọma nke Alaeze Chineke na-amasị ụdị mmadụ nile, tinyere “ndị obi ha tiwara etiwa” na ndị nwere “mmụọ nke inyoghị inyoghị.” (Aịsaịa 61:1-4) Ọ bụghị ihe ijuanya, ọtụtụ ndị nwere ihe mgbu nke mmetụta uche na-azaghachi n’ọkpụkpọ òkù bụ́: “Onye akpịrị na-akpọkwa nkụ, ya bịa: onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17) Ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ịbụrụ ndị a ebe nkasi obi. Ha na-aṅụrị ọṅụ ịmata na n’isi nso ahụhụ ga-aghọ ihe gara aga. (Aịsaịa 65:17) Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, ọ pụrụ ịdị ha mkpa ka a ‘kasie ha obi, kechiekwa’ ọnyá ha. N’ụzọ kwesịrị ekwesị Pọl dụrụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:14.

“Ihe Ncheta Ndị A Bịanyụrụ Abịanyụ”

N’afọ ndị na-adịbeghị anya ndị ụfọdụ abụrụwo ndị “obi ha tiwara etiwa” n’ihi ihe ndị na-esiri ndị ọzọ ike ịghọta. Ha bụ ndị dimkpa ndị, dabere n’ihe ndị a kọwaworo dị ka “ihe ncheta ndị a bịanyụrụ abịanyụ,” na-asị na e metọrọ ha n’ụzọ mmekọahụ mgbe ha bụ ụmụaka.a Ụfọdụ ndị enweghị echiche nke ịbụ ndị e metọworo ruo mgbe ọ gbatara ha n’uche na mberede, ha nweekwa “ihe ncheta” nke onye dimkpa (ma ọ bụ ndị dimkpa) imetọ ha mgbe ha dị ntakịrị. Ọ̀ dị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst nke na-enwe echiche ndị dị otú ahụ na-enye nsogbu n’obi? Ee, ọ dị n’ala ole na ole, ndị a raara onwe ha nye pụkwara inwe oké ihe isi ike, iwe, obi amamikpe, ihere, ma ọ bụ owu ọmụma. Dị ka Devid, ha pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ wee tie mkpu, sị: “Jehova, n’ihi gịnị ka Ị na-eguzo n’ebe dị anya? N’ihi gịnị ka Ị na-ezobe Onwe gị na mgbe nile nke mkpa?”—Abụ Ọma 10:1.

Ndị ọkachamara nke ahụ ike uche adịghị aghọtacha ọtụtụ akụkụ nke “ihe ncheta” ndị a nke ọma. Ma, “ihe ncheta” ndị dị otú ahụ pụrụ imetụta ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Kraịst raara onwe ha nye. Ya mere anyị ji obi ike na-elegara Okwu Chineke anya maka nduzi n’ịnagide ha. Bible na-enye “nghọta n’ihe nile.” (2 Timoti 2:7; 3:16) Ọ na-enyekwara ndị nile o metụtara aka itinye okwukwe na Jehova, bụ́ “Nna nke obi ebere nile na Chineke nke nkasi obi nile.”—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.

Ò Mere Eme n’Ezie?

N’ụwa, e nwere oké arụmụka banyere ihe “ihe ncheta” ndị a bụ na ruo n’ókè ha aṅaa hà na-anọchite anya ihe ndị mere eme n’ezie. Ndịàmà Jehova “esiteghị n’ụwa,” ha adịghịkwa ekere òkè n’arụmụka a. (Jọn 17:16) Dị ka akụkọ ndị e bipụtara ebipụta na-egosi, mgbe ụfọdụ “ihe ncheta” abụrụwo nke ziri ezi. Dị ka ihe atụ, mgbe onye na-ede akwụkwọ inshọrans bụ́ Frank Fitzpatrick “chetara” ịbụ onye otu onye ụkọchukwu metọrọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị ndị ọzọ pụtara kwuo na otu onye ụkọchukwu ahụ emetọwokwa ha. Dị ka a kọrọ onye ụkọchukwu kwetara ime mmetọ ahụ.

Otú ọ dị, ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ọtụtụ ndị mmadụ enwebeghị ike inweta ihe nkwado maka “ihe ncheta” ha. Ụfọdụ ndị a na-akpagbu n’ụzọ dị otú a echetawo n’ụzọ doro anya otu onye ime mmetọ ma ọ bụ mmetọ ahụ ịbụ nke e mere n’otu ebe kpọmkwem. Otú ọ dị, ka e mesịrị, ihe àmà ziri ezi e nwere nke na-emegide ya mere ka o doo anya na ụmụ irighiri ihe ndị a “e chetara” apụghị ịbụ eziokwu.

Inye Ebe Mgbaba

Ka o sina dị, olee otú a pụrụ isi nye ndị na-enwe ‘mmụọ e tigburu etigbu’ n’ihi “ihe ncheta” ndị dị otú ahụ nkasi obi? Cheta ilu Jisọs banyere onye Sameria ahụ bụ́ ezi onye agbata obi. Ndị ohi wakwasịrị otu nwoke, tie ya ihe, napụkwa ya ihe onwunwe ya nile. Mgbe onye Sameria ahụ bịara, o meere nwoke ahụ e merụrụ ahụ ebere. Gịnị ka o mere? Ò siri ọnwụ ka a kọọrọ ya ihe nile banyere iti ihe ahụ? Ka à kọwaara onye Sameria ahụ otú ndị ohi ahụ dị o wee chụrụ ha gawa ozugbo? Ee e. E merụrụ nwoke ahụ ahụ! Ya mere onye Sameria ahụ ji nwayọọ kechie ọnyá ya nile, jirikwa ịhụnanya buga ya n’ebe dị nchebe n’ụlọ ndị ọbịa dị nso n’ebe ahụ bụ́ ebe ọ pụrụ ịnọ gbakee.—Luk 10:30-37.

N’eziokwu, e nwere ọdịiche dị ná mmerụ ahụ anụ ahụ na nke ‘mmụọ e tigburu etigbu’ nke mmetọ mmekọahụ e mere n’ezie n’oge a bụ nwatakịrị kpatara. Ma ha abụọ na-akpata oké nhụjuanya. Ya mere, ihe onye Sameria ahụ meere onye Juu ahụ e merụrụ ahụ na-egosi ihe a pụrụ ime iji nyere ndị Kraịst ibe anyị nọ ná mkpagbu aka. Ihe mbụ bụ inye nkasi obi ịhụnanya na inyere ya aka ịgbake.

Ekwensu wetaara Job na-ekwesị ntụkwasị obi ihe mgbu, n’ụzọ doro anya na-enwe obi ike na ihe mgbu mmetụta uche ma ọ bụ nke anụ ahụ ga-emebi iguzosi ike n’ezi ihe ya. (Job 1:11; 2:5) Kemgbe ahụ, ọtụtụ mgbe Setan agbalịwo iji ntaramahụhụ mee ihe—ma ọ̀ bụ ya na-akpata ya n’onwe ya ma ọ bụ na ọ bụghị—iji mee ka okwukwe nke ndị ohu Chineke daa mbà. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 12:7-9.) Ànyị pụrụ ịrụ ụka na Ekwensu na-eji mmetọ ụmụaka na “mmụọ nke inyoghị inyoghị” nke ọtụtụ ndị dimkpa bụ́ ndị e mesoworo nke a (ma ọ bụ ndị “ihe ncheta” nke ịbụ ndị e mesoworo ya na-enye nsogbu) eme ihe ugbu a iji mee ka okwukwe nke ndị Kraịst daa mbà? Dị ka Jisọs mgbe Setan wakporo ya, onye Kraịst na-enwe ihe mgbu ma bụrụ onye jụwapụrụ isi ịgbahapụ nguzosi ike n’ezi ya na-asị: “Laba, Setan.”—Matiu 4:10.

Nọgide Na-abụ Onye Siri Ike n’Ime Mmụọ

“Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ebipụtawo ihe ọmụma iji nye aka ịnagide mmerụ ahụ ime mmụọ na nke mmetụta uche nke mmetọ ụmụaka na-akpata. (Matiu 24:45-47) Ahụmahụ na-egosi na a na-enyere onye ahụ na-ata ahụhụ aka ma ọ bụrụ na ọ pụrụ ịdabere ‘n’ike nke Onyenwe anyị, ya na n’ime ịdị ike nke ike Ya,’ na-eyikwasị “ihe agha nile nke Chineke.” (Ndị Efesọs 6:10-17) Ihe agha a gụnyere “eziokwu” Bible, bụ́ nke na-ekpughe Setan dị ka onye iro kasị ukwuu ma na-ewezụga ọchịchịrị nke ya na ndị na-akwado ya na-arụ ọrụ n’ime ya. (Jọn 3:19) Mgbe ahụ, e nwere “ihe agha nke na-egbochi obi . . . bụ́ ezi omume.” Onye na-ahụsi anya kwesịrị ịgbalị ijigide ụkpụrụ ezi omume nile. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị nwere mkpali ndị siri ike nke imerụ onwe ha ahụ ma ọ bụ itinye aka n’omume rụrụ arụ. Mgbe ọ bụla ha guzogidere mkpali ndị a, ha na-enwe mmeri!

Ihe agha ime mmụọ gụnyekwara “ozi ọma nke udo.” Ịgwa ndị ọzọ okwu banyere nzube nile nke Jehova na-ewusi onye ahụ na-ekwu ya ike tinyere onye ọ bụla na-ege ntị. (1 Timoti 4:16) Ọ bụrụ na ị bụ onye nwere ‘mmụọ e tigburu etigbu,’ na-eme ka o siere gị ike ikwu okwu banyere ozi ọma ahụ, gbalịa isonyere onye Kraịst ọzọ ka ọ na-arụ ọrụ a dị mkpa. Echefukwala “ọta nke bụ okwukwe.” Nwee okwukwe na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ ga-eweghachi ihe nile funahụrụ gị. Jiri obi gị nile kwere na Jisọs hụkwara gị n’anya, o gosipụtakwara nke a site n’ịnwụ n’ihi gị. (Jọn 3:16) Mgbe nile Setan anọwo na-azọrọ n’ụzọ ụgha na Jehova adịghị eche maka ndị ohu ya. Nke ahụ bụ nnọọ ọzọ n’ime ọkpụrụkpụ ụgha ya ndị jọgburu onwe ha.—Jọn 8:44; tụlee Job 4:1, 15-18; 42:10-15.

Ọ bụrụ na ihe mgbu nke obi emee ka o sie ike ikweta na Jehova na-echegbu onwe ya banyere gị, ọ ga-enye aka isoro ndị ọzọ kwenyesiri ike na ọ na-echegbu onwe ya kpakọrịta. (Abụ Ọma 119:107, 111; Ilu 18:1; Ndị Hibru 10:23-25) Jụ ikwe ka Setan napụ gị ihe nrite nke bụ́ ndụ. Cheta, “okpu agha nke bụ nzọpụta” bụ akụkụ nke ihe agha ahụ, otú ahụ ka ọ dịkwa “mma agha nke Mmụọ Nsọ.” E ji ike mmụọ nsọ, bụ́ nke Setan na-apụghị imeri, dee Bible. (2 Timoti 3:16; Ndị Hibru 4:12) Okwu ya ndị na-agwọ ọrịa pụrụ ibelata ihe mgbu nke mmetụta uche.—Tụlee Abụ Ọma 107:20; 2 Ndị Kọrint 10:4, 5.

N’ikpeazụ, na-ekpechi ekpere anya maka ume iji tachie obi. (Ndị Rom 12:12; Ndị Efesọs 6:18) Ekpere sitere n’obi kwagidere Jisọs n’oge oké ihe mgbu nke mmetụta uche, ọ pụkwara inyere gị aka. (Luk 22:41-43) Ò siiri gị ike ikpe ekpere? Rịọ ndị ọzọ ka ha soro gị kpee ekpere na ikpe ekpere maka gị. (Ndị Kọlọsi 1:3; Jemes 5:14) Mmụọ nsọ ga-akwado ekpere gị. (Tụlee Ndị Rom 8:26, 27.) Dịkwa ka ọrịa anụ ahụ nke na-egbu mgbu, ọ pụrụ ịbụ na a gaghị agwọta ndị nwere nnukwute ọnyá mmetụta uche kpam kpam n’ime usoro ihe nke a. Ma site n’enyemaka Jehova anyị pụrụ ịtachi obi, ntachi obi bụkwa mmeri, dị ka ọ dị n’ihe banyere Jisọs. (Jọn 16:33) “Tụkwasịnụ [Jehova] obi na mgbe nile, unu ndị Ya; wụsịanụ obi unu n’ihu Ya dị ka mmiri: Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.”—Abụ Ọma 62:8.

Olee Banyere Onye ahụ E Boro Ebubo Mmetọ?

Onye metọrọ nwatakịrị n’ezie n’ụzọ mmekọahụ bụ onye ndina n’ike, e kwesịkwara ile ya anya otú ahụ. Onye ọ bụla e metọrọ n’ụzọ dị otú a nwere ikike ibo onye metọrọ ya ebubo. Ma, e kwesịghị ibo mmadụ ebubo ngwa ngwa ma ọ bụrụ na ọ dabeere nanị ná “ihe ncheta a bịanyụrụ abịanyụ” banyere mmetọ. N’ọnọdụ a ihe kasị mkpa bụ onye ahụ ọ na-enye nsogbu inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmetụta uche kwụ chịm. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ pụrụ ịnọ n’ọnọdụ ka mma inyocha “ihe ncheta” ndị ahụ wee kpebie ihe ọ chọrọ ime banyere ya ma ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ ga-eme.

Tụlee ihe banyere Donna. Dị ka a kọrọ o nwere nsogbu iri ihe wee jekwuru otu onye ndụmọdụ—onye o yiri ka ọ machaghị ọrụ. N’oge na-adịghị anya ọ malitere ibo nna ya ebubo ndina onye ikwu, a kpụpụkwara nna ya n’ụlọikpe. Ndị òtù ikpe ahụ enweghị ike iru mkpebi ikpe, ya mere nna ya ejeghị mkpọrọ, ma a dara ya nhá $100,000 maka mmefu ụlọikpe. Mgbe ihe ahụ nile gasịziri, Donna gwara ndị mụrụ ya na ya ekwetakwaghị na mmetọ ahụ mere n’ezie!

N’ụzọ amamihe, Solomọn kwuru, sị: “Apụla ngwa ngwa ise okwu.” (Ilu 25:8) Ọ bụrụ na ọ dị ezi ihe mere a ga-eji na-enyo na onye ahụ a na-ebo ebubo mere ya ka na-emetọ ụmụaka, a pụrụ inye ịdọ aka ná ntị. Ndị okenye ọgbakọ pụrụ inye aka n’ọnọdụ dị otú ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, emela ya ọkụ ọkụ. N’ikpeazụ, ị pụrụ inwe afọ ojuju ịhapụ okwu ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị chọrọ ijekwuru onye ahụ a na-ebo ebubo mere ya (mgbe i buruworo ụzọ tụlesịa mmetụta ị ga-enwe banyere otú ọ pụrụ isi meghachi omume), i nwere ikike ime otú ahụ.

N’oge onye na-enwe “ihe ncheta” nọ na-agbake, ọnọdụ ndị na-adịchaghị mma pụrụ ibilite. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ inwe n’uche ya onyinyo ndị doro anya nke ịbụ onye a na-emetọ site n’aka onye ọ na-ahụ kwa ụbọchị. Ọ dịghị iwu a pụrụ iti banyere ihe a ga-eme maka nke a. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5) Mgbe ụfọdụ, mmadụ pụrụ iche na onye ikwu ma ọ bụ onye òtù ezinụlọ mmadụ kpọmkwem so na ya. Cheta ọdịdị a na-ejighị n’aka nke ụfọdụ “ihe ncheta ndị a bịanyụrụ abịanyụ” mgbe a bịara n’ịchọpụta ma onye a na-enyo enyo ò mere ya. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ bụrụhaala na e mebeghị ka okwu ahụ guzosie ike, iso ndị ezinụlọ na-enwe mmekọrịta—ma ọ dịghị ihe ọzọ site ná nleta site n’oge ruo n’oge, site n’akwụkwọ ozi, ma ọ bụ site na telifon—ga-egosi na mmadụ na-agbalị ịgbaso ụzọ Akwụkwọ Nsọ.—Tụlee Ndị Efesọs 6:1-3.

Gịnị Ka Ndị Okenye Pụrụ Ime?

Ọ bụrụ na onye òtù ọgbakọ nke na-enwe ihe mgbata n’uche ma ọ bụ “ihe ncheta a bịanyụrụ abịanyụ” banyere mmetọ n’oge a bụ nwata abịakwute ndị okenye, a na-edupụkarị mmadụ abụọ n’ime ha inye aka. Ndị okenye a kwesịrị iji obi ọma gbaa onye ahụ na-ahụsi anya ume ilekwasị anya mgbe ahụ n’ụzọ isi nagide ihe isi ike mmetụta uche ahụ. E kwesịrị izochisi aha ndị mmetọ ọ bụla “e chetara” ike.

Ọrụ bụ isi nke ndị okenye bụ ịrụ ọrụ dị ka ndị ọzụzụ atụrụ. (Aịsaịa 32:1, 2; 1 Pita 5:2, 3) Ha kwesịrị ilezi anya karịsịa ‘iyikwasị onwe ha obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi.’ (Ndị Kọlọsi 3:12) Ka ha ṅaa ntị n’ụzọ obi ọma ma jiri okwu ndị na-agwọ ọrịa bụ́ ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ mee ihe. (Ilu 12:18) Ụfọdụ ndị na-ahụsi anya site ‘n’ihe ncheta’ ndị na-egbu mgbu egosipụtawo ekele ha maka ndị okenye na-eme nleta chiri anya ma ọ bụ ọbụna na-akpọ na fon iji mara otú ha dị. Ọ dịghị mkpa na mkpọtụrụ ndị dị otú ahụ ga-ewe oge dị ukwuu, ma ha na-egosi na nzukọ Jehova na-eche banyere ha. Mgbe onye ahụ na-ahụsi anya ghọtara na ụmụnna ya ndị Kraịst hụrụ ya n’anya n’ezie, ọ pụrụ ịbụ onye e nyeere aka inwetaghachi nguzozi dị ukwuu nke mmetụta uche.

Gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ na-enwe nsogbu ekpebie iweli okwu ahụ elu?b Mgbe ahụ ndị okenye abụọ ahụ pụrụ ịdụ ya ọdụ na, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ahụ dị na Matiu 18:15, o kwesịrị n’onwe ya ijekwuru onye ahụ a na-ebo ebubo banyere okwu ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ na-ebo ebubo enweghị ike ime nke a ihu n’ihu n’ihi mmetụta uche, a pụrụ iji telifon mee ya ma ọ bụ ma eleghị anya site n’ide akwụkwọ ozi. N’ụzọ dị otú a, a na-enye onye ahụ e boro ebubo ohere ime nkwupụta n’ihu Jehova site n’azịza ya nye ebubo ahụ. Ọ pụrụ ọbụna inwe ike igosi ihe àmà na-egosi na ọ pụghị imeworị ihe ahụ. Ma ọ bụ ikekwe, onye ahụ e boro ebubo ga-eme nkwupụta, e nweekwa ike idozi okwu. Lee aha ngọzi nke ahụ ga-abụ! Ọ bụrụ na e mere nkwupụta, ndị okenye abụọ ahụ pụrụ ịhụkwu maka okwu ahụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ.

Ọ bụrụ na a gọọ agụgọ n’ebubo ahụ, ndị okenye kwesịrị ịkọwara onye ahụ na-ebo ebubo na ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ a pụrụ ime n’ụzọ ikpe. Ọgbakọ ga-anọgidekwa na-ele onye ahụ e boro ebubo anya dị ka onye aka ya dị ọcha. Bible na-asị na a ghaghị inwe ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ tupu e nwee ike ime ihe n’ụzọ ikpe. (2 Ndị Kọrint 13:1; 1 Timoti 5:19) Ọ bụrụgodị na ihe karịrị otu onye “echeta” mmetọ site n’aka otu onye ahụ, ọdịdị nke ihe ncheta ndị a bụ nnọọ nke a na-ejighị n’aka nke ịgbakwasị ụkwụ na ha wee nye mkpebi ikpe n’enweghị ihe àmà ọzọ na-akwado ya. Nke a apụtaghị na ụdị “ihe ncheta” dị otú ahụ bụ ndị a na-ele anya dị ka ndị na-abụghị eziokwu (ma ọ bụ na a na-ele ha anya dị ka eziokwu). Ma a ghaghị ịgbaso ụkpụrụ Bible n’ime ka okwu guzosie ike n’ụzọ ikpe.

Gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ e boro ebubo—ọ bụ ezie na ọ na-agọ agọ ime ihe ọjọọ ahụ—mere ya n’ezie? Ọ̀ “ga-alagbụrụ n’adịghị ihe e mere ya,” dị ka a pụrụ isi kwuo ya? Ọ dịghị ma ọlị! A pụrụ iji obi ike hapụrụ Jehova okwu banyere ma ò mere ya ka aka ya ọ̀ dị ọcha. “Mmehie mmadụ ụfọdụ na-apụta ìhè, n’ihi na ha buru ha ụzọ na-aga ikpe; ma mmehie mmadụ ụfọdụ na-esokwa ha n’azụ.” (1 Timoti 5:24; Ndị Rom 12:19; 14:12) Akwụkwọ Ilu na-asị: “Nchere ndị ezi omume ga-abụ ọṅụ: ma olileanya ndị na-emebi iwu ga-ala n’iyi.” “Mgbe mmadụ nke na-emebi iwu nwụrụ, olileanya ya ga-ala n’iyi.” (Ilu 10:28; 11:7) N’ikpeazụ, Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ga-enye mkpebi ikpe ebighị ebi n’ikpe ziri ezi.—1 Ndị Kọrint 4:5.

Iguzogide Ekwensu

Mgbe mkpụrụ obi ndị raara onwe ha nye na-atachi obi n’agbanyeghị oké ihe mgbu anụ ahụ na nke mmetụta uche, lee ihe àmà ọ bụ nke ume si n’ime na ịhụnanya ha n’ebe Chineke nọ! Leekwa ihe àmà ọ bụ nke ike nke mmụọ nsọ Jehova ịkwagide ha!—Tụlee 2 Ndị Kọrint 4:7.

Okwu Pita na-emetụta ndị dị otú ahụ: “Na-eguzogidenụ [Setan], n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu.” (1 Pita 5:9) Ime otú ahụ nwere ike ọ gaghị adị mfe. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ọbụna isi ike iche echiche nke ọma na n’ụzọ ezi izu dị na ya. Ma nwee obi ike! N’isi nso, Ekwensu na aghụghọ ya nile agaghị adịkwa. N’eziokwu, oge ahụ na-agụsi anyị agụụ ike mgbe “Chineke onwe ya . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E tinyere “ihe ncheta ndị a bịanyụrụ abịanyụ” na okwu ndị yiri ha n’ime akara nhota okwu iji mee ka ha dị iche n’ihe ncheta ndị anyị nile na-enwekarị.

b Ọ pụkwara ịdị mkpa ka a gbasoo nzọụkwụ e depụtara na paragraf a ma ọ bụrụ na okwu ahụ aghọọla ihe a mazuru n’ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya