Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w14 6/1 p. 16
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide
    Teta!—2023
  • Onyinye Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi nke Onye Okike Anyị Nyere Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2023
  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
w14 6/1 p. 16

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

È nwere ihe mere e ji kee ụwa anyị a?

Ebe nwa okorobịa na-ekiri ihe dị iche iche mara mma Chineke kere

E kere ụwa ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ ga-ebi na-enwe obi ụtọ

E keziri ụwa anyị a ekezi ka ihe ndị dị ndụ nwee ike ịnọli na ya. E nwere mmiri buru ibu n’ụwa. Mmiri niile a e nwere na-eme ka ihe ndị dị ndụ n’ụwa ghara ịnwụ. Otú ụwa si nọrọ, otú o si atụgharị nakwa otú o si agba anyanwụ gburugburu bara ezigbo uru n’ihi na ọ bụ ya mere ka oké osimiri ghara ịkpụkọ ọnụ ma ọ bụkwanụ ka ọ ghara ịdị ezigbo ọkụ ka mmiri e sinyere n’ọkụ. E nwekwara ikuku ndị dị na mbara ígwé na ihe ndị dị n’ime ala na-eme ka a ghara inwe oké okpomọkụ n’ụwa. Otú e si kee ahịhịa na ụmụ anụmanụ na mmadụ ka ha si n’aka ibe ha na-enweta ihe ha ga na-eri dị ịtụnanya. Mgbe ọtụtụ ndị lechara otú ihe a niile si dịrị n’ụwa, ha kwuru na e nwere ezigbo ihe mere e ji kee ụwa.—Gụọ Aịzaya 45:18.

Ma i nwere ike ịjụ, sị: ‘Ahụhụ ndị mmadụ na-ata na mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha hà so n’ihe mere e ji kee ya?’—Gụọ Diuterọnọmi 32:4, 5.

Chineke ọ̀ ga-emezuli ihe o bu n’obi kee ụwa?

E kere ụwa ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ ga-ebi na-enwe obi ụtọ, na-akwanyere ibe ha ùgwù ma hụ Onye kere ha n’anya. N’ihi ya, ihe Chineke bu n’obi kee mmadụ karịrị ihe o bu n’obi kee ahịhịa na ụmụ anụmanụ. Anyị nwere ike ịmata onye Onye kere anyị bụ. Anyị nwekwara ike ịmụta ịhụ ndị ọzọ n’anya na imeso ha otú Chineke na-eme.—Gụọ Ekliziastis 12:13; Maịka 6:8.

Onye kere anyị ga-emeli ihe niile o bu n’obi ime. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-eme ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata na mmegbu ndị mmadụ na-emegbu ibe ha kwụsị, meekwa ka ụwa anyị a bụrụ ebe ndị mmadụ ga-ebi na-enwe ezigbo obi ụtọ.—Gụọ Abụ Ọma 37:11, 29; Aịzaya 55:11.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ isi nke 3 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya

I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya