Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 9/1 p. 16-17
  • Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?
    Teta!—2010
  • Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ụbọchi Ikpe—Oge Inwe Olileanya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 9/1 p. 16-17

Mụta Ihe n’Okwu Chineke

Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị bụ Ụbọchị Ikpe?

Dị ka foto dị n’aka nri na peeji a na-egosi, ọtụtụ ndị chere na n’Ụbọchị Ikpe, ọtụtụ ijeri mkpụrụ obi ga-ezukọta n’ihu ocheeze Chineke, e kpee ha ikpe maka ihe ndị ha mere n’oge gara aga. Mgbe e kpechara ha ikpe, ụfọdụ n’ime ha ga-aga eluigwe, ebe ndị ọzọ ga-aga ọkụ mmụọ gaa tawa ahụhụ. Ma Baịbụl gosiri na ihe mere a ga-eji enwe Ụbọchị Ikpe bụ ka a napụta ndị mmadụ n’ahụhụ niile ha na-ata. (Abụ Ọma 96:13) Chineke ahọpụtala Jizọs ka ọ bụrụ Onyeikpe nke ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ.—Gụọ Aịzaya 11:1-5; Ọrụ 17:31.

2. Olee otú Ụbọchị Ikpe ga-esi eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịta ahụhụ?

Mgbe nwoke mbụ bụ́ Adam ma ụma nupụrụ Chineke isi, o mere ka ụmụ ya niile bụrụ ndị mmehie, ka ha na-ata ahụhụ ma na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12) Jizọs ga-eme ka nsogbu niile ahụ Adam kpataara ụmụ mmadụ kwụsị. Ọ ga-eme ka ọtụtụ ijeri mmadụ ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. Akwụkwọ Mkpughe kwuru na Jizọs Kraịst ga-eme ihe a n’oge ọ ga-achị ụwa otu puku afọ.—Gụọ Mkpughe 20:4, 11, 12.

A ga-ekpe ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ikpe, ma ọ bụghị ihe ha mere tupu ha anwụọ ka a ga-eji ekpe ha ikpe, kama ọ bụ ihe ha mere n’oge a sagherela “akwụkwọ mpịakọta” ndị e kwuru okwu ha ná Mkpughe isi nke 20. (Ndị Rom 6:7) Pọl onyeozi kwuru na a ga-akpọlite “ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” A ga-akụzikwara ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ banyere Chineke.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.

3. Olee uru Ụbọchi Ikpe ahụ ga-abara ụmụ mmadụ?

Ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ ndị na-amaghị banyere Jehova Chineke tupu ha anwụọ, ga-enwe ike ịmata Jehova, ma nwee ohere ịgbanwe àgwà ha ma mewe uche Ya. Ọ bụrụ na ha emewe uche Chineke, mbilite e bilitere ha n’ọnwụ ga-abụrụ ha “mbilite n’ọnwụ nke ndụ.” Ma ụfọdụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ agaghị achọ ime uche Jehova. Mbilite e bilitere ha n’ọnwụ ga-abụrụ ha “mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Gụọ Jọn 5:28, 29; Aịzaya 26:10; 65:20.

Mgbe Ụbọchị Ikpe ahụ, nke ga-adị otu puku afọ, na-agwụla, Jehova ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi zuo okè otú ahụ ọ chọrọ ya mgbe o kere mmadụ. (1 Ndị Kọrịnt 15:24-28) Nke ahụ bụ ihe ọma Chineke ga-emere ndị niile na-erubere ya isi! Chineke ga-esi n’abis kpọpụta Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ n’ebe ahụ kemgbe otu puku afọ, ka o lee ụmụ mmadụ ule ikpeazụ. N’oge ahụ, Setan ga-agbalị ka o mee ka ndị mmadụ nupụrụ Jehova isi. Ma ndị niile jụrụ ige Setan ntị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa.—Gụọ Aịzaya 25:8; Mkpughe 20:7-9.

4. Olee ụbọchị ikpe ọzọ a ga-enwe nke ga-abara ụmụ mmadụ uru?

Baịbụl kwukwara banyere “ụbọchị ikpe” ọzọ, bụ́ mgbe Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume n’oge anyị a. Ụbọchị ikpe a ga-abịa na mberede dị ka Iju Mmiri nke oge Noa, bụ́ nke Chineke ji bibie ndị ajọ omume n’oge ahụ. Mbibi a Chineke ga-ebibi “ndị na-adịghị asọpụrụ” ya ga-eme ka ụwa a bụrụ ụwa ọhụrụ nke ‘ezi omume ga-ebi n’ime ya.’—Gụọ 2 Pita 3:6, 7, 13.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 213 ruo nke 215 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 16]

“Ikpe Ikpeazụ,” onye sere ya bụ Gustave Doré, 1832-1883

[Ebe E Si Nweta Foto]

Engravings by Doré

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya