Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 7/1 p. 11
  • Ọ ‘Na-enye Anyị Nri n’Ụba’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ ‘Na-enye Anyị Nri n’Ụba’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Lee Ka Ịdị Mma Ya Si Dị Ukwuu!”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ịdị Mma Bara Ụba nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịdị Mma—Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mụta Ya?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Jehova—Onye Nlereanya Kasịnụ nke Ịdị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 7/1 p. 11

BỊARUO CHINEKE NSO

Ọ ‘Na-enye Anyị Nri n’Ụba’

Jehova ọ̀ na-eche banyere anyị n’eziokwu, ka ọ̀ bụ na ọ chọghị ịma banyere ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata? Otú Baịbụl si zaa ajụjụ a na-eme ka obi tọọ anyị ụtọ. Chineke na-eche banyere ụmụ mmadụ. Ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ. Kwa ụbọchị, Chineke na-emere mmadụ niile ọtụtụ ihe ọma, ma ndị na-achọdịghị ife ya. Ka anyị leba anya n’ihe Pọl onyeozi kwuru.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:16, 17.

Mgbe Pọl na-agwa ndị Listra okwu, bụ́ ndị na-anaghị efe Chineke, ọ sịrị ha: “N’ọgbọ ndị gara aga, [Chineke] kwere ka ndị mba ọzọ niile nọgide na-eje ije n’ụzọ ha, ọ bụ ezie na ọ hapụghị onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe o mere ihe ọma, na-enye unu mmiri ozuzo site n’eluigwe, na oge mkpụrụ ji amị, na-enyekwa unu nri n’ụba, na-emekwa ka unu nwee obi ụtọ.” Olee ihe ndị Listra ghọtara Pọl na-ekwu?

Ndị Listra ma na ihe a Pọl kwuru bụ eziokwu. Ha bụ ndị ọrụ ubi, ala ha na-emekwa nri nke ọma n’ihi na mmiri na-ede ala ha. Ma, Pọl chetaara ha na ọ bụ Chineke na-eme ka mmiri na-ezo, na-emekwa ka mkpụrụ na-amị. Ihe Pọl na-ekwu bụ na mgbe ọ bụla ha wetara ihe ha kụrụ n’ubi ma rie ezigbo nri, ọ bụ Chineke nyere ha ya.

lhe Pọl gwara ndị Listra na-akụziri anyị ọtụtụ ihe banyere Jehova Chineke.

Jehova kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Buru n’obi na Jehova kwere ka ndị Jentaịl “na-eje ije n’ụzọ ha.” Otu akwụkwọ nke na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na ihe ihe a Pọl kwuru, ya bụ, ‘ka ha na-eje ije n’ụzọ ha’ pụtara bụ “ka ha na-eme otú masịrị ha” ma ọ bụ “ka ha na-eme ihe ọ bụla ha chere dị ha mma.” Jehova enweghị onye ọ na-amanye ka o fee ya. O kere anyị ka anyị jiri aka anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-eme, ya bụ, ka anyị họrọ ụdị ndụ anyị ga-ebi.—Diuterọnọmi 30:19.

Jehova chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ. Pọl kwuru na Jehova ahapụghị “onwe ya n’enweghị ihe àmà.” Akwụkwọ ahụ na-enyere ndị na-asụgharị Baịbụl aka kwuru na otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ihe a Pọl kwuru bụ “o meela ka ndị mmadụ ghọtazie ụdị Chineke ọ bụ.” Ihe ndị Chineke kere na-eme ka anyị mata “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya,” ya bụ, obiọma ya, amamihe ya, ike ya na ịhụnanya ya. (Ndị Rom 1:20) Jehova emeela ka anyị mata ọtụtụ ihe banyere onwe ya na Baịbụl. (2 Timoti 3:16, 17) Nke a ó gosighị na Chineke chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ?

Kwa ụbọchị, Chineke na-emere mmadụ niile ọtụtụ ihe ọma, ma ndị na-achọdịghị ife ya

Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ. Pọl kwuru na Chineke ‘na-enye anyị nri n’ụba, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ.’ Onye ajọ omume nke na-ekwedịghị na Jehova dị nwedịrị ike iriju nri afọ ma nwetatụ obi ụtọ ná ndụ. Ma, Chineke chọrọ ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ mgbe niile. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe ụdị obi ụtọ a, anyị kwesịrị ịmụta eziokwu banyere Chineke ma na-emekwa ihe anyị mụtara.—Abụ Ọma 144:15; Matiu 5:3.

Jehova na-emere anyị ihe ọma kwa ụbọchị. Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụtakwuo otú i nwere ike isi na-ekele Chineke bụ́ ‘onye na-enye anyị nri n’ụba, na-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ’?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Julaị:

Ọrụ Ndịozi 11-28

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya