Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 2/1 p. 5-7
  • Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE A GA-EJI AMATA OGE IKPEAZỤ
  • A GA-EBIBI ỌRỤ EKWENSU
  • Gịnị Ka Ndị Na-agba Ịnyịnya Anọ Ahụ Nọchiri Anya Ha?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ndị Ịnyịnya Anọ Na-agbafe!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Otú Anyị Si Mara na Anyị Nọ na “Mgbe Ikpeazụ”
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • E Mefuola Ọtụtụ Puku Ijeri Dọla n’Agha—Olee Ihe Agha Na-efu n’Eziokwu?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 2/1 p. 5-7

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | AGHA NKE GHASASỊRỊ ỤWA

Onye Na-akpata Agha na Ahụhụ

N’abalị iri na otu n’ọnwa Nọvemba afọ 1918, Agha Ụwa nke Mbụ biri. Ndị mmadụ hapụrụ ahịa ha na ọrụ ha gaa n’okporo ụzọ na-agba egwú. Ma mgbe obere oge gafere, ha kwụsịrị ịṅụrị ọṅụ n’ihi na ihe ka agha ahụ njọ bidoziri ime.

N’ọnwa Jun afọ 1918, otu ajọ ọrịa na-efe efe a kpọrọ inflenza malitere igbu ndị mmadụ n’ọgbọ agha dị na Frans. Mgbe obere oge gafere, ọrịa ahụ gburu ndị mmadụ ka ọkụkọ. Dị ka ihe atụ, n’ime ọnwa ole na ole, ndị agha Amerịka ọrịa ahụ gburu na Frans karịrị ndị agha ụwa nke mbụ riri isi ha. Mgbe agha ahụ biri, ụfọdụ ndị agha bu ọrịa ahụ lọta n’obodo ha. Ọrịa ahụ esizie otú ahụ gbasaa ebe niile n’ụwa.

Ihe ọzọ kpara ndị mmadụ ezé mgbe agha ahụ biri bụ agụụ na ihe isi ike. E nwere ụkọ nri n’ọtụtụ mba ndị dị na Yurop mgbe agha ahụ biri n’afọ 1918. Mgbe ọ na-erule afọ 1923, ego ndị Jamanị enwekwaghị ihe e ji ya azụta n’ahịa. Mgbe afọ isii gafere, ihe isi ike bidoro ịnyụ onye ukwu na onye nta anya n’ebe niile n’ụwa. N’afọ 1939, agha ụwa nke abụọ malitere. E nwere ike ikwu na ọ bụ ihe mere n’agha ụwa nke mbụ kpatara agha ụwa nke abụọ. Ma, gịnị kpatara nsogbu niile a?

IHE A GA-EJI AMATA OGE IKPEAZỤ

Amụma ndị e buru na Baịbụl na-eme ka anyị ghọta ihe kpatara ihe ụfọdụ ji eme n’ụwa. Ọ na-emekwa ka anyị ghọta ihe kpatara Agha Ụwa nke Mbụ. Jizọs Kraịst kwuru na oge ga-abịa mgbe “mba ga-ebuso mba ọzọ agha,” e nweekwa ụkọ nri na ọrịa ndị na-efe efe n’ebe dị iche iche n’ụwa. (Matiu 24:3, 7; Luk 21:10, 11) Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-eji nsogbu ndị ahụ mata oge ikpeazụ. Akwụkwọ Mkpughe mere ka ihe ahụ Jizọs kwuru dokwuo anya. O kwuru na ọ bụ agha a lụrụ n’eluigwe mere ka nsogbu ju n’ụwa.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Agha A Lụrụ n’Ụwa na nke A Lụrụ n’Eluigwe.”

Akwụkwọ Mkpughe kwukwara gbasara ịnyịnya anọ na ndị na-agba ha. Atọ n’ime ndị ahụ na-agba ịnyịnya nọchiri anya agha, ụkọ nri, na ọrịa ndị na-efe efe Jizọs kwuburu okwu ha. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ịnyịnya Anọ na Ndị Na-agba Ha Hà Na-awụ Ọsọ n’Eziokwu?”) O doro anya na agha ụwa nke mbụ mere ka oge nsogbu malite n’ụwa. Nsogbu ka na-akpakwa ndị mmadụ ezé. Baịbụl gosikwara na ọ bụ Setan kpatara nsogbu niile ahụ. (1 Jọn 5:19) Ma, à ga-ahapụ ya ka ọ kpara ike na-aga?

Akwụkwọ Mkpughe gwakwara anyị na oge Setan nwere “dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:12) Ọ bụ ya mere iwe ji ju ya obi, ya ana-akpatara ụmụ mmadụ ọtụtụ nsogbu n’ụwa. Ma, ọtụtụ nsogbu ndị a anyị na-ahụ gosikwara na oge Setan nwere agwụla agwụ.

A GA-EBIBI ỌRỤ EKWENSU

N’eziokwu, Agha Ụwa nke Mbụ ghasara ụwa. O mere ka e bido ịlụ agha aghara aghara. O mekwara ka ndị mmadụ kwụsị ịtụkwasị ndị ọchịchị obi, meekwa ka ha na-eme ngagharị iwe ka a gbanweere ha ndị ọchịchị. Ihe ọzọ bụ na o gosiri na a chụdatala Setan n’ụwa. (Mkpughe 12:9) Ebe Setan ma na oge ya agwụla agwụ, o bidoro ịkpa ike n’ụwa. Ọ bụ mgbe oge ya ga-agwụ ka nsogbu niile Agha Ụwa nke Mbụ buteere ụmụ mmadụ ga-akwụsị.

Amụma ndị e buru na Baịbụl kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Eze anyị nọ n’eluigwe, bụ́ Jizọs Kraịst, ‘ga-ebibi ọrụ Ekwensu’ n’oge na-adịghị anya. (1 Jọn 3:8) Ọtụtụ nde mmadụ na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa. Ì so ná ndị na-ekpe ekpere a? Alaeze ahụ ga-eme ka ndị niile na-efe Chineke hụ mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa, ọ bụghị uche Setan. (Matiu 6:9, 10) Mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, a gakwaghị enwe agha ọ bụla n’ụwa, ma ya fọdụzie agha zuru ụwa ọnụ. (Abụ Ọma 46:9) Ọ ga-adị mma ka ị mụtakwuo gbasara Alaeze Chineke n’ihi na nke a ga-eme ka i jiri anya gị hụ mgbe udo ga-adị ebe niile n’ụwa.—Aịzaya 9:6, 7.

Agha A Lụrụ n’Ụwa na nke A Lụrụ n’Eluigwe

Ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu tupu Agha Ụwa nke Mbụ ebiri ọkụ, Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya “alaeze niile nke ụwa” ma ọ bụrụ na Jizọs adaa n’ala fee ya ofufe. (Matiu 4:8, 9) Jizọs emeghị ihe ahụ Ekwensu chọrọ. Jizọs mechara kpọọ ya “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) Jọn onyeozi dekwara na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

Ebe onye na-achị ụwa a bụ Setan bụ́ Ekwensu, o doro anya na ọ bụ ya kpatara agha ụwa nke mbụ ahụ na nsogbu ndị ọzọ agha ahụ buteere ndị mmadụ. Ihe akwụkwọ Mkpughe kwuru gosikwara na ọ bụ Setan kpatara ahụhụ ndị mmadụ na-ata kemgbe afọ 1914. Legodị ihe ụfọdụ merenụ e kwuru ná Mkpughe isi nke 12:

  • Amaokwu nke 7 Maịkel (Jizọs Kraịst) na dragọn ahụ (Setan) lụsoro ibe ha agha n’eluigwe.

  • Amaokwu nke 9 A chụdara Ekwensu, bụ́ “onye na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi,” n’ụwa.

  • Amaokwu nke 12 “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”

Ihe e kwuru na Baịbụl na ihe ndị na-eme n’ụwa gosiri na ọ bụ n’afọ 1914 ka a lụrụ agha ahụ n’eluigwe n’oge Alaeze Chineke bidoro ịchị n’eluigwe.a A lụrụ agha n’ụwa, lụọkwa n’eluigwe n’otu afọ ahụ.

a Gụọ isi nke 8 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

Ịnyịnya Anọ na Ndị Na-agba Ha Hà Na-awụ Ọsọ n’Eziokwu?

Ịnyịnya ọcha, onye na-agba ya bụ eze na-achị n’eluigwe

Ịnyịnya ọcha, onye na-agba ya bụ eze na-achị n’eluigwe. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ Eze na-agba ịnyịnya ọcha a n’ihi ezi omume. (Abụ Ọma 45:4) Ọrụ mbụ ọ rụrụ bụ ịchụpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe.—Mkpughe 6:2; 12:9.

Ịnyịnya na-acha uhie uhie na ndị agha nọ n’ọgbọ agha

Ịnyịnya na-acha uhie uhie, e nyere onye na-agba ya ikike “iwepụ udo n’ụwa.” (Mkpughe 6:4) Kemgbe afọ 1914, a na-alụ agha aghara aghara n’ụwa. Agha Ụwa nke Abụọ bidoro naanị afọ iri abụọ na otu a lụchara Agha Ụwa nke Mbụ. Ndị o gburu karịrị ndị Agha Ụwa nke Mbụ gburu. Otu akwụkwọ kwuru na Agha Ụwa nke Abụọ gburu ihe dị ka nde mmadụ iri isii. Kemgbe afọ 1945, agha ndị a na-alụ abụghị n’ụwa niile, ma ha na-ata isi ndị mmadụ otú agha ụwa ndị ahụ tara. Ụfọdụ ndị na-akọ ihe ndị na-eme n’ụwa kwuru na agha ndị a lụrụ n’agbata afọ 1901 na afọ 2000 gburu ihe karịrị otu narị nde mmadụ.

Ịnyịnya ojii na ọtụtụ ụmụaka agụụ na-agụgbu

Ịnyịnya ojii, onye na-agba ya ji ihe e ji atụ̀ ihe n’aka. Nke a pụtara na a ga-enwe ụkọ nri. (Mkpughe 6:5, 6) N’oge a na-alụ agha ụwa nke mbụ, ndị iro ndị Jamanị ekweghị ka nri bata na Jamanị. Nke a mere ka agụụ gbuo ihe dị ka narị puku mmadụ asaa na puku iri ise. N’afọ 1921, agụụ gburu ihe karịrị nde mmadụ abụọ na Rọshịa. Obere oge nke a mechara, agụụ gbukwara ndị mmadụ n’ebe ndị ọzọ n’ụwa. Mmadụ ole e kwuru na agụụ gburu n’agbata afọ 1901 na afọ 2000 dị ihe dị ka nde mmadụ iri asaa. Kwa afọ, ihe karịrị nde ụmụaka atọ, ndị na-erubeghị afọ ise, na-anwụ n’ihi na ha anaghị eri nri na-edozi ahụ́.

Ịnyịnya ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ na ndị ọrịa

Ịnyịnya ahụ́ ya chanwụrụ achanwụ, onye na-agba ya ji ọrịa ọjọọ na-egbu ndị mmadụ. (Mkpughe 6:8) Ọrịa kacha gbuo ndị mmadụ n’agbata afọ 1901 na afọ 2000 bụ ọrịa inflenza nke gburu ọtụtụ mmadụ mgbe agha ụwa nke mbụ biri. O nweghị onye ma mmadụ ole o gburu. Ma, otu akwụkwọ kwuru na o gburu ihe dị ka nde mmadụ iri ise. Akwụkwọ ọzọ kwuru na “ọrịa a so n’ọrịa kacha sụọ ndị mmadụ akwụ e nwetụrụla n’ụwa. Ọrịa ọjọọ ndị kacha gbuo ndị mmadụ tupu agha ụwa nke mbụ egburughị ọtụtụ mmadụ ngwa ngwa ka ọrịa inflenza ahụ.” Kịtịkpa, ịba, ụkwara nta, na ọrịa ndị ọzọ na-efe efe gbukwara ọtụtụ narị nde mmadụ n’agbata afọ 1901 na afọ 2000.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya