Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 9/1 p. 3
  • Nsogbu Ndị Ụmụ Nwaanyị Na-enwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsogbu Ndị Ụmụ Nwaanyị Na-enwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Ò Ji Ụmụ Nwaanyị Kpọrọ Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Imeso Ụmụ Nwaanyị Ihe Ike Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2008
  • Ndị Inyom “Ndị Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ime Onyenwe Anyị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Chineke Chọrọ Ka A Na-akwanyere Ụmụ Nwaanyị Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 9/1 p. 3

Nsogbu Ndị Ụmụ Nwaanyị Na-enwe

“Mgbe ọ bụla m hụrụ otú e si emegbu ụmụ nwaanyị torola eto, ọ na-adị m ka m ghara ito eto.”​—IHE ZAHRA, BỤ́ NWA AGBỌGHỌ DỊ AFỌ IRI NA ISE, KWURU. E dere ya na magazin aha ya bụ GEO, n’asụsụ French.

IHE nwa agbọghọ a foto ya dị n’aka nri kwuru na-egosi na asị a kpọrọ ụmụ nwaanyị na otú e si emegbu ha n’ebe niile n’ụwa na-ewute ụmụ nwaanyị niile, ma mgbe ha ka bụ nwata ma mgbe ha torola eto. Ka anyị hụ ihe ụfọdụ a chọpụtarala banyere otú e si emegbu ụmụ nwaanyị.

● Asị a kpọrọ ha. N’Eshia, ọtụtụ ndị nne na nna na-achọ ka ha mụta ụmụ nwoke kama ịmụta ụmụ nwaanyị. N’afọ 2011, Òtù Mba Ụwa kwuru na n’Eshia, ihe dị ka otu narị nde ụmụ nwaanyị na nde iri atọ na anọ anwụọla. E gburu ụfọdụ n’ime ha mgbe ha dị obere, ụfọdụ nwụrụ maka na e lekọtaghị ha nke ọma, ebe e sikwopụrụ ndị nke ọzọ n’afọ ime.

● Agụmakwụkwọ. N’ụwa niile, e kee ndị na-agụrughị klas nke anọ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị ụzọ atọ, abụọ n’ime ha bụ ụmụ nwaanyị.

● Idina nwaanyị n’ike. Ihe karịrị ijeri ụmụ nwaanyị abụọ na nde isii bi ná mba ebe ndị a ka weere na nwoke idina nwunye ya n’ike abụghị ihe ọjọọ.

● Ezigbo ụlọ ọgwụ adịghị. Ná mba ndị na-emepe emepe, n’ihe dị ka nkeji abụọ ọ bụla, otu nwaanyị na-anwụ n’afọ ime ma ọ bụ mgbe ọ na-amụ nwa. Ihe kpatara ya bụ na ezigbo ụlọ ọgwụ adịghị ná mba ndị ahụ.

● Inwe ala ma ọ bụ ụlọ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ụmụ nwaanyị na-akọpụta ihe karịrị ọkara ihe oriri niile a na-eri n’ụwa, ma n’ọtụtụ mba, a naghị ekwe ka ha nwee ụlọ ma ọ bụ ka ha keta ala.

Gịnị mere na a naghị ekwe ka ụmụ nwaanyị nweta ihe ndị ruuru ha? Ọ bụ n’ihi ihe a na-akụzi n’okpukpe dị iche iche. Ihe ndị ahụ a na-akụzi na-eme ka ndị bi n’obodo ụfọdụ chee na imegbu ụmụ nwaanyị ma ọ bụ imeso ha ihe ike abụghị ihe ọjọọ. Otu akwụkwọ akụkọ e dere n’asụsụ French kọrọ ihe otu nwaanyị India bụ́ ọkàiwu kwuru. Aha ọkàiwu ahụ bụ Chandra Rami Chopra. O dere, sị: “E nwere otu ihe jikọrọ iwu ndị e nwere n’okpukpe niile dị n’ụwa. Iwu ndị ahụ na-ekwu na asị a kpọrọ ụmụ nwaanyị kwesịrị ekwesị.”

Ì chere na otú a e si emeso ụmụ nwaanyị dị mma? Ì chere na ihe e dere na Baịbụl na-egosi na e kwesịghị iji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe otú ọtụtụ akwụkwọ okpukpe ndị ọzọ kwuru? Ụfọdụ ndị chere na ihe e dere n’amaokwu ụfọdụ na Baịbụl na-egosi na e kwesịghị iji ụmụ nwaanyị kpọrọ ihe. Ma olee otú Chineke, onye mere ka e dee Baịbụl, si ele ụmụ nwaanyị anya? Ọ bụ eziokwu na ọ ga-esiri ọtụtụ ndị ike ịgbanwe echiche ha n’okwu a, ma ọ bụrụ na anyị eleba anya nke ọma n’ihe Baịbụl kwuru banyere ụmụ nwaanyị, anyị ga-ahụ azịza nke ajụjụ ndị a.

[Ebe E Si Nweta Ihe Osise 3]

© G.M.B. Akash/Panos Pictures

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya