Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 6/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ka “Udo Nke Chineke” Chee Obi Unu Nche
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Enweghị Ike Ime Ka Udo Dịrị n’Ụwa?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 6/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị mere na ụmụ mmadụ enwebeghị ike iweta udo n’ụwa?

Ọ bụ naanị ọchịchị nke nwere ike ime ka ndị mmadụ gbanwee obi ha ga-eme ka udo dị n’ụwa

Baịbụl kwuru ihe abụọ kpatara ya. Nke mbụ bụ na Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha n’agbanyeghị na ha emepụtala ọtụtụ ihe magburu onwe ha. Nke abụọ bụ na Baịbụl kwuru na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ,” ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu. Ọ bụ ya mere na mbọ niile ụmụ mmadụ gbarala iweta udo n’ụwa ji kụọ afọ n’ala.—Gụọ Jeremaya 10:23; 1 Jọn 5:19.

Ihe ọzọ mere na ụmụ mmadụ enwebeghị ike iweta udo n’ụwa bụ na ụmụ mmadụ na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Udo ga-adị n’ụwa ma ọ bụrụ na e nwee otu ọchịchị na-achị ụwa dum nke ga-akụziri ụmụ mmadụ ka ha na-eme ihe ọma ma hụ ibe ha n’anya.—Gụọ Aịzaya 32:17; 48:18, 22.

Ònye ga-eweta udo n’ụwa?

Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ekwela nkwa na ya ga-eweta otu ọchịchị nke ga na-achị mmadụ niile. Ọchịchị a ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. (Daniel 2:44) Ọ bụ Ọkpara Chineke bụ́ Jizọs, onye bụ́ Onyeisi Udo, ga na-achị ụwa mgbe ahụ. Ọ ga-eme ka ihe ọjọọ niile dị n’ụwa kwụsị ma kụziekwara ụmụ mmadụ otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo.—Gụọ Aịzaya 9:6, 7; 11:4, 9.

Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile na-eji Baịbụl akụziri ndị mmadụ otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo. Ọ bụ Jizọs na-eduzi ọrụ a ha na-arụ. N’oge na-adịghị anya, udo ga-adị n’ụwa niile.—Gụọ Aịzaya 2:3, 4; 54:13.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 3 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya