Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w15 5/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?
    Teta!—2010
  • Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Ụbọchi Ikpe—Oge Inwe Olileanya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
w15 5/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị bụ Ụbọchị Ikpe?

Ebe di na nwunye na-aṅụrị ọṅụ na nwa ha si n’ọnwụ bilie n’ime ọchịchị puku afọ Kraịst

Gịnị mere ụbọchị ikpe ga-eji bụrụ oge obi ụtọ?

N’oge e dere Baịbụl, Chineke ji ndị ikpe napụta ndị ya n’aka ndị na-emegbu ha. (Ndị Ikpe 2:18) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na Ụbọchị Ikpe ga-abụ oge obi ụtọ, oge Jehova, bụ́ Onyeikpe nke ụwa dum, ga-anapụta ụmụ mmadụ n’aka ndị na-emegbu ha.—Gụọ Abụ Ọma 96:12, 13; Aịzaya 26:9.

Chineke ahọpụtala Jizọs ka o kpee ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ ikpe n’ezi omume. (Ọrụ Ndịozi 10:42; 17:31) E nwere ọtụtụ ndị na-amaghị Chineke nwụọ. N’Ụbọchị Ikpe, Jizọs ga-akpọlite ụdị ndị ahụ n’ọnwụ ka a kụziere ha gbasara Chineke, ka ha gosikwa na ha hụrụ Chineke n’anya.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.

Gịnị mere Ụbọchị Ikpe ga-eji nọruo otu puku afọ?

Ọ bụ n’ime otu puku afọ ahụ ka a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Mkpughe 20:4, 12) Ọ ga-ewetụkwa oge tupu ndị nke na-amaghị Chineke amata ya ma gosi ma hà ga-erubere ya isi. Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe mmadụ metara tupu ya anwụọ ka a ga-eji ekpe ya ikpe ma a kpọlite ya. Ma, ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụ ihe mmadụ mere mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ ka a ga-eji kpee ya ikpe.—Gụọ Ndị Rom 6:7.

Baịbụl kwukwara na tupu otu puku afọ ahụ amalite, a ga-enwe ụbọchị a ga-ekpe ndị ajọ omume ikpe, ọ ga-abịakwa na mberede. Ihe ọzọ a na-akpọ ụbọchị a bụ ọgwụgwụ ụwa anyị kwuru okwu ya ná mbido Ụlọ Nche a. Ọ bụ ụbọchị Chineke ga-ebibi ndị ọjọọ niile. (2 Pita 3:7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ugbu a gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya.—Gụọ 2 Pita 3:9, 13.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ peeji nke 213 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya