Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 12/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Chineke Ọ̀ Ga-eme Ka E Nwee Otu Ọchịchị nke Ga-achị Ụwa Niile?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Banyere Alaeze Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 12/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị mere Kraịst ga-eji abịa ọzọ?

Tupu Jizọs Kraịst alaghachi n’eluigwe n’afọ 33, o kwere nkwa na ya ga-abịa ọzọ. O ji onwe ya tụnyere otu nwoke si n’ezinụlọ eze. Nwoke a gara njem nọọ ogologo oge. Mgbe ọ na-alọta, e nyere ya ikike ịbụ eze. Ihe mere Jizọs ga-eji abịa ọzọ bụ ka o wetara ụmụ mmadụ ezigbo ọchịchị.—Gụọ Luk 19:11, 12.

Jizọs ga-ewetara ụmụ mmadụ ọchịchị dị mma

Mgbe Kraịst ga-abịaghachi, ọ̀ ga-abụ mmadụ ka ọ̀ ga-abụ mmụọ? Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, ọ ghọrọ mmụọ laghachi n’eluigwe. (1 Pita 3:18) N’eluigwe, ọ nọdụrụ ala n’aka nri Chineke. (Abụ Ọma 110:1) Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Jehova Chineke, bụ́ onye a na-akpọ “Onye Ochie ahụ,” nyere Jizọs ikike ka ọ chịwa ụmụ mmadụ. N’ihi ya, Jizọs ga-abụ Eze a na-anaghị ahụ anya mgbe ọ ga-abịa ọzọ, ọ bụghị mmadụ.—Gụọ Daniel 7:13, 14.

Gịnị ka Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-abịa ọzọ?

Mgbe Jizọs ga-abịa ọzọ, ya na ndị mmụọ ozi ya ga-eso. N’oge ahụ, ọ ga-ekpe ụmụ mmadụ ikpe, bibiekwa ndị ajọ omume. Ma, ọ ga-enye ndị kwetara ka ọ chịwa ha ndụ ebighị ebi.—Gụọ Matiu 25:31-33, 46.

Ọchịchị Jizọs ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs. Jizọs ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ mgbe ahụ ụwa ga-aghọ paradaịs.—Gụọ Luk 23:42, 43.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ peeji nke 73 ruo nke 85 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwere ike ịdanlodu akwụkwọ a n’adres Ịntanet anyị bụ́  www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya